Ndị uweojii anapụtala dọkịta Emegakor n'aka ndị ntọrị n'Anambra Steeti

Ebe foto si, Crown Hospital/Facebook
Mkpu ọṅụ na-ada n'Anambra steeti ugbua dịka ngalaba ndị uweojii na-ebu agha megide ndị ojiegbe ezu ohi bụ Special Anti-Robbery Squad (Sars) anapụtala otu dọkịta n'aka ndị ntọrị.
Dọkịta Edwin Emegakor bụ onyeisi ụlọọgwụ Crown Multi-Specialist Hospital dị na Nkpọr, n'okpuru ọchịchị Idemmili North n'Anambra steeti, ka e kwuru nọ n'aka ndị omekome ahụ kemgbe izu ụka gara aga.
Akụkọ kwuru na ọ bụ n'ụbọchị Tọzde abalị asaa nke ọnwa Mee ka ndị ntọrị wakporo ụlọọgwụ ya n'elekere isii nke mgbede, ma tọrọ ya bụ dọkịta.

Ebe foto si, Crown hospital/Facebook
Mgbe a na-achọ ndị tọọrọ dọkịta ahụ, otu jikọtara ndị dọkịta ahụike n'Anambra steeti bụ Nigerian Medical Association (NMA) mara ọkwa n'ụbọchị Satọde abalị itoolu nke ọnwa Mee ma kwuo na ha ga-amalite abụbọọrụ ma ọ bụrụ na ndị uweojii achọtaghị dọkịta ahụ na-efu efu.
Nke a mere ndị ụweojii tọọrọ ntị n'ala wee chọpụta na ọ bụ n'otu ụlọ 'duplex' dị n'Obosi Anambra steeti ka ndị ntọrị ahụ dobere ya.
Gịnị ka ndị uweojii kwuru?
Ndị uweojii zọpụtara dọkịta ahụ na mmadụ atọ ndị ọzọ eji eji n'ụbọchị Sọnde 10 Mee 2026.
E kwuru na dọkịta Emegakor enwerela onwe ya.
Dika ihe onyonyoo n'efegharị na soshal midịa siri gosi, ndị ntoroọbịa obodo ahụ agbaala ụlọ ahụ ndị ntọrị ji akpa ike ọkụ.
Onyeisi ndị otu NMA n'Anambra bụ Dọkịta Princewill Okam kwuru na ha agaghị agba abụbụọrụ kama ha kelere ndị ọrụ nchekwa ka ha siri mee ngwa ngwa ma zọpụta dọkịta Edwin Emegakor.





























