Ebe ngagharịiwe Juun 30 megide ndị mbịarambịa nwereike ime na mba Saụt Afrịka

Ndị na-eme ngagharịiwe na mba Saụt Afrịka

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ndịisi obodo Johannesburg ekwuola ụfọdụ ihe banyere ngagharịiwe megide ndị mbịarambịa a chọrọ ime na Saụt Afrịka n'ụbọchị Tuzde 30 Juun, 2026.

Ndị ọchịchị kwuru na ngagharịiwe ahụ nke otu March and March na-achịkọba, ga-elebanye anya n'ime obodo, nakwa mmetụta nye ndị ntorobịa.

A na-atụ anya na mmadụ ruru 5,000 ga-agbakọ n'ogige Beyers Naudé Square tupu ha esi ebe ahụ gawa Constitutional Hill ebe ha ga-enyefe akwụkwọ ndekọ ihe ha chọrọ n'aka onyeisi Hillbrow Station.

Ngagharịiwe ahụ ga-amalite n'elekere iri nke ụtụtụ ruo elekere abụọ nke ehihe. Ha ga-eme ngagharịiwe n'ụzọ Helen Joseph Street, Troye Street, Twist Street, Kotze Street nakwa Queen Street.

Ngagharịiwe nke abụọ nke otu Labour and Civic Organisation (LACO), na-achịkọba, ka e kwuru na mmadụ ruru 1,200 ga-esonye na ya.

Ndị na-eme ngagharịiwe na mba Saụt Afrịka

Ebe foto si, Darren Stewart/Gallo Images via Getty Images

Ngagharịiwe ndị a bụ iji kpọọ oku banyere ndị mbịarambịa si ụzọ megidere iwu bata obodo ma kpọọ oku ka ụlọọrụ Department of Home Affairs lebanye anya na ya.

Ndị ngagharịiwe ga-agbakọ n'ebe jikọrọ Kotze street na Hospital street dị na Hillbrow tupu ha aga n'ụlọọrụ Department of Home Affairs dị na Plein Street ebe ha ga-anọ nyefe ndekọ ihe ndị ahụ ha chọrọ.

E kwuru na ngagharịiwe a ga-amalite n'elekere itoolu nke ụtụtụ.

Na Midrand, otu Mayibuye Youth Activism Movement ga-achịkọba ngagharịiwe ha ji akpọ oku banyere ohere ọrụ nye ndị ntorobịa.

Ihe ruru mmadụ 800 ga-esonye na ya, ga-agbakọ n'ụzọ Dale Road nakwa Modderfontein Road tupu ha amalite ịga ụlọọrụ Sandton Plant Hire Offices ebe ha ga-anọ nyefee ndekọ ihe ha chọrọ banyere mkpa ọ dị ime ka ndị ntorobịa nwee ọrụ.

Ngagharịiwe a ga-amalite n'elekere iri nke ụtụtụ ruo elekere mbụ nke ehihe.

Ndị uweojii kwụrụ chịm ichekwa onye ọbụla

Ndị uweojii South African Police Service (SAPS) na-eme ngosi nkwado n'ama egwuregwu FNB Stadium na June 26, 2026 na Johannesburg, Saụt Afrịka

Ebe foto si, Per-Anders Pettersson/Getty Images

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ndị uweojii mba Saụt Afrịka ejkwuola na ha kwụrụ chịm ichekwa ndị ndị mmadụ, akụnaụba nakwa ịhụ na e nwere udo na mba ahụ n'oge ngagharịiwe ndị a.

Onye na-arụ ọrụ ugbua dịka minister ndị uweojii bụ Firoz Chachalia kwuru nke a n'ụbọchị Sọnde 28 Juun, 2026 dịka ọ na-eleta ndị uweojii a ga-eziga maka ngagharịiwe ahụ na Durban, Kwa-Zulu-Natal.

Chachalia gwara ndị uweojii ahụ na ọrụ ha abụghị ikwado ndị maọbụ otu ọbụla, kama na ọ bụ ichekwa ndị na-eme ngagharịiwe nakwa ndị na-adịghị eme ngagharịiwe.

