Peter Obi na Chukwuma Soludo: Lee nke na-akpọtụ ọzọ

Ebe foto si, Peter Obi / Facebook
Kemgbe abalị ole ma ole ugbua aha Gọvanọ Anambara steeti bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo na Peter Obi bụbu Gọvanọ chiburu steeti ahụ ma jiri otu ndọrọndọrọ ọchịchị Nigeria Democratic Congress (NDC) na-azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka afọ 2027 na-abịa abịa bụ okwu a kpụ nọ ọnụ na soshal midia.
Ihe na-akpọtụ ugbua gbadoro ụkwụ na ọ bụ eziokwu na Peter Obi e ji ndị mmadụ ụgwọ dịka Gọvanọ maọbụ na o jighị onye ọbụla ụgwọ mgbe ọ chịchara dịka gọvanọ Anambara steeti.
Etu ihe si dị, gọọmenti Anambara steeti na-ebo Peter Obi ebubo iji ndị mmadụ ụgwọ mana Obi na-ekwu na ebubo ahụ abụghị eziokwu.
Etu ihe niile si bido
Ihe a niile bidoro n'oge Komishịọna na-ahụ maka ego n'Anambara steeti bụ Izuchukwu Okafor pụtara kwuo na gọọmenti steeti ha ka na-akwụghachi ụgwọ nakwa ego mgbazite ndị chiburu steeti ahụ ji n'ụgwọ ma nke ha sị na Peter Obi gbazitere.
Izuchukwu Okafor kwuru nke ahụ n'onyonyo fesara agharaaghara na soshal mịdịa ma kwuo na ego ahụ so na nke Gọọmentị Peter Obi nakwa Gọọmenti Willie Obiano gbazitere mgbe ha chịrị steeti ahụ.
Mana cheta na Peter Obi ekwuola ugboro ugboro na mgbe ya chichara dịka Gọọmenti Anambara na steeti ahụ ejighi ụgwọ ọbụla kama na ya dosere ego n'ọba ụlọakụ ruru naịra Ijeri naira 75 (N75billion) dị n'ụlọakụ First bank.
Ebubo Gọọmenti Anambara steeti boro Peter Obi na nkenke
Mana n'akwụkwọ Komishịọna na-ahụ maka mgbasa ozi n'Anambara steeti bụ Law Mefor wepụtara ka ọ sị na ọchịchị Chukwuma Soludo na-akwụghachi ụgwọ ego ruru (N22 biillion) bụ ego Gọọmenti Peter Obi ji ndị ọrụ steeti nakwa nke okpuruọchịchị lala ezumuike ọrụ nakwa ndị nkuzi.
Ọ sị na "e ji ndị ọrụ ụgwọ ahụ n'oge Peter Obi na-achị ma ruo na Gọọmenti Soludo abata ma bidon a-akwụ ya".

Ebe foto si, Law Mefor/Facebook
Mefor gara n 'ihu kwuo na "Peter Obi akwụchaghị ego ụgwọọnwa e ji ndị ọrụ n'ụlọọrụ 'Water Corporation' bụ nke mechere bụrụ nke okwu ya gara n'ụlọikpe n'oge ọ na-achị".
Ọ sị na Peter Obi akwụghịkwa ụgwọ nke ọchịchị Gọvanọ Mbadinuju ji ndị nkuzi, ndị lala ezumuike ọrụ, ma kwuo na Peter Obi kwụrụ naanị ọnwa ise n'ime ọnwa iri na isii bụ ụgwọọnwa e ji ndị ọrụ n'ọchịchị Mbadinuju".
Ọsịsa Peter Obi nyere maka ebubo ndị a
Peter Obi kọwara ebubo ndị ahụ niile dịka ashị ọcha.
N'okwu Peter Obi "anyị kwụchara ụgwụọnwa e ji ndị mmadụ ọtụtụ afọ garaaga tupu mgbe m n'apụ n'ọchịchị Anambara steeti ejighi onye ọbụla ụgwọ".
"Ma nke ha sị na m "ji ụgwọ ego nakwa nke 'Ecological Loan' bụ nnukwu okwu ụgha.
"Ma nke ha sị na ọchịchị m akwụghị ụgwọ gọọmenti chiburu tupu anyị abanye ọchịchị bụ ego ruru ijeri naira abụọ (N2billion) bụ ego e ji ndị rụrụ gọọmenti ọrụ, ụgwụọnwa, ego ezumuike nke ndị ọrụ bụkwa okwu ụgha".
Peter Obi kwuru na ego 'Ecological fund' ruru ijeri naịra abụọ (₦2 billion) ha na-ekwu maka ya batara n'akara ụlọakụ Gọọmenti Anambara steeti n'ihe dịka ọnwa atọ mgbe ya chọrọ ịchịcha ọchịchị. Ọ sị n'agbanyeghị na ndị mmadụ chọrọ ka ha nwere ego ahụ rụọ ọrụ mana ya hapụrụ ya n'ụlọakụ ma kwuo ka gọọmenti ọzọ na-abịa nwee ihe o ji bido ọrụ.

Ebe foto si, Peter Obi / Facebook
Obi sị na ego ahụ bụ ego ndozi ebe mbuze na-enye nsogbu n'Oko/Umuchiana ma kwuo nay a hapụrụ ego ahụ n'ụlọakụ First Bank, nke akara ya bụ 'AC/No. 2018779464' ma kwukwa na ego dị n'ụlọakụ ahụ mgbe ya hapụrụ ya bụ Ijeri naịra abụọ nan de naịra iri na atọ '(₦2.13 billion)'.
Obi gara n'ihu kwuo na ego ya hapụrụ n'ọba ma dosere gọọmenti Anambara steeti karịrị ijeri naịra iri asaa na ise (N75billion).
Ọ sị na nke a esoghịkwa n'oge ndị ọzọ bụ nke ya hapụrụ ma hara imetụ ya aka bụ ego e wepụtagoro ihe e ji ya arụ tupu ọchịchị ya agwụ.
Ọ sị "ọ bụrụ nao nye ọbụla apụta kwuo na ihe ya kwuru abụghị eziokwu ma nwete ihe akaebe nay a ga-akwụsị ịzọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka afọ 2027.



























