Ntuliaka afọ 2027: Inec ewepụtala aha ndị ga-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa

Ndị na-azọ ọkwa onyeisiala na-ele anya n'ihu igwe osee foto

Ebe foto si, Omoyele Sowore, BBC, Peter Obi, Bola Tinubu and Seyi Makinde/Facebook, Sandy Onor/X

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 7

Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (Inec) ewepụtala aha ndị niile ga-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka afọ 2027.

Odeakwụkwọ ụlọọrụ Inec bụ Rose Oriaran Anthony kwupụtara nke a n'ozi o bipụtara n'ọbaozi Inec.

Dịka ọ dị n'usoro ntuliaka a hazigharịrị ahazigharị, ntuliaka maka ọkwa onyeisiala na ụlọomeiwu etiti ga-adị n'ụbọchị 16 Jenụwarị 2027, ebe a ga-ahazi ntuliaka maka ọkwa gọvanọ na nke ụlọomeiwu steeti dị iche iche n'ụbọchị 6 Febụwarị, 2027.

Iwepụta aha ndị ga-azọ ọkwa onyeisiala gbasoro Iwu Ntuliaka afọ 2026, bụ nke kwupụtara usoro niile a ga-eji hazie ntuliaka ọha.

Dabere n'usoro nke Iwu Ntuliaka afọ 2026, otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla na-ezibataghị aha ndị ga-eji ọkọlọtọ ha zọọ ọkwa ọchịchị agaghị esonye n'ịmaaka ahụ.

O kwupụtara na ọ bụ mmadụ iri na asatọ (18) na-azọ ọkwa onyeisiala nakwa ndị osote ha si n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị iri na asatọ (18) ga-esonye na ntuliaka ahụ a ga-ahazi n'ọnwa Jenụwarị 2027.

Site n'aha ndị e wepụtara, ọ bụ naanị ụmụnwaanyị abụọ ga-azọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2027, ha gụnyere Ada Elizabeth Fredrick Okwori nke otu National Democratic Party (NDP) na Nkem Esther Okereke nke otu National Rescue Movement (NRM).

E nwekwara ụmụnwaanyị anọ ndị na-azọ ọkwa osote onyeisiala, ha si n'otu YPP, LP, DLA na APP.

Ka o sina dị, n'ime mmadụ iri na asatọ (18) na-azọ ọkwa onyeisiala, ọ bụ Atiku Abubakar nke otu African Democratic Congress (ADC) kachasị okenye dịka ọ dị afọ iri asaa na itoolu (79), ebe Bola Tinubu nke otu All Progressives Congress (APC) na-eso ya n'azụ dịka ọ dị afọ iri asaa na anọ (74).

Ọ bụ osote Donald Duke nke otu PRP bụ Rabiu Kabiru kachasị bụrụ okenye n'ime ndị na-azọ ọkwa osote onyeisiala dịka ọ dị afọ iri asatọ (80).

Onye ji ọkọlọtọ Democratic Leadership Alliance (DLA) na-azọ ọkwa onyeisiala bụ Adebisi Moses Olusoji na osote ya bụ Abubakar Nafisat kachasị bụrụ nwata, dịka ha dị afọ iri atọ na ise (35)

Kemgbe otu kansụl na-achị Naịjirịa họpụtara Ọkankụzi Joash Amupitan dịka onyeisi ụlọọrụ Inec n'ọnwa Ọktoba 2025, n'afọ 2027 ka ọ ga-ahazi ntuliaka o zuru ala ọnụ nke mbụ ya.

