Ntuliaka imeụlọ APC etinyela ndị gọvanọ, na ndị nọ n'ọkwa Sinetọ n'asọmpi onye ga-eje Abuja

Ifeanyi Okowa,Ned Nwoko, Hope Uzodinma

Ebe foto si, Okowa/Nwoko/Uzodinma

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụfọdụ ndị gọvanọ na-achọ ịpụ apụ n'ọkwa na ndị chiburu dịka gọvanọ so na ndị na-azọ ohere ife ọkọlotọ otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC) na ntuliaka ịnọchite mpaghara ha n'Ụlọomeiwu Ukwu Naijiria.

Aka chịburu Delta Steeti bụ Ifeanyi Okowa bụ onye si otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP) banye APC n'afọ 2025, na-azọsara Senetọ Ned Nwoko ohere iji ọkọlọtọ APC zọọ ọkwa nnọchịtaanya Delta-Central n'Ụlọomeiwu Ukwu n'Abuja.

Akụkọ na-efegharị na soshal midia gosiri na ndị pụtara ịtụnyere Okowa dị ọtụtụ n'ọnụọgụgụ, ebe naanị mmadụ ole ma ole bịara ịkwụnyere Nwoko.

Mpụtara ntuliaka apụtabeghị mana onyeisi otu achụmtavootu Nwoko bụ Ekene Kerry, boro ebubo ụbochị Monde na e nwere "ndị ọrụ gọọmentị steeti ahụ gbara isi akwara ịhụ na uche ndị mmadụ emezughị".

N'Imo steeti

Hope Uzodimma, Rochas Okorocha na Osita Izunaso

Ebe foto si, Hope Uzodimma, Rochas Okorocha na Osita Izunaso

Maka mpaghara ụfọdụ n'Ụlọomeiwu Ukwu ụfọdụ, ndị pụtara ịzọ enweghị ndị ha na-ama aka, ebe ụfọdụ bụ ọgụ na mgba na mpaghara ha.

N'Imo steeti, Gọvanọ Hope Uzodimma nakwa Aka chịburu steeti ahụ bụ Sinetọ Rochas Okorocha, na Sinetọ Osita Izunaso na-achịpụ ya na ndọrọ ndọrọ onye ga-efe APC maka ọkwa ị nọchite Imo-West n'Ụlọọmeiwu Ukwu.

Mmadụ atọ a bụ ndị nọ n'ọkwa ugbua maọbụ chịburu mbụ na-azọ onye ga-alaghachi.

Hope Ụzodimmma bụ gọvanọ na-achị Imo steeti ugbua. Rochas Okorocha chịrị steeti ahụ, na Osita B. Izunaso bụ onye ji ọkwa Sinetọ na-anọchite Imo West (Orlu) kemgbe ọnwa Juun afọ 2023 na-azọ isi onwe ha.

N'Abia steeti

Orji Uzor Kalu

Ebe foto si, Orji Uzor Kalu

Aka chịburu Abia steeti bụ Senetọ Orji-Uzor Kalu na Philip Nto chịpụrụ ya na ntuliaka imeụlọ ifere APC ọkọlọtọ maka ọkwa ịnọchite Abia North n'Ụlọomeiwu Ukwu.

N'Enugu Steeti

Ikeje Asogwa na Dr. Ugo Ugwuanyi zọrọ ọkwa onye ga-efe ọkọlotọ APC nọchiteanya Enugu-North n'Ụlọimeiwu Ukwu.

N'aka nke ọzọ, Senetọ Kelvin Chukwu bụ onye ekwekọrịtara ka o feere pati ahụ ọkọlọta ha maka a họrọ as its flagbearer