Otu nwaanyi ekpupeela ihu mmanwụ na Nsụka

Ebe foto si, Okey Omeje/Facebook
Ihe ọ gbara Igbo gharịị emeela na Nsuka, Enugwu steeti dịka otu nwaanyị kpubere ihu mmanụ.
Otu nwaanyi na-aga n’ụzọ obodo ahụ ụbọchị monde 4th may were zute mmanwụ ama ama bụ Omebe.
Mmanwụ Omebe ahụ malitere were osisi kụwa nwaanyị ahụ ihe.
Ha lụwara ọgụ nke mere nwaanyị ahụ jiri dọkaasịa isi mmanwụ ahụ .
Dika ndị gbatara ebe ahụ siri kwuo, nwaanyị ahụ dọkara isi mmanwụ ahụ were chọpụta na ọ bụ di ya nọ na mmanwụ ahụ eti ya ihe.
Ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia gosiri ebe nwaanyị malitere ịlụso mmanwụ na-akụ ya ihe ọgụ tupu ọ dọka ihu mmanwụ ahụ.
Maazi Augustine Attah bụ onye Enugwu Ezike ma bụrụkwa onye Omenala na-amasị gwara BBC na nwaanyi ahụ mere arụ dịka omenala Igbo siri dị.
Okwara arịrị na nsọpụrọ omenala na alazị azụ, nke mere na ụmụaka a na amụ ugbua amaghizi iwu, nsọ, na ihe bụ arụ
Na ụfọdụ obodo ntaramahụhụ ga adịrị nwaanyị ahụ bụ na, enwere ike machie nwaanyi ahụ, rie ya nnukwu iwu ma ọ bụ kpọlaa ya be nna ya.
Cheta na mmanwụ Omebe, akatakpa na ogbo ha ndị ọzọ, na-akpa ike di egwu na ọtụtụ ebe na nsukka nke na ndị ọnụ n’eru n’okwu akpọọla oku kwa mgbe kwa mgbe ka amachie mmanwụ ndị ahụ n’ihi na ha na-eji itari emeru ndị mmadụ ahụ.



