Ụmụ okorobịa a kparịala Mike Ezekhome

Mike Ozekhome

Ebe foto si, Mike Ozekhome/Twitter

Nkọwa foto, Ndị ntorobia akwala Mike Ozekhome emo
Mgbe e biputara ya

Onye ọka-iwu a mara amara na Naịjirịa, Femi Falana gwara BBC na Ozekhome emeghị ịhe ọjọọ

O kwuru na mmadụ niile nwere oke mmadụ ịgochiri ha n'ụlọ-ịkpe ma ha bụ onye ohi ma aka ha adị ocha

Ọ sị na ndị gọọmentị ochịe Ozekhome na-agọchiri n'ụlọ-ikpe bu kwa ndị mmadụ

Falana kwuru na Ozekhome enweghị ike ị kpụrụ ụmụ okorobịa ndị ahụ gaa ụlọ-ịkpe n'ihi na ikpe amaghị ha.

Mbọ niile anyi gbara ịnwete Mike Ozekhome na ekwentị, a mitaghị mkpụrụ.