Ihe anyị ma maka nwaanyị a sị nna di ya chụpụrụ ya na ụmụ ya abụọ n'ụlọ abalị asatọ di ya jiri nwụọ

Tosin Omolola na di ya ebe ha na-achịrịta ọchị na nna di ya ebe ọ na-agbachi ọnụ agba ha

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Tosin Omolola, di ya lara mmụọ na nna di ya
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndị uweojii Legọs Steeti anwụchiela otu nwoke a sị chụpụrụ nwunye nwa ya, gbachibido ya na ụmụ ya abụọ, chụpụ ha n'ụlọ ha kamgbe abali asataọ nwa ha nwoke nwụchara na Legọs, dịka ụlọọrụ na-ebu agha megide mkpagbu n'ezinaụlọ na steeti ahụ bụ 'Lagos State Domestic and Sexual Violence Agency (DSVA) si gbaa ama n'ozi ha wepụtara n'ụbọchị Wenezde.

Akụkọ kwuru na di Tosin Omolola gbara afọ 28 n'abalị 20 n'ọnwa Jụlaị afọ, 2026 nwụnarịrị ya, mana nna di ya bụ Makanjuola Omolola na ndị ezinaụlọ ha kwabatara chụpụ ya bụ nwaanyị ajadu nakwa ụmụ ya abụọ n'ụlọ di ya dị n'Ikorodu, Legọs, were igodo gbachie ya.

Ihe onyonyo nke onye na-agbambọ maka ikike dịịrị onye bụ Harrison Gwamishu wepụtara nke fesara na soshal midia gosiri ebe Makanjuola David Omolola bụ nna di nwaanyị ahụ di nwụrụ ji igodo agbachi ọnụzọ ama onye di ya nwụrụ.

Etu okwu si bido

Tosin Omolola na di ya tupu di ya anwụọ

Ebe foto si, Tosin Omolola

Nkọwa foto, Tosin Omolola na di ya tupu di ya anwụọ

Ngwangwa nwoke ahụ nwụru, e lie ya ozigbo dịka omenala ndị ụka Alakụba sị dị mana ngwangwa nne na nna di ya,na ụmụnne di ya jiri ohere ahụ kwabata n'ụlọ nwa ha nwoke ma malite ịkpagbu nwaanyị di ya nwụrụ na ụmụ ya abụọ, ma nye ya iwu ka o si n'ụlọ di ya wuru kwapụ, dịka otu jikọrọ ndị ọkaiwu ụmụnwaanyị bụ ' International Federation of Women Lawyers(FIDA) ngalaba nke Legọs bụ ndị na -anọchite nwaanyị ahụ si gwa BBC Igbo.

Otu ahụ bụ ndị kporo ndị uweojii ka ha gboo ọgụ ṅụrụ iyi na ha ga-ahụ isi okwu ahụ n'ụlọikpe.

Onyeisi ha bụ Ọkaiwu Abimbola Badia Jack- Oladuwagba gwara BBC Igbo,"Di ya nwụrụ n'ụbọchị Monde izuụka gara aga, elie ya n'ụbọchị Tuzde dịka omenala ndị ụka Alakụba."

"Ngwangwa e liri ya, nna di ya, nne di ya, ụmụnne di ya kwabaa n'ụlọ ha.

"Onye bịa, o were otu ọnụ ụlọ, ha gwara ibu nwaanyị na ụmụ ya kwabaa n'otu ọnụ ụlọ, nye iwu ka nne nke nwaanyị na nwanne ya nwoke nke nwaanyị ka ha si n'ụlọ ahụ pụọ ozigbo."

"Ha mepere ọnụụlọ nwanne ha nwoke malite ike ihe ya."

"Nke ka njo bụ na nna di ya tiri ya ihe abalị abụọ gara aga dịka o ziri nwata ka ọ ga zụtara ya akara."

Ọkaiwu Jack- Oladuwagba onye katọrọ agwa ezinaụlkọ ahụ kpasara ajadu ahụ, gara n'ihu kwuo sị, "Anyị ga-eso okwu a rue n'isi."

Ihe onyonyo BBC Igbo kiriri gosiri ebe nna di Tosin tiri Tosin ihe dịka ya na ya dọrịta ụka n'ihi na Tosin ziri mmadụ ozi ka ọ gaa zụtara ya akara.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs bụ Abimbola Adebisi azaghị ekwentị ya oge BBC Igbo kpọrọ ya.