Kedụ ihe mkpụrụ achị e ji esi ofe na-enye n'ahụ mmadụ?

Mkpụrụ osisi achị e ji esi ofe nke bekee kpọrọ "Brachystegia eurycoma"
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ofe Achi—nke e ji mkpụrụ e gwere egwe sitere na osisi 'Brachystegia eurycoma' n'olu bekee bụ ngwa ofe na-eme ka mmiri ofe rọọ arọ, na-enye ọtụtụ ihe n'ahụ mmadụ nke ndị ọkachamara kwuru na ọ dị oke mkpa maka ahụike mmadụ.

Ọ bụrụ na ị chọrọ isi ofe dị zara zara, ihe ị ga-eweta bụ ngwa ofe dịka azụ ọkpọọ, anụ, ịsam, ose, akwụkwọ ụzịza, ịsha, mmanụ, yabas, nnu na ngwa, ihe eji eme nri ọrọọ arọ ndị mmadụ n'ejikarị ete ya bụ ofe ngwa ngwa bụ achị.

Nchọpụta gosiri na ọ bụrụ n'ofe achị foo chi, naani ihe ị ga-eme bụ itinye ya obere mmiri ma daa ya ọkụ.

Ụtọ ya ga-apụtakwa ọzọ, nke mere na mmadụ nwere ike iri ya mkpụrụ ụbọchị ole na ole were gbochie agụụ.

Mkpụrụ osisi achị nke bekee kpọrọ 'Brachystegia eurycoma' bụ mkpụrụ osisi e ji esi ofe, ọkachasi na mpaghara ọwụwa anyanwụ Nigeria bụ Alaigbo.

Ihe a na-akpọ ofe e ji ya sie bụ ''Ofe achi''.

Mkpụrụ achị n'adị abadaba, dịkwa okirikiri, a na-akwọ ya akwọ tupu e were ya tinye n'ofe ka owee rọọ arọ.

Ibrahim Abdulsalam Bichi bụ onye na-ahụ maka nri n'ahụ mmadụ nke bekee kpọrọ 'Dietician' kwuru na mkpụrụ achị nwere ọtụtụ ihe na-enyere ndụ aka n'ime ya dịka " protein, fats, carbohydrates, vitamins na minerals" ma kwuo na ihe ndị a na-enyere ahụ mmadụ aka ito, sie ike ma na-arụ ọrụ nke ọma.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ okenye na nwata na-eri nri e jiri achi sie ma rachaa aka.

Skip Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a and continue readingLee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a

End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a

Gịnị ka mkpụrụ achị na-enye n'ahụ?

Lee ka Bichi siri gụpụta ọtụtụ ihe achi na-enye n'ahụ mmadụ:

Onye ọkachamara ahụ kwuru na achi na-enyere mmadụ aka ito uto ma na-emezi ahụ mmadụ.

Nke abụọ, o kwuru na achị na-enye ike.

Nke atọ, achị na-enyere nri aka isi ịgbada n'afọ.

Nke anọ, achị na-enyere aka idozi mkpụrụ obi mmadụ.

Nke ise, achi na-enyere aka butuo oke shuga dị n'ahụ mmadụ.

Nke isii, bụ na achị na-eme ka ọkpụkpụ mmadụ sie ike.

Nke asaa, achi na-ayọcha ọbara mmadụ.

Nke asatọ, achị na-eme ka mmadụ ghara ibu ibu nnukwu.

Nke itoolu, mkpụrụ achi na-echekwa ahụ mmadụ.

Ndị ọkachamara gara n'ihu kwuo na ọ dị oke mkpa ka mmadụ sachaa ma chekwaa achi nke ọma tupu mmadụ ere ya.

Abdulslam Bichi dọrọ aka na ntị n'enwere usoro eji asacha achi nke ọma, nwekwaa etu esi echekwaba ya tupu o ruo oge mmadụ nwere ike isi ma rie ya o were nye ihe dị mma n'ahụ mmadụ.