Cyril Ramaphosa nke South Africa emeriela n'ụlọikpe dịka a kagburu mbọ a na-agba iwepụ ya n'ọkwa

Ebe foto si, Gallo via Getty Images
- Onye dere ya, Khanyisile Ngcobo
- Ebeg o si, Johannesburg
- Mgbe e biputara ya
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2
Onyeisiala mba South Africa bụ Cyril Ramaphosa enwetala mmeri n'ụlọikpe dịka ụlọikpe kagburu nchọpụta nyocha kwuru na o nwere ajụjụ ọ ga-aza gbasara ohi ego dị $580,000 e zuuru n'ọrụ ugbo dị na Phala Phala mpaghara Limpopo.
Ụlọikpe ukwu nke Western Cape kpebiri na nnyocha kọmitii nọọrọ onwe ya nke ndị omeiwu họpụtara n'afọ 2022 megidere iwu, ma kagbuo ya kpam kpam.
Onye Ọkaikpe bụ Nolwazi Mabindla-Boqwana kwuru na kọmitii ahụ gafere oke ọrụ e nyere ya, ma ghọtahie ọrụ ya na iwu gbasara nnyocha ahụ.
Mkpebi a kagburu isi ihe mere ndị omeiwu ji malite usoro ịchụpụ Ramaphosa n'ọkwa onyeisiala.
Ramaphosa wepụtara okwu ahụ n'ụlọikpe iji maa mpụtara nnyocha ahụ aka dịka ụlọikpe kwuru ndị omeiwu dara iwu ma kpochie mbọ ha chọrọ ịchụpụ ya n'ọchịchị.
Etu esemokwu ego e zuru n'ọrụ ugbo Ramaphosa si malite
Esemokwu a, nke ụlọọrụ mgbasaozi mba South Africa kpọrọ 'Farmgate', anọọla na-eso Ramaphosa kemgbe e kpughere ya n'afọ 2022. Ọ malitere mgbe onye bụbu onyeisi ndị mgbaama nzuzo obodo ahụ bụ Arthur Fraser boro ya ebubo na o zoro izu ohi ego e mere n'ugbo ya n'aka ndị uweojii na ndị ọrụ ụtụisi.
A na-ekwu na ndị ohi zuru akwụkwọ ego dọla America e zoro n'ime oche n'ugbo ahụ n'afọ 2020.
Na mbido ọnwa Nọvemba 2026, a mara mmadụ abụọ ikpe maka izu ego ahụ.
N'okwu ya gbasara ebubo ahu, Ramaphosa kwetara n'ezie na e zuru ohi n'ugbo ya, mana ọ kọwara na ego ahụ bụ nke o nwetere site n'ire enyi ọhịa 'Buffalo' n'ụzọ ziri ezi bụ nke ọ na-azụ.
Ọtụtụ nnyocha e mere wepụrụ Ramaphosa n'ebubo omume ọjọọ, mana ndị omeiwu malitere usoro ịchụpụ ya n'ọkwa n'afọ 2022, ma họpụta kọmitii nọọrọ onwe ya ka o nyochaa okwu ahụ.
Kọmitii ahụ na nchọpụta gbasara Ramaphosa kwuru na e nwere nnukwu obi abụọ gbasara izi ezi ebe ego ahụ e zuru si bịa. O kwukwara na onyeisiala kwesịrị ịza ajụjụ.
Na mbụ, Ramaphosa gbara akwụkwọ n'ụlọikpe megide akụkọ kọmitii ahụ, mana o mechara wepụ ya mgbe ndị omeiwu tụrụ vootu jụ ịnabata nchọpụta ha.
O mechara maliteghachi ikpe ahụ n'ọnwa Mee afọ a mgbe Ụlọikpe Iwu bụ ụlọikpe kachasị elu na South Africa kpebiri na ndị omeiwu mere ihe megidere iwu obodo site n'igbochi mbọ ịchụpụ ya n'ọkwa.
Ụlọikpe ahụ nyere iwu ka ndị omeiwu nyefee nchọpụta ahụ n'aka kọmitii ndị omeiwu na-ahụ maka ịchụpụ onyeisiala n'ọkwa.
N'akwụkwọ ikpe ọhụrụ ya, Ramaphosa rụrụ ụka na kọmitii ahụ ghọtahiere ọrụ e nyere ya, tụgharịrị ozi e nyere ya n'ụzọ na-ezighị ezi, ghọtahiekwa ebubo anọ e boro ya.

Ebe foto si, Gallo via Getty Images
Ihe mkpebi ụlọikpe a pụtara
Mkpebi ụlọikpe ahụ enyela Ramaphosa nnukwu mmeri ndọrọ ndọrọ ọchịchị, n'agbanyeghị na ọ bụghị mkpebi na-asachapụ ya kpamkpam n'ebubo gbasara ihe mere n'ugbo ahụ.
Ndi otu na-agba goomenti ukwu ekwuola na ha na ndị ọkaiwu ha na-akparịta ụka iji gbaa akwụkwọ mkpegharị megide mkpebi ahụ.


























