Etu mmadu 20 si merụọ ahụ, ọtụtụ ụlọ gbaa ọkụ dịka okporo gaasị gbara na Rivers state

Ndị mmadụ nọ n'ọsọ oge okporo gaasị gbara n'Eleme
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Okporo gaasịgbara n'obodo Aleto nọ mpaghara ọchịchị ime obodo Eleme na River state. merụọla ihe karịrị mmadụ iri abụọ ahụ,, ebe ọkụ so ya bibiri ọtụtụ ụlọ. ụlọahịa,na ụgbọala ndị a dọwara ebe ebe a na-arụzi ụgbọala.

Ọdachi ahụ dara na mgbede Tọzde n'ihe dịka elekere ise n'akụkụ Old Bori Road bụ ihe a na-enyo na o sitere n'okporo gas nke ụlọọrụ 'Nigeria Gas Company'.

Ka ọ dị ugbua, a kpọgala ọtụtụ ndị merụrụ ahụ n'ụlọọgwụ. M

Otu onye hụrụ ihe merenụ gwara ndi nta akụkọ na okporo gas ahụ nọ na-atapụta gas ruo ihe dị ka izu atọ tupu ọ gbawa.

O boro ebubo na ndị isi obodo agwbuola ụlọọrụ ahụ banyere okporo gas ahụ, mana ọdịghị ihe pụtara ihe ha mere iji gbochie mgbawa ahụ.

O kwuru na ọtụtụ n'ime ndị ihe ahụ metụtara bụ ndị na-agafe agafe na ndị na-azụ ahịa n'akụkụ ahụ.

Ndị na-agba ọsọ ndụ ebeb okporo gaasị gbara n'Eleme, Dị na River state

Onyeisi ndị omeiwu ime obodo Eleme bụ Daniel Chuma kwuru mgbe ọ gara nleta n'ebe he mere na ya edebuola akwụkwọ ozi kpesara ụlọọrụ ahụ gbasara ntapu gaasị ahụ, ma zigara ndị ọrụ kwesịrị ekwesị ozi ka ha tinye aka ngwangwa.

Chuma kwuru na ndi otu dekwara akwụkwọ mkpesa nye 'National Oil Spill Detection and Response Agency (NOSDRA)' na Ministri Gọọmentị Rivers na-ahụ maka gburugburu ebe obibi, na ndị uweojii. Ha rịọrọ ka ụlọọrụ ndị ahụ mee nnyocha gbasara ntapu gas ahụ.

Ọ sịrị: "E nwere ntapu gas n'akụkụ ọzọ nke ọkporo 'Nigeria Gas Company'. Anyị degara ha akwụkwọ ozi, deekwa akwụkwọ mkpesa nye NOSDRA na Ministri Rivers na-ahụ maka gburugburu ebe obibi, tinyekwa ndị uwe ojii ka e nwee ike itinye aka ngwa ngwa.

"Anyị rịọrọ ka ha mee nnyocha ọnụ. Anyị amaghị ihe ha mere tupu ha apụọ. Taa, a kpọrọ anyị ka anyị bịa ebe ọkporo gas ahụ gbawara. Ihe ahụ mebiri ụlọ na ụgbọala, meekwa ka ọtụtụ mmadụ merụọ ahụ. E bugala ndị mmadụ n'ụlọọgwụ."

Chuma gosiri nwute na o nweghị onye nnọchi anya ụlọọrụ ahụ bịarutere ebe ihe merenụ.

O kwuru na ndị obodo ejirila eriri mgbochi gbaa ebe ahụ gburugburu, ma dụọ ndị bi nso ọdụ ka ha ghara ịbịaru ya nso iji gbochie ihe ọghọm ọzọ.