Aha ndị ga-azọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2027 na ndị osote ha

Action Alliance (AA)

Onye ga-azọ ọkwa: Rufai Adekunle Omo-Aje

Osote ya: Shehu Hussaini

Action Democratic Party (ADP)

Onye ga-azọ ọkwa: Abbas-Bin Aliyu

Osote ya: Ike Chinazam

Action Peoples Party (APP)

Onye ga-azọ ọkwa: Yusuf Kabiru

Osote ya: Ofordile Peace Egobia

African Action Congress (AAC)

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Onye ga-azọ ọkwa: Sowore Omoyele

Osote ya: Magashi Haruna Garba

Oge ha haziri ntuliaka imeụlọ, Omoyele Sowore nwetara mmeri dịka onye ga-eji ọkọlọtọ AAC zọọ ọkwa onyeisiala.

Omoyele Sowore bụ onye ntaakụkọ nakwa onye na-akpọ oku maka ikike nke mmadụ. O sorola zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'oge gara aga.

A nwuchiela ya ma jichiekwa ya ọtụtụ ugboro n'ime afọ ndị gara aga.

Ọ bụ ya bụ onyendu otu a kpọrọ RevolutionNow ma bụrụkwa onye na-ebipụta akwụkwọ akụkọ Sahara Reporters.

Gọọmenti Naịjirịa nwuchiri Sowore n'ụbọchị 2 Ọgọst 2019, ma boo ya ebubo ịgba Naịjirịa mgba okpuru.

Ha mechara tọhapụ ya n'ụbọchị 5 Disemba oge ọ nọchara ihe karịrị ọnwa atọ n'ụlọnga, ma nwuchigharịa ya n'ime ụlọikpe ka ọ gachara ihe na-erughị elekere iri na abụọ.

N'ụbọchị 13 Disemba 2019, Nnukwu Ọkaiwu Naịjirịa na Minista ikpe ziri ezi bụ Abubakar Malami weghaara okwu Sowore site n'aka ụlọọrụ nchekwa Department of State Services (DSS).

Dịka AAC siri kwupụta, ha nwere mmadụ puku iri atọ na anọ, narị ise na iri abụọ na abụọ (34, 522) ndị debanyere aha ha dịka ndị otu.

African Democratic Congress (ADC)

Onye ga-azọ ọkwa: Abubakar Atiku

Osote ya: Amaechi Chibuike Rotimi

Atiku bụ onye ji ọkọlọtọ African Democratic Congress (ADC) na-azọ ọkwa onyeisiala afọ 2027.

Oge ha haziri ntuliaka imeụlọ, Atiku nwetara vootu dị otu nde, narị puku asatọ na iri anọ na isii na narị atọ na iri asaa (1,846,370), aka chịburu Riva Steeti bụ Rotimi Amaechi nwetara vootu dị narị puku ise na anọ na otu narị na iri na asaa (504,117) ebe onye ji ego achụ nta ego bụ Mohammed Hayatu-Deen nwetara vootu dị otu narị puku na iri asaa na asaa na otu narị na iri abụọ (177,120).

O teela aka Atiku malitere igwu ndọrọndọrọ ọchịchị. Ọ nwaala ịbụ onyeisiala ugboro ugboro ma jirikwa ọkọlọtọ pati dị iche iche.

Ọ bụụrụ osote onyeisiala Naịjirịa nakwa onye ji ọkọlọtọ Peoples Democratic Party (PDP) zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2023, bụ mgbe ọ gbara onye nke abụọ.

2027 ga-eme ya ihe dịka ugboro asaa Atiku ga-achọ ịbụ onyeisiala Naịjirịa kemgbe o gosichara mmasị ya n'afọ 1993, n'agbanyeghị na o nwetaghị tiketi pati ya n'oge ahụ.

Onye a ji ego achụ nta ego a mụrụ n'Adamawa Steeti zọrọ ọkwa na ntuliaka afọ 2007, 2011, 2019 nakwa 2023.

APC

Onye ga-azọ ọkwa: Tinubu Bola Ahmed

Osote ya:Shettima Kashim

Bola Tinubu bụ onyeisiala na-achị Naịjirịa ugbua n'okpuru otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC), dịka e kwupụtachara ya dịka onye nwetara mmeri na ntuliaka onyeisiala 2023.

