NDC Town hall: Ndị agboro tapụrụ onye NDC ntị na Lagos - Senator Victor Umeh

Senator Victor Umeh na-anọchiteanya Anambra Central n'ụlọomeiwu Sineti Nigeria
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Senator Victor Umeh na-anọchiteanya Anambra Central n'ụlọomeiwu Sineti Nigeria, akọwaala etu ndị agboro si wakpo ha ma chọọ igbochi ọgbakọ Townhall Meeting pati Nigeria Democratic Congress (NDC) mere na Lagos state n'ụbọchị Tọzde 12 Nọvemba, 2026.

Na mkparịtaụka ya na BBC News Igbo nwere na Lagos, Senator Umeh kọwara na o doro anya na ọ bụ ndị ọchịchị na-achọghị ka Peter Obi soro zọọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2027 bụ ndị na-akpa nkata a ma na-etinye ọgbaghara n'ọgbakọ pati NDC n'ebe ọbụla.

"E nwere ndị na-achọghị ka Peter Obi soro zọọ ọkwa maka na ndị Nigeria na-esosi ya ike. Anyị onwe anyị bụ ndị Nigeria Democratic Congress (NDC), na-akpagharị akpọkọ ndị mmadụ, ekwu okwu ma nye ha ohere ịjụ ajụjụ ma kwuo ihe ha chọrọ. Ị tụgharịa ya Bekee ihe a na-akpọ ya bụ Townhall Meeting. Ọ dịghịrị anyị mfe maka na ebe ọbụla anyị gara, awakpo anyị. Ndị agboro bịara kụsasịa ebe anyị gara ime ọgbakọ Townhall a n'ụbọchị Tọzde 12 Nọvemba ma chọọ igbochi anyị ime ya", ka o kwuru.

O kwuru na ndị nkwado NDC na Lagos state, fooro ntutu taa ma gbochie ndị agboro ahụ igbochi ọgbakọ Townhall ahụ.

"Ndị otu NDC lụrụ ọgụ dị egwu. Oge m bịara, ahụrụ m otu onye NDC a tapụrụ ntị. Ọbara ka dị na ntị ya mana o so na-arụ ọrụ. Ajụrụ ya ọ bụ gịnị? Ọ gwara m na a tapụrụ ya ntị dịka ya na ndị agboro lụrụ ọgụ. Ahụkwara nwatakịrị a kụwara isi", ka Senator Umeh gbakwụnyere.

Ọ kọwara na nke a bụghị oge mbụ ndị agboro na-awakpo ọgbakọ Townhall NDC n'ebe dị iche iche.

N'okwu ya, "Etu a ka e si wakpo anyị na Delta state nakwa n'Enugu state. Tupu anyị emee ọgbakọ Townhall n'Enugu, ndị agboro gbochiri anyị ime ya n'ebe anyị kwụrụ ụgwọ maka ya maka na a chọghị anyị n'Enugu state. Ndị NDC n'Enugu gbadoro ụkwụ n'ala ma mee ka ndị gọọmenti rie mbọ mbọ ọsọ tupu anyị emee ya. Ya bụ ihe o gosiri bụ na ike ndị mmadụ karịrị ike onye nọ n'ọchịchị.

NDC Townhall: Etu ndị agboro si wakpoo ọgbakọ pati a na Lagos

Peter Obi na ndị mmadụ a wakporo

Ụfọdụ ndị mmadụ merụrụ ahụ , ebe a kụrịrị ugegbe ụfọdụ ụgbọala dịka ndị agboro ndọrọndọrọ ọchịchị wakporo ndị nkwado otu NDC ụbọchị Tọzde , abalị iri na abọ nke ọnwa Novemba, afọ 2026.

Ọgbaghara dapụtara oge ndị agboro bu ngwaọgụ wakporo ndị gbakọrọ maka ọgbakọ obodo nke e hiwere maka onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha pati ahụ bụ Peter Obi n' Oregun, Lagos.

Otu onye nọ ebe ihe mere bụ Isaac Obasi gwara BBC Igbo na ya nọ nọnụ ama ogige ọgbakọ ahụ oge o mere.

"Ebe Elekere iri an otu, ha bịara jiri egbe, mma, kụọ ndị mmadụ ihe. Ha merụrụ ihe dịka mmadụ ise ahụ ma mebie ihe dịka ụgbọala iri."

Ndị agboro na ndị nkwado Peter obi na-akwarịta ya
Nkọwa foto, Ndị agboro na ndị nkwado Peter obi na-akwarịta ya

Ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia gosiri ebe ndị e chere bụ ndị agboro ji ngwaọgụ wakpoo ụlọọgbakọ ebe ndị mmadụ gbakọrọ, mana ndị e bu ọgụ bịa izute, ji oche na osisi zọrọ onwe ha ma nye ha ọsọ.

Akụkọ kwuru na ndị uweojii wụchiri ma weta udo n'ebe ahụ tupu Peter Obi awụchie n'ọgbakọ ahụ.

Ndị agboro na ndị nkwado Peter obi na-akwarịta ya

A nwụchiri otu nwoke so na ndị kpara aghara ahụ maka ebubo imebi ụlọala na nso ebe ọgbakọ ahụ.

Mbọ inweta ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Lagos state amitaghị mkpụrụ oge akụkọ pụtara.