"Anyị bụ ndị Nneato amaghị maka okpokoro isi mmadụ 28 ha hụrụ"
"Anyị bụ ndị Nneato amaghị maka okpokoro isi mmadụ 28 ha hụrụ"
Mgbe e biputara ya
Ị chetere mgbe ndị uweojii n'Abia steeti kwuru na ha hụrụ okpokoro isi mmadụ 28 n'oke ohịa dị na mpaghara Umunneochi mgbe ha wakporo ebe ndị omekome ji mere ọnọdụ n'obodo ahụ?
Ndị uweojii n'Abia steeti kwuru na nke ahụ mere n'ime ọhịa dị n'obodo Umuaku, Isuochi, nakwa Nneato.
Mana n'obodo Umuaku, Eze Nwaoha Madu kwuru na ndị omekome enweghị ọnọdụ n'ime ọhịa ọbụla n'obodo ha maka na ndịagha na ndị ọrụ nchekwa Nigeria nọ n'ebe ahụ.
N'obodo Nneato, Praịm mịnịsta obodo ha bụ Boniface Okoye kọwara na ndị omekome ejighi be ha mere ọnọdụ ma kwuo na ndịagha Nigeria nọ n'obodo ha.)
Ka ọ dị ugbu a, dịka ndị uweojii kwuru ebe ha hụrụ okpokoro isi mmadụ 28 ahụ; ndị obodo a kpọrọ aha na-ekwu na udiri ihe ahụ adịghị n'obodo ha.