Ọzọkwa, na ntuliaka afọ 2027, APC kwupụtara Tinubu dịka onye meriri ntuliaka imeụlọ ha haziri maka ndị ga-azọ ọkwa onyeisiala.

Tinubu tuuru ugo site n'inweta vootu dị nde iri, narị puku itoolu na iri itoolu na itoolu na otu narị na iri isii na abụọ, ebe onye mara ya aka bụ Stanley Osifo nwetara vootu dị puku iri na isii, narị ise na atọ (16,503).

Bola Ahmed Tinubu bụụrụ aka na-achị Legọs Steeti, nke dị na mpaghara ndịda ọdịda anyanwụ Naịjirịa.

Onye a bụụrụ gọvanọ Lagọs Steeti ugboro abụọ gakwara ozi dịka sịnetọ n'oge agba ọchịchị Naịjirịa nke atọ na-egbughị oge.

Ihe a ga-abụ ugboro abụọ Tinubu na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'oge ntuliaka.

Ọ bụ pati ya nọ n'ọchịchị ugbua, nke mere onye niile ji agba mbọ ịkwatu ha.

Osote ya na ntuliaka afọ 2023 bụ Kashim Shettima, onye bụbu aka na-achị Borno Steeti.

APM

Onye ga-azọ ọkwa: Makinde Oluseyi Abiodun

Osote ya: Musa Lawal Daura

Aka na-achị Ọyọ Steeti bụ Seyi Makinde abụrụla onye ga-eji aha otu Allied Peoples Movement (APM) zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2027.

E kwupụtara nke a n'oge a haziri ntuliaka imeụlọ maka ndị ga-azọ ọkwa onyeisiala nakwa emume e jiri kpughee ya, bụ ebe ndị otu ahụ nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu nọọrọ nye ya nkwado dịka onye ga-azọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2027.

A họpụtara ya dịka aka na-achị Ọyọ Steeti n'ụbọchị 10 Maachị 2019, dịka e mechara họpụtagharịa ya maka afọ anọ ọzọ.

Tupu ọ banye na ndọrọndọrọ ọchịchị, ọ bụụrụ onye ọrụ njinịa nakwa onye ji ego achụ nta ego, dịka ọ rụrụ ọrụ ka Nnukwu Onyeisi Makon Group Nigeria Limited, nke bụ ụlọọrụ nke onwe ya.

Makinde kwuru na ebumnobi ya dịka onyeisiala Naịjirịa bụ idozigharị usoro ọrụ nchekwa, ka steeti ọbụla ghara ịnọ na-enweghị enyemaka n'oge nsogbu.

BP

Onye ga-azọ ọkwa: Adenuga Sunday

Osote ya: Mustapha Usman Turaki

DLA

Onye ga-azọ ọkwa: Adebisi Moses Olusoji

Osote ya: Abubakar Nafisat Usaku

LP

Onye ga-azọ ọkwa: Okereke Sunday Chibuzo

Osote ya: Konto Hajja Bintu

NDP

Onye ga-azọ ọkwa: Okwori Ada Elizabeth Fredrick

Osote ya: Chukwuemeka Uchenna Anthony

NRM

Onye ga-azọ ọkwa: Okereke Nkem Esther

Osote ya: Sulaiman Nasir Muhammed

Nigeria Democratic Congress (NDC)

Onye ga-azọ ọkwa: Obi Peter Gregory

Osote ya: Musa Mohammed Rabiu Kwankwaso

Otu Nigeria Democratic Congress (NDC) kwupụtara Peter Obi dịka onye ga-azọrọ ha ọkwa onyeisiala.

Peter Obi bụbu gọvanọ Anambra Steeti dị na mpaghara ndịda ọwụwa anyanwụ Naịjirịa, ebe o tiri ịgba. O nwere ndị nkwado kwụ chịm na soshal midịa.

