Onye pụtara n'ụlọnga NSCDC na Niger steeti edurula ndị BBC gaa n'ebe ahụ
Ihe anyị hụrụ n'ụlọọrụ NSCDC ebe mmadụ 37 nwụrụ na Niger Steeti
Gọvanọ Niger steeti bụ Mohammed Umaru Bago gwara BBC ihe ha hụrụ n'ụlọọrụ ndị 'Nigerian Security and Civil Defence Corps, (NSCDC)' dị na Niger steeti.
Gọvanọ Bago kwuru ihe ndị ahụ n'oge BBC na-agba ya ajụjụ ọnụ ma kọwaa ihe nwereike ibute ọnwụ ndị ahụ.
N'onu okwu ya "Ụlọọrụ NSCDC gwara ọtụtụ ndị mmadụ bịa, jide ndị ọzọ ma tinye ha niile n,ụlọmkpọrọ nchereoge"
"Anyị amaghị maka nke ahụ mgbe e jichiri ndị ahụ mana mmadụ iri atọ na asaa nwụrụ n'ime ha".
"Anyị gara ebe ihe ahụ mere. Mgbe anyị ruru ka anyị chọpụtara na ha nwụọla. Ọtụtụ n'ime ha ka anyị hụrụ anụ ahụ ha na-erekasasị. Ọtụtụ koro eko, ụfọdụ na-agbọ ụfụfụ n'ọnụ, ndị ọzọ ka ọbara si n'imi ma n'ọnụ apụta".
Gọvanọ Bago sị na "nke ahụ mere anyị akpọọ mkpu".
Ọ gara n'ihu kwuo na ha bugara ozu ndị nke nwụrụ anwụ n'ọba ozu n'ụlọọgwụ ma kwuo sị "a gara m n'ebe ahụ hụta ha; e mere nnyocha 'autopsy' n'ozu ha".
Kedụ ka ihe dị etua ga-esi eme onye e jichiri na mkpọrọ nchere oge nke gọọmenti?
Gọvanọ Mohammed Umaru Bago kọwara na ụlọrụ NSCDC adịghị anara ya ikike dịka Gọvanọ tupu ha ejide mmadụ.
"Ọkachasị mgbe ọ bụ maka ihe metụtara ọrụ ha. Nchekwa n'ebe a na-egwupụta ọnatarachi dị n'ala bụ ọrụ ndị NSCDC"
"O were ike ịbụ na a gbara ha awụrụ anya mmiri maọbụ ihe yiri ya".
Bago kọwara na ndị gbanarịrị ọnwụ n'ihe ahụ mere kwuru na "a gbara ha ihe?"
N'okwu ya "ọtụtụ ndị gbanarịrị ọnwụ n'oge ahụ e dutara nọ n'ụlọọrụ ndị DSS kwuru na otu nwoke ji ihe dịka 'perfume' gbaa ha nke mere ọtụtụ n'ime ha ji bido ise ụkwara ma na-ekubi ume".
"Ekwesighi inye gọọmenti ọnọdụ Chineke ị dị na-ahụ hie ọbụla n'otu oge. Ya mere e ji kee ọrụ eke. Onye ọbụla na-arụ ọrụ nke ya, ma nee ebe ọ ma anya kpọmkwem."
Etu mmadụ 37 si nwụọ n'aka ndị ọrụ nchekwa NSCDC na Niger steeti
Ụzụ akwa na-ada na Niger steeti nakwa na Nigeria niile n'ihi ọnwụ mmadụ iri atọ na asaa ahụ bụ ndị nwụrụ n'ime ụlọmkpọrọ ndị ụlọọrụ NSCDC.
Mkpa mkpa ahụ kpara n'ụbọchị Tọzde 17 nke ọnwa Septemba 2026 na Borgu di na Niger steeti ebe a na-egwupụta ọlaedo n'ime ala.
Mmadụ iri atọ na asaa ndị ahụ nwụrụ bụ ndị NSCDC jidere n'ụbọchị Tuzde n'obodo a na-akpọ Borgu dị na Niger state na mpaghara ugwu Nigeria.
NSCDC jichiri ha n'ụlọ mkpọrọ nchere oge bụ ebe ha na-edosa ndị a na-enyo enyo mgbe ha nwụrụ.
Gọọmenti akwụsịtụla onyeisi ụlọọrụ NSCDC na Niger state ọrụ

Ebe foto si, NSCDC / Facebook
Gọọmenti Nigeria akwụsịtụla Suberu Siyaka Aniviye ọrụ dịka onyeisi ụlọọrụ 'Nigerian Security and Civil Defence Corps, (NSCDC)' na Niger state maka ọnwụ mmadụ iri atọ na asaa bụ ndị a na-enyo enyo na ha na-egwupụta ihe ọnatarachi n'ala n'ụzọ iwu akwadoghị na steeti ahụ.
Olubunmi Tunji-Ojo bụ minista na-ahụ maka ime mba Nigeria nyere iwu ahụ ka a kwụsịtụ Suberu Siyaka Aniviye ọrụ ma nye iwu ka e mee ezigbo nnyocha maka ọnwụ ndị ahụ nwụrụ.

Ebe foto si, NSCDC / Facebook
Nkọwa ụlọọrụ NSCDC nyere maka ọnwụ mmadụ 37 n'aka ha
Ụlọọrụ 'Nigerian Security and Civil Defence Corps, (NSCDC)' enyela nkọwa maka ọnwụ mmadụ iri atọ na asaa nwụrụ n'ụlọọrụ ha na Niger state.
NSCDC nyere nkọwa ahụ n'ozi onye bụbu onyeisi ụlọọrụ ha na Niger state bụ Suberu Siyaka Aniviye binyere aka tupu gọọmenti etiti Naịjirịa akwụsịtụ ya ọrụ.
Isiokwu akwụkwọ ozi ahụ bụ "njide ndị a na-enyo enyo na-egwupụta ọnatarachi dị n'ala n'ụzọ iwu na-akwadoghị nakwa ọnwụ gburu ọtụtụ n'ime ha mgbe ọrịa gbasara n'ike n'ebe e jichiri ha".
NSCDC gara n'ihu kwu sị maka na "anyị dị njikere iwepụ ndị niile na-egwupụta ọnatarachi n'ala n'ụzọ iwu akwadoghi nke mere ka anyị jide igwe mmadụ bụ ndị a na-enyo enyo na-eme mpụ ahụ n'abalị iri na ise nakwa abalị iri na isii nke ọnwa Septemba 2026 ma napụta ha ọtụtụ ihe akaebe".

Ebe foto si, NSCDC / Facebook
"Mana ka o ruru n'abalị iri na asaa nke ọnwa Septemba 2026 ka a chọpụtara na ọtụtụ n'ime ha awụọla dị anyị na-enyo enyo na ọ bụ ọrịa tiwapụrụ n'ebe ha nọ butere ọnwụ ha".
"Ozu ndị nwụrụ n'ime ha ka e tinyegoro n'ọbaozu 'General Hospital, Minna, Niger state' dịka a na-eme nnyocha ịmara ihe gburu ha".
"Dịka NSCDC nakwa ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ na-etinye anya na mmiri banyere ihe mere, anyị na-arịọ ndị ohanaeze nakwa ezinaụlọ ndị ụmụ ha nwụrụ ka ha dere juu ma hara ime ihe ga-ebute ọgbaaghara nakwa ịda iwu obodo".






























