Mike Ozekhome: Kedụ ndị a napụrụla nzere 'SAN' na Naijiria?

Ebe foto si, Mike Ozekhome/Facebook
Otu iwu a kpọrọ 'Legal Practitioners' Privileges Committee',(LPPC) anapụla onye ọkaiwu nwere agba na Naijiria bụ Mike Ozekhome ugwu kachasị ugwu a na-enye ọkaiwu na Naijiria bụ 'Senior Advocate of Nigeria' nke bụ 'SAN' n'ịchafụ maka ebubo ịkpa agwa etosighị ọkwa ya.
Otu LPPC bụ kọmitị ọrụ ya bụ inye ndi ọkaiwu kara aka nturuugo, 'Senior Advocate of Nigeria' (SAN) bụ nzere kachasị a na-enye ndị ọkaiwu na ndị nkuzi iwu kara aka n'ọrụ iwu na Naijiria.)
Nnapụ ugwu a na-abịa dịka ngalaba na-ebu agha megide nrụrụaka ndị ọrụ bụ 'Independent Corrupt Practices and Other Related Offences Commission' malitere inyocha Ozekhome maka ebubo chamdum metụtara ụlọ a zụrụ na mba ofesi.
Ndị ọkaiwu a napụrụla nzere 'SAN'

Ebe foto si, Kunle Ogunba/Oluwatoyin Ajoke Bashorun / Uche Ihediwa
Mana Ozekhome abụghị ọkaiwu mbụ a na-apụ nturuugo 'SAN' na Naijiria.
Ndị ọkaiwu nwere agba ụdị ihe dagidere gụnyere:
Kunle Ogunba: N'afọ 2018, LPPC napụrụ ọkaiwu a nturuugo .SAN' dịka e dere akwụkwọ mkpesa megide ya maka ebubo ịkpa agwa ọjọọ n'ọrụ ya nakwa ịma ụma emebi usoro ụlọikpe.
Iji maa atụ eboro ya ebubo ịgba akwụkwọ dị iche iche n'otu ikpe n'ihu ọkaikpe dị iche iche iji gbarụọ usoro ikpe.
Mana e nyeghachiri ya nzere ahụ ka ọnwa asatọ gachara.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Uche Ihediwa: Ọkaiwu a bụbụ Ọkaiwu Ukwu (Attorney-General ) nke Abịa steeti bụ onye a napụrụ ugwu 'SAN' dịka otu jikọrọ ndị ọkaiwu bụ Nigeria Bar Association ) dere akwụkwọ mkpesa degide ya .
N'afọ 2024, Onyeisi otu NBA bụ Yakubu Maikyau,(SAN) degara Ọkaikpe Ukwu Naijiria nakwa Onyeisioche otu LPPC bụ Jọstịs Olukayode Ariwoola, akwụkwọ mkpesa sị na agwa Ihediwa etosịghị onye ji ọkwa SAN dịka o boro ebubo na Ihediwa pụtara n'ọha n'ọgbakọ ' International Bar Association Conference' e nwere na Paris mba Fransị kwuo na e nyere ngarị iji họọ ndị bụ ọkaikpe n'Abịa steeti n'ọrụ oge ọ bụ Ọkaiwu Ukwu nke steeti ahụ, kama ide akwụkwọ mkpesa degara ndị ọ dịrị ilebay aanya, sị na agwa ga-ebute ọha ileda ndị ọkaiwu anya.
Oluwatoyin Ajoke Bashorun: A napụrụ ọkaiwu a nzere SAN dịka mkpesa metụtara akwụọ ụgwọ ụlọ ,akwụghị megide ya rutere LPPC aka.
Ndị a kachapụrụ aha ha kpamkpam
Dịka a napụrụ ndị a nzere, SAN', e nwere ndị ọkaiwu a kachapụrụ aha ha n'aha ndị ọkaiwu na Naijiria kpamkpam.
Ha gụnyere:
Ephraim Chukwuemeka Ugwuonye: bụ onye a kachapụrụ aha ya n'afọ 2018 maka ikgwu Gọọmentị Naijiria chandum na ịkpa agwa ekwesịghị onye ọkaiwu.
Onye bụdị Mike Ozekhome?
A mụrụ ya n'ezinaulo Ichie Abu Ozekhome na Lọlọ Alimoh Abu Ozekhome
Ozekhome bụ onye obodo Iviukwe dị n'Okpuru Ọchịchị 'Etsako East' dị n'Edo Steeti.
Ọ gụru Iwu na mahadum University of Ife nke a ma ugbua dịka 'Obafemi Awolowo University,' Ile-Ife.
Ọ pụtara na mahadum n'afọ 23. N'afọ 1981, ka a kpọrọ ya n'ọrụ dịka ọkaiwu.
Ọ laghachiri mahadum nke OAU maka inweta nzere, 'Master's n'Iwu.
Ozekhome nwetara nzere ' Ph.D' na mmụta 'Constitutional Law' na mahadum 'Alliance International University' dị na Lusaka, Zambia.
Ozekhome eritela ọtụtụ nzere nke gunyere 'SAN' bụ nke o ritere n'afọ 2009.
