Ọ bụbu onye ji aha Labour Party zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2023, ebe osote ya bụ Yusuf Baba-Ahmed bụbu sịnetọ na Kadụna Steeti.

Ihe a ga-abụ ugboro atọ aha Peter Obi ga-eso na ndị ga-azọ ọkwa onyeisiala, dịka ọ bụbu osote Atiku Abubakar nke pati PDP na ntuliaka afọ 2019, bụrụkwa onye zọrọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2023, tinyere nke ugbua.

Obi buru ụzọ banye ADC oge ọ pụrụ na Labour Party tupu o mechaa banye NDC.

Obi kwupụtara onye bụbu gọvanọ Kano Steeti bụ Rabiu Kwankwaso dịka osote ya n'oge pati ha nwere nnukwu ọgbakọ.

Peoples Democratic Party (PDP)

Onye ga-azọ ọkwa: Onor Sandy Ojang

Osote ya: Umaru Babangida

Esemokwu kewara otu Peoples Democratic Party, ebe ngalaba abụọ nke otu ahụ họpụtara ndị ga-azọrọ ha ọkwa onyeisiala.

Ka o sina dị, n'ụbọchị Tuzde 26 Mee 2027, ngalaba PDP nke minista isi obodo bụ Nyesom Wike na-akwado họpụtara Sandy Onor bụbu sịnetọ dịka onye ha jikọtara aka wepụta ka ọ zọọrọ ha ọkwa onyeisiala.

N'emume a haziri n'ụlọọrụ PDP dị n'Abụja, onyeisioche kọmitii nnyocha bụ Samuel Ortom kwuru na Onor bụ onye pụrụiche ha maara na ọ ga-ewetere ha mmeri.

Ngalaba nke ọzọ kwuru na ha nabatara onye bụbu onyeisiala bụ Goodluck Jonathan dịka onye ga-azọrọ ha ọkwa ahụ.

N'ikpeazụ, aha Sandy Onor pụtara dịka onye ga-eji aha PDP zọọ ọkwa onyeisiala n'ọbaozi Inec.

PRP

Onye ga-azọ ọkwa: Duke Donald

Osote ya: Rabiu Kabiru

Onye bụbu gọvanọ Krọs Riva Steeti bụ Donald Duke bụ onye ga-eji aha People's Redemption Party (PRP) zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa.

Ha haziri ntuliaka imeụlọ n'ụbọchị 27 Mee 2026, ebe Onyeisioche pati PRP bụ Hakeem Baba-Ahmed kwupụtara ndị nwetara mmeri.

Duke nwetara vootu puku isii, narị anọ na iri itoolu na itoolu (6,499) iji merie Kingsey Yakubu nwetara vootu puku abụọ, narị isii na iri itoolu na itoolu (2,699).

Social Democratic Party (SDP)

Onye ga-azọ ọkwa: Adebayo Adewole Ebenezer

Osote ya: Bugaje Usman Muhammed

Nwaafọ Naịjirịa na-egwu ndọrọndọrọ ọchịchị ma bụrụkwa Ọkaiwu bụ Adewole Adebayo bụ onye ga-eji aha otu Social Democratic Party (SDP) zọọ ọkwa onyeisiala afọ 2027.

N'ụbọchị 9 Mee ka pati SDP zigaara ụlọọrụ Inec aha ya dịka onye ga-eji ọkọlọtọ ha zọọ ọkwa onyeisiala.

SDP kwuru na Adebayo nwetara mmeri n'oge ha haziri ntuliaka imeụlọ nakwa nnukwu ọgbakọ ha n'ọgbọ egwuruegwu Abubakar Tafawa Balewa Stadium dị na Bauchi.

Young Progressives Party (YPP)

Onye ga-azọ ọkwa: Agada Peter Ada

Osote ya: Key Patience Ndidi

Zenith Labour Party

Onye ga-azọ ọkwa: Nwanyanwu Daniel Daberechukwu

Osote ya: Hassan Khalid