A nwụchiela ndị ngagharịiwe karịrị mmadụ 1,200 na mba France

Ngagharịiwe malitere n'ofe mba France iji kwado ụmụakwụkwọ na-eme ngagharịiwe maka ọnọdụ ọjọọ dị n'ime klas ebe ha na-agụakwụkwọ na Paris
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

E jidere opekatampe mmadụ 1,200 na-eme ngagharịiwe nke gọọmentị mba France kọwara dịka "mmụba nke ime ihe ike," dịka mmadụ ruru 550,000 pụtara n'okporoụzọ igosi iwe ha.

Cheta na ime ihe ike tiwapụrụ n'akụkụ dị iche iche na mba France n'ụbọchị Satọde 17 Ọktoba 2026, dịka ngagharịiwe ọhụrụ megide ọnọdụ siri ike n'ụlọakwụkwọ yana ọnụ ahịa ibi ndụ dị elu na mba ahụ.

N'isi obodo Paris, esemokwu siri ike gara n'ihu ruo n'uhuruchi n'etiti ndị uweojii na ndị na-eme ngagharịiwe; ndị uweojii ji gaasị na-akpata anya mmiri na mmiri a na-agbapụta n'ike wakpoo igwe mmadụ ahụ.

A gbara ụlọ dị iche iche ọkụ n'isi obodo ahụ na mpaghara ndị ọzọ—gụnyere na Limoges, ebe nnukwu ọkụ gbara n'ụlọ nzukọ obodo ahụ bụ nke mere ka akụkụ ụlọ ahụ daa.

Akụkọ kwuru na e nwere izu ohi na mbibi ihe onwunwe n'ọtụtụ obodo, dịka ndị ahụ lekwasịrị ụlọ nzukọ obodo na ebe azụmahịa dị iche iche anya.

Praịm Minista bụ Sébastien Lecornu kwuru na ndị uweojii ruru otu narị na iri ise (150) merụrụ ahụ n'oge ọgbaaghara ahụ.

N'isi obodo France, ngagharịiwe kachasị ukwuu yiri ka ọ gara n'udo n'oge ehihie. Otu ìgwe ndị ntoroọbịa gwara BBC na ha bụ ndị "na-akwado udo" bụ ndị "na-agbalị ime ka ihe gbanwee, mana ọ dịghị ihe na-agbanwe".

Agbanyeghị, ụfọdụ ndị otu ọzọ mụnyele ọkụ n'okporoama ma gbaa ụgbọala ọkụ, gụnyere n'ebe ndị a ma ama dị n'etiti obodo dịka Place de la République.

A wakporo ụlọahịa opekatampe otu ụlọ nri gbara ọkụ, BBC hụkwara ọgụ ka ọ na-agbasa n'etiti ụfọdụ ndị otu dị iche iche na-eme ngagharịiwe.

A hụrụ ndị uweojii na-ahụ maka ngagharịiwe ka ha na-akwa otu igwe mmadụ n'etiti Paris ma jiri ogwe osisi tie ọtụtụ mmadụ ihe.

Na Lyon, Meyọ Grégory Doucet kwuru na ọkụ a gbara ụlọọrụ njem nlegharịanya obodo ahụ bụ "ọdachi," dịka ọ gwara BFMTV "ọ na-agbawa obi anyị n'ihi na ọ bụ ụlọakụkọ ihe mere eme a ma ama".

N'aka nke ọzọm ndị uweojii obodo kwuru na "ndị mmadụ na-eme ihe ike" gbochiri ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ ịkwụsị ọkụ ahụ n'enweghị nsogbu.

Mgbe ọtụtụ izu nke ngagharịiwe ụmụakwụkwọ na-aga n'ihu na mba France, ka nnukwu ngagharịiwe fesara, nke a na-eme n'ofe mba ahụ n'abalị iri na asaa nke ọnwa Ọktoba, afọ 2026 maka oke ọnụ ahịa ihe ndị e ji ebi ndụ, nke mere n'ọnwa isii tupu ntuliaka onyeisiala amalite.

Ndị ngagharịiwe amụyere ọkụ n'ụlọọrụ na-ahụ maka njem nlegharịanya na Lyon mba France

Ndị uweojii na-agbanyụ ọkụ n'okporoụzọ

Ọkụ agbaala ụlọọrụ na-ahụ maka njem nlegharịanya na Lyon mba France dịka ọtụtụ mmadụ na-eme ngagharịiwe maka ọnọdụ agụmakwụkwọ kpụrụ afọ n'ala nakwa oke ọnụahịa ihe oriri.

A nwụchiri ihe karịrị mmadụ 272 na mba ahụ dịka ngagharịiwe na-aga n'ihu na Paris isiobodo mba France.

Mịnịstrị mba France na-ahụ maka ime obodo katọrọ ngagharịiwe a ma kọwaa ya dịka nkata ndị na-eyi ọha egwu ma kwuo na ụfọdụ ndị ngagharịiwe ahụ nwere ebumnobi izu ohi na ịwakpoo ndị uweojii.

Onye ntaakụkọ BBC kwuru na n'agbanyeghị na ndị na-eme ngaghrịiwe na Paris na-ebute ọgbaaghara, ngagharịiwe n'ebe ndị ọzọ na-aga n'udo.

Ụfọdụ ndị ntoroọbịa gwara BBC na ha bụ ndị na-akpọ oku mgbanwe n'obodo.

Cheta na nke a na-abịa dịka ụmụakwụkwọ mere ngagharịiwe ruru izuụka atọ.

Onyeisiala Emmanuel Macron akpọọla oku udo ma kpọkuo ndị ngagharịiwe ka ha rube isi nye iwu, kwanyere mmadụ ibe ha ugwu ma ghara imetọ maọbụ mebie akụrụngwa dị iche iche.