Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a: Theresa May ga-ezute ndị minista ya n'ụtụtụ a

Mgbe e biputara ya

Akụkọ ndị dị mkpa.

Ahia dị n'ala Igbo

Gọọmentị Anambra steeti ekwuola na ha dị njikere ị tụ ndị ịsị ahịa dị ịcheiche nga maka mkpachị ego kwesiri ị ru gọọmentị aka

Kọmishọna na-ahụ maka azụmahịa na steeti ahụ bụ Christian Madubuko kwuru na gọọmentị etufuola ijeri naira ole na ole maka mpụ a.

Lalong na ndị ọrụ mba Amerịka

Osote onye na-anọchite anya mba Amerịka na Naịjirịa bụ David Young arịọla gọọmentị etiti ha mee ihe ga kwụsị oke ogbugbu mmadụ na mpaghara etiti Naịjirịa.

O kwuru nke a mgbe ọ gara ị leta aka na-achị Plateau bụ Simon Lalong ụnyaahụ.

Theresa May
Nkọwa foto, May: Gọọmentị anyi kwesịrị ime otụtụ ihe

Praim Minister mba Briten bu Theresa May ga-ezute ndị minista ya n'ụtụtụ ebe Jeremy Hunt ga-anochite anya Boris Johnson dịka onye odeakwụkwọ mba ofesi

N'akụkọ yiri ibe ya Donald Trump ahọpụtala Brett Kavanaugh dịka ọkaịkpe ukwu n'ụlọịkpe kachasị nke mba Amerịka

Jorge Sampaoli

Ngalaba na-ahụ maka bọọlụ na Argentina ekwuola na ha ga-enyocha ọkwa onyenchịkọta otu egwuregwu ha bụ Jorge Sampaoli na ngwụcha ọnwa a.

Ebe igwe mmadụ na mba Britain ebidola ị gaa mba Rọshịa maka asọmpị dị n'etiti ha na mba Kroeshia echi.

Gee nkeji nke ụtụtụ a

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe onyonyo nke taa

Aha onyonyo, Okwu Chimamanda maka Biafra na Ipob