Etu mkpebi ụlọikpe banyere pati dị iche iche ga-esi metụta ntuliaka 2027
Otu okwu a kpụ n'ọnụ na Naịjirịa ugbua bụ na ụlọikpe mkpegharị dị n'Abuja akagbuola mkpebi Ụlọikpe Ukwu Etiti nyere ka ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (INEC) kachapụ aha pati ise n'akwụkwọ pati ndị ga-eso zọọ ọkwa na ntuliaka afọ 2027.
Pati ise ahụ bụ African Democratic Congress (ADC), Action Alliance (AD), Action Peoples Party (APP), Accord nakwa pati Zenith Labour Party (ZLP).
Mkpebi a Ọkaikpe Abba Mohammed nke ụlọikpe mkpegharị dị n'Abuja nyere, kọwara na Ụlọikpe Ukwu Etiti enweghị ikike ịnabata maọbụ kpebi okwu banyere ịkachapụ aha pati ise ndị ahụ.
Ọkaikpe Mohammed gara n'ihu kwuo na ụlọikpe ukwu ahụ emeghị nnyocha zuruoke n'ụfọdụ ihe akaebe e nyere ha ma kwuo na ụfọdụ pati n'ime pati ise a enwetela mmeri na ntuliaka e mere na Naịjirịa n'oge gara.
Cheta na Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja nọrọ n'ụbọchị Mọnde 15 Juun, 2026 nye iwu ka ụlọọrụ Inec kachapụ aha pati ise a n'akwụkwọ ndekọ pati ha.
Nke a mere ka a malite inwe ọtụtụ ọgbaghara banyere ọnọdụ pati ise a dịka ntuliaka 2027 na-akpụdobe nso.
Mana kedụ ka mkpebi ụlọikpe mkpegharị a nyere ga-esi metụta ntuliaka 2027 ọkachasị n'akụkụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchị nakwa ndị nkịtị ga-etụ vootu?
Ọkaiwu Jide Ologun bụ onye maara ihe ekwe na-akụ banyere okwu ndọrọndọrọ gwara BBC Igbo na okwu banyere ụlọikpe itinye ịnabata ma tinye ọnụ n'okwu gbasara pati ndọrọndọrọ ọchịchị bụ ihe ekwesighị ma ncha.
Ọ kọwara na ka ọ dị ugbua, ọ bụrụ na ụlọikpe kachasị na Naịjirịa kagbuo mkpebi ụlọikpe mkpegharị nyere, nke a nwereike ime ka pati ndị ahụ ghara isonye na ntuliaka 2027.
Banyere etu ọ ga-esi metụta ndị nkịtị bekee kpọrọ 'electorates', Ọkaiwu Ologun kwuru na ndị nkịtị anaghị etinye uche ha na pati kama ọ bụ n'onye ndọrọndọrọ ọchịchị ga-eji aha pati zọọ ọkwa.
O kwuru na ọtụtụ n'ime ha na-eche ka ha mara ndị ga-azọ ọkwa iji mara onye ha ga-akwado ebe ụfọdụ ndị kwuru hoo ha na ọtụtụ esemokwu nakwa mkpebi ụlọikpe na-enye banyere pati ga-azọ ọkwa, emeela ka ha ghara inwe ntụkwaisobi na ntuliaka ọbụla na Naịjirịa.
Mana na aka nke ọzọ, ọtụtụ mmadụ na-ebo ebubo na aka pati APC na Onyeisiala Tinubudi n'ọtụtụ ikpe na esemokwu na-ada n'etiti pati chọrọ inwere ọchịchị a kpọrọ opposition na bekee.
Mana Onyeisiala Tinubu apụtala gọnarị ebubo ndị a ma kwuo hoo ha na aka ya maọbụ aka pati ya adịghị n'esemokwu nakwa ikpe pati ndị a na-enwe.
Ọ kọwara na ya anaghị etinye aka n'etu Inec si arụ ọrụ.
Ọ kwuru na Inec bụ ụlọọrụ kwụụrụ onwe ya ma mee ka o doo anya na Inec agaghị adọnyere pati ọbụla ukwu na ntuliaka 2027.