N'okwu ya "A naghị eziga ndị uweojii Saụt Afrịka ka ha gbochie ngagharịiwe. Ọrụ anyị bụ ihụ na enwere ezi nchekwa nye ukwu nao nye nta. Anyị na-eziga ndị uweojii iji chekwaa ndụ, akụnaụba, gbochie ndị omekome nakwa ndị chọrọ iji ohere ngagharịiwe bute ọgbaaghara dịka mwakpo, mmekpa ahụ nakwa ndị ọzọ yiri ya n'obodo."

Ọ gara n'ihu kwuo na ọrụ ndị uweojii bụ ichekwa iwu obodoma mee ka ndị mmadụ rube isi nye iwu obodo.

Ndị uweojii a na-akwado maka ngagharịiwe ahụ nke a na-akwado ime na Juun 30 2026 bụ ụbọchị ikpeazụ otu March and March na pati Action SA nyere ndị mbịarambịa batara Saụt Afrịka n'ụzọ megidere iwu ka ha si mba ha pụọ.

Ndị uweojii mba Saụt Afrịka

Ebe foto si, Getty Images

N'aka nke ọzọ, n'iji gbochie ọgbaghara ọbụla nwereike isepụta isi na ngagharịiwe a, a họpụta ihe ruru mmadụ 10,000 ga-elebanye anya n'ihe na-eme n'obodo ha dị cihe iche ọkachasị Kwazulu-Natal bụ ebe e kwuru na ọ bụ ebe ngagharịiwe ga-akachasị mee.

Ndị uweojii na-eziga ọtụtụ ndị ọrụ ha iji gbochie nsogbu ọbụla na ngagharịiwe. Ha kwuru na ha na ndị ọrụ nchkewa ndị ọzọ, ụlọọrụ dị iche iche, ndị ezeọdịnala, ndịisi ụka nakwa otu ndị ọzọ ga-ejikọ aka iji gbochie ọgbaaghara ọbụla n'oge ngagharịiwe a.

Ndị na-achịkọba ngagharịiwe a kwuru na atụmatụ ha abụghị ịmachi mba Saụt Afrịka.

Ndi uweojii Johannesburg Metropolitan Police Department (JMPD) nakwa ogbo ha na Kwazulu-Natal nakwa ndị uweojii Mpumalanga adọọla ndị obodo aka na ntị ka ha ghara ime ọbụla ga-ebute ọgbaaghara n'obodo oge ngagharịiwe ahụ.

Ha gawara ndị ọkwọụgbọala na ndị njem ka ha hazie onwe ha nakwa njem n'ihi etu ngagharịiwe a ga-esi metụtụ ụzọ nye ụgbọala.

Ha gwara ndị obodo ka ha ghara ịwakpo ụlọahịa ndị mmadụ mọabụ mụnye ihe ọbụla ọkụ n'ụzọ.

Mba ndị kpọpụrụ ụmụafọ ya na Saụt Afrịka

Ụmụafọ Naịjirịa a kpọlatara site na Saụt Afrịka n'ọnwa Juun, 2026

Cheta na ọtụtụ ndị mbịarambịa na Saụt Afrịka si mba Afrịka dị iche iche, alaghachila mba ha dịka ụbọchi ngagharịiwe megide ndị mbịarambịa batara n'ụzọ megidere iwu na Saụt Afrịka na-abịa.

Gọọmenti Naịjirịa, Gana, Malwi, Mozambik na Zimbabwe akpọlatala ụmụafọ ha kwuru na ha chọrọ ịhapụ Saụt Afrịka. Ha mere mkpọlata ndị a n'agba n'agba.

Mba Yuganda bụ mba ọzọ kwuru na ọ ga-akpọlata ụmụafọ ya n'ụbọchị ndị na-abịa.

Ozi minista Yuganda na-ahụ maka mmekọ mba ofesi bụ Haruna Kasolo wepụtara, kọwara na ụmụafọ Yuganda dị 746 edebanyela aha na ndị chọrọ ịhapụ Saụt Afrịka n'ihi ọnọdụ enweghị nchekwa nye ha n amba Saụt Afrịka ma kwuo na a na-atụ anya na ọtụtụ ndị ọzọ ga-edebanye aha n'ime ụbọchị ole na ole na-abịa.

O kwuru na gọọmenti Yuganda ga-amalite ịkpọlata ụmụafọ ya n'oge adịghị anya ngwangwa ha hazichara atụmatụ mkpọlata ahụ.