Gọọmenti ewepụtala aha ụmụ Nigeria atọ e gburụ ọhụrụ na mba South Africa

Ebe foto si, Getty Images
Nigeria na mba South Africa nọ n'ọnọdụ gbata gbata ugbua n'ihi mmadụ atọ ụmụafọ Nigeria ọhụrụ e gburu na mba ahụ n'izu ụka gara aga.
Ụlọnnọchite anya Nigeria dị na South Africa a kpọrọ "Nigerian Consulate" na Johannesburg gbarụrụ ihu ma kwuo na akpachara anya laa ndụ mmadụ atọ ndị ahụ n'iyi site na ụbọchị 18 na 21 nke ọnwa Septemba 2026.
Ha gwara ndị mba South Africa ka ha nyochaa ma chọpụta ndị mba ahụ n'egbu ụmụafọ Nigeria aghara aghara.
Mịnịstrị Nigeria na-ahụ maka mba ofesi gwara BBC n'ụbọchị Tuzde sị "Ọnwụ ndị a na-agbawa obi dịka Nigeria na mba Africa ndị ọzọ na-agabiga ajọ mmegbu a kpọrọ 'Xenophobia' na 'Afrophobia' na South Africa."
Ọnụ na-ekwuchitere mịnịstrị ahụ bụ Femi Adeniyi kwupụtara na ndị ahụ e gburu ọhụrụ bụ ụmụnwoke atọ.
O kwuru na onye nke mbụ bụ Kenechukwu Christopher Ihemmadu bụ onye a sị nwụrụ ka ọ na-agbara ndị uweojii ọsọ, o wee si n'ụlọ elu dị na Bloemfonteim were wụdaa ma nwụọ.
O kwuru na onye nke abụọ bụ Olaniyi Olaleye Olatunde bụ onye e ji egbe gbagbuo n'obodo Pretoria ebe ọ na-arụ ọrụ dika onye nche.
Ọ gara n'ihu kwupụta onye nke atọ dịka Christian Hillary Nnaemeka bụ onye bụ onye etikatara ihe ma tigbuo ya.
Ozi ahụ kwuru na ndị tigburu Christian Hillary ka a na-eche na ọ bụkwa ha gburu Clement Uzor n'ihi na ọ bụ otu ndị bụ onyonyo TV na-agagharị eti ụmụ Nigeria ihe gburu ha.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a

Ebe foto si, Getty Images
Gọọmenti Nigeria gara n'ihu kwuo na mba South Africa adaala nnukwu mba n'ọrụ ichekwa ndị obodo ọzọ bi na mba ha dịka ndị be ha na-akpagbu ndị ojii si mba ọzọ bụ nke a kpọrọ 'Xenophobia' ma kwuo ka ha si na mba pụọ.
Na mkparịtaụka udo Nigeria na South Africa nwere na ọnwa Julaị ka South Africa kwuru na onyeisiala ha bụ Cyril Ramaphosa akwadoghị mmegbu "Xenophobia, Racism na Discrimination" ahụ.
N'aka nke ọzọ, Onyeisiala Nigeria bụ Bola Tinubu eburula mkpesa mmegbu na ogbugbu ụmụ Nigeria na ndị ọzọ bụga na nzụkọ otu jikọrọ mba dị n'Africa bụ African Union, wee kpọọ oku ka ha tịkọọ aka ọnụ kwụsị ihe ọjọọ ahụ.
Ka ọ dị ugbua, ụmụ Nigeria e bulatagoro maka nsogbu mwakpo "Xenophobia", na ogbugbu ndị mbịarambịa dị ọnụọgụgụ otu puku, nari iri asato na iri abụọ na otu.
Ụlọọrụ "Nigerian Consulate" gwara ụmụ Nigeria ka nọ na mba South Africa ugbua ka ha ghara iji aka ha bọọ ọbọ maka ihe e mere ha, kama ka ha gaa n'ihu dobe iwu obodo ahụ dika a na-akpa ka a ga-esi kwọọ onye ukwu wara.

























