EFCC anwụchiela onye amụma maka igwu ndị ụka ya chandum n'Enugwu

Aha onyonyo, EFCC anwụchiela onye amụma maka igwu ndị ụka ya chandum n'Enugwu
EFCC anwụchiela onye amụma maka igwu ndị ụka ya chandum n'Enugwu
Mgbe e biputara ya

Ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ na nrụrụaka ego na Naijiria bụ EFCC ekwuola na ha na-enyocha otu onye amụma a kpọrọ Sunday Ajuluchukwucheya maka ebubo igwu ndị ụka ya chadum ego karịrị nde naịra iri asaa (N70m).

Nke na-abịa dịka otu onye ụka nwaamadi ahụ bụ Okey Uwakwe degaara EFCC akwụkwọ mkpesa na-ebo ebubo na onye amụma ahụ napurụ ya nde naịra atọ na ụma abụọ ma kwe ya nkwa na ọ ga-eme ka nwunye nwanne ya nwoke chọrọla nwa kemgbe afọ iri na ise tụrụ ime.

O bokwara ebubo na onye amụma ahụ napụrụ ya nde naịra isii na ụma abụọ iji rụọrọ ya ọrụ mmụọ ka nwanne ya nwoke gara mba ofesi kemgbe afọ 1997 na-ekweghị alọta nweeike lọta.

Dịka EFCC siri gbaa n'ama, nnyocha ha gosiri na onye amụma ahụ na-arafu ndị ụlọụka ya site n'ịgwa ha ka ha zụọ ihe ekpere maka ọganịhu, dịka 'sticker' nakwa egbe igwe nke mmụọ nso iji nweta ogbugbo mkpa ha.

EFCC kwuru na otu onye ha gbara ajụjụ sịrị na ya zụtara egbe igwe nke mmụọ nsọ dị otu puku n'aka onye amụma Ajuluchukwucheya, bụ nke ọnụego otu n'ime ya bụ puku naịra iri atọ na asatọ, iji nyere ya aka gbagbuo ndịagha nke ime mmụọ a sị jichiri ego o gwutere na chaachaa.

Ka ọ dị, EFCC ekwuola na ha ga-akpụpụ onye amụma ahụ n'ụlọikpe ngwangwa ha mechara nnyocha.