Peter Obi na Soludo: Ihe ọhụrụ Obi sara Gọọmentị Soludo n'ebubo ụgwọ a sị o ji

Charles Soludo dịka ha na-ekele onwe ha n'ọha
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Peter Obi bụbụ Gọvanọ Anambra steeti ekwuola na o nweghị ihe na-esere ya na aka na-achị steeti ahụ ugbua bụ Charles Soludo, n'ọsịsa ebubo ọhụrụ nke Gọọmentị Soludo wepụtara were na-arụ ya aka iji ndị ọrụ akatamkpo ego na steeti ahụ oge Obi nọ n'ọchịchị.

Obi, onye na-azọ ọkwa Onyeisiala na Ntuliaka 2027 n'aha otu NDC kwuru hooha na o nweghị ụgwọ ọ hapụrụ kama na o tinyere steeti ahụ nde dọla 150 n'azụmahịa ga-amụtara steeti ahụ ego.

Nke a na-abịa dịka gọọmentị Charles Soludo boro ya ebubo ọhụrụ na ọchịchị Obi ji ihe kaịrị nde dọla 123 n'ụgbọ mgbazite oge ọ bụ gọvanọ.

Ebubo ọhụrụ ahụ mere ka ụfọdụ na-ajụ ihe na-esere Peter Obi na Soludo iche nke mere o ji ebo Obi ebubo aghara aghara.

Mana n'ozi Obi wepụtara n'akara Facebook ya n'ụtụtụ Fraide, o kwuru sị,

" A chọrọ m ịgwa ọha mmadụ na o nweghị ihe na-esere nnukwu nwanne m nwoke bụ Gọvanọ Soludo, maọbụ gọvano ọbụla nọ na Nigeria."

Peter Obi na Soludo

"Anaghị m azọ ọkwa gọvanọ na steetị ọbụla agaghị m azọkwa ọkwa gọvanọ ọzọ ma ọbụrụgodi na a gbanwe Iwu Nigeria."

N'okwu itinye Anambra steeti n'ụgwọ, Obi sara sị, " Dịka Gọvanọ Anambra, o nweghị ụlọakụ m gara gbazite ego n'aha steeti."

"Oge mmemme ọpụpụ Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka Ụgwọ a kpọrọ DMO bụ Abraham Nwankwo, o ma kwuo na n'afọ iri ọ nọrọ n'ọkwa, na m bụ otu gọvanọ n'afọ iri abakwuteghị ya maka mgbazinye egoi."

"Oge m hapụrụ oche , Gọọmentị Anambra steeti enweghị ụgwọọna maọbụ ụgwọ ezumike nka ha ji nke ọ na-enwe ndị ọrụngo rụchara ọrụ ha, gọọmentị nyochaa ma ha arụrụ ya e ji ụgwọ."

Ihe akwụkwọ ọhụrụ Anambra Steeti wepụtara na-ekwu banyere ụgwọ ha sị gọọmenti Peter Obi ji ndịọrụ oge ọchịchị ya

Charles Soludo yi akwaete dị ọcha ma jide igwe e ji ekwu okwu n'aka
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
WhatsApp BBC News Igbo nọ n'obaozi
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Na nsonso a, Gọọmentị Charles Soludo nke Anambra steeti bipụtara akwụkwọ gosiri na a kwadoro iwepụta ₦473m n'afọ 2024 iji kwụọ ụfọdụ ụgwọ ọnwa na ụgwọ ezumike nka ndịọrụ nke ụlọọrụ steeti abụọ dara ada.

Ụlọọrụ abụọ a bụ Anambra State Water Corporation (ANSWC) na Anambra State Environmental Protection Agency (ANSEPA).

Nke a na-abịa dika arụmụka gbasara ọnọdụ ego Anambra n'oge onye bụbu gọvanọ steeti ahụ, Peter Obi, hapụrụ ọchịchị na 2014, na-aga n'ihu.

Gọọmentị steeti kesara akwụkwọ ahụ n'akara X ya n'ime izu a, na-ekwu na ọ bụ ihe akaebe na-emegide okwu Peter Obi na-ekwu na ọ hapụrụ ọchịchị n'enweghị ụgwọ ọnwa, ụgwọ ezumike nka maọbụ ụgwọ ndị ọzọ ọchịchị ya ji.

Gịnị ka akwụkwọ ahụ kwuru ?

Dịka akwụkwọ ahụ nke onye bụ onyeisi ọrụ n'oge ahụ bụ Theodora Okwy Igwegbe, bịanyechara aka na ya, si dị, esemokwu gbasara ụgwọ ndị a akwụbeghị akwụ adịla ihe dị ka afọ iri na anọ(14) tupu gọọmentị na otu ndị ọrụ 'Amalgamated Union of Public Corporations, Civil Service Technical and Recreational Services Employees' (AUPCTRE) nwee nkwekọrịta ikpezi esemokwu ha na-ejighị ụlọikpe.

Nkwekọrịta ahụ kwuru na a ga-akwụ ₦473m dịka nke mbụ n'afọ 2024, ebe a ga-elebakwa anya n'akụkụ ọzọ nke ụgwọ ruru ₦500m.

N'oziza ya, Obi kwuru na ọchịchị ya kwụrụ ụgwọ ndị kwesịrị ịkwụ ụgwọ tupu ọ hapụ ọchịchị, ma kwuo na ọ kwụsịrị n'ọchịchị na-enweghị ụgwọ ndịọrụ o ji.

Akwụkwọ ahụ o gosiri na ₦473m niile bụ ụgwọ oge Obi ?

Akwụkwọ ahụ o gosiri na ₦473m niile bụ ụgwọ oge Obi ?

Ọ bụ ezie na akwụkwọ ahụ gosiri na-eji ndịọrụ ụlọọrụ abụọ ahụ ụgwọ ruo ọtụtụ afọ, kama o gosighi kpọmkwem mgbe ụgwọ a malitere, maọbụ akụkụ ole n'ime ₦473m sitere n'oge ọchịchị Peter Obi.

Iji mata nke ahụ, a ga-achọ akwụkwọ ụgwọ ọnwa, ndekọ ego, akwụkwọ ikpe na nkwekọrịta ndị metụtara afọ ndị ahụ.

Ihe akwụkwọ 2024 gosiri bụ na e nwere ụgwọ metụtara ndịọrụ na ndị lara ezumike nka nke ụlọọrụ abụọ ahụ nke ka nọ n'okwu ruo ọtụtụ afọ, tupu e nwee nkwekọrịta ma kwado ịkwụ akụkụ ya.