Ndị uweojii ekwuola na a ga-ekpe onye otu ha gburu onye a na-enyo enyo ikpe maka igbu ọchụ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndị uweojii ekwuola na a ga-ekpe onye uweojii ahụ gbagburu onye a na-enyo enyo n'Effurun Delta Steeti ikpe maka igbu ọchụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Delta Steeti bụ Bright Edafe, kwupụtara nke a n'oge ụlọmgbasaozi Channels Tv na-agba ya ajụjụ ọnụ na Wenezde 29 Eprel, 2026, kwuru na ha nwụchiri onye uweojii ahụ gbagburu otu onye a na-enyo enyo na steeti ahụ.

Edafe kwuru na a kpọgara onye uweojii ahụ, aha ya bụ ASP Nuhu Usman, n'isi ụlọọrụ ndịagha dị n'Abuja ka e nye ya ntaramahụhụ ruuru ya.

N'ozi Edafe wepụtara n'akara X ya, Nuhu Usman gbagburu Mene Ogidi gbara afọ 28 n'ụzọ usoro ọrụ ha megidere.

Bright Edafe kwuru na omume Usman bụ nke a na-amaghị ka a ga-esi kọwaa ya, e wezuga maọbụ ihe sitere na mmụọ, ma kwuokwaa na ọdachi ahụ mere oge Mene gara izigara mmadụ ibu n'ọdọụgbọala.

Mgbe a jụrụ ya ihe mere e jiri kpuchie ihu Usman na foto ya ndị uweojii wepụtara, Edafe kwuru na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị.

Gịnị na-ese okwu n'etiti onye a na-enyo enyo na onye uweojii?

Cheta na ogbugbu Usman gburu Mene Ogidi, kpalitere iwe n'ịntanetị.

Akụkọ kwuru na Mene gara n'ọdọụgbọala dị n'Effurun nke dị n'okporoụzọ Sapele iwere ibu mmadụ zitere ya. Oge o ruru, ha gwara ya tụkwasa ego n'ibu ahụ n'ihi na ọ dịtụ arụ. Ha jụrụ Mene ihe dị n'ime ibu ahụ mana ọ gwara ha na ọ bụghị ya nwe ibu ahụ kama ọ bụ mmadụ zitere ya.

Ha manyere ya ka o mepee ibu ahụ, ma chọpụta na ọ bụ egbe 'Beretta pistol' nakwa mgbọ egbe anọ bụ ihe dị n'ime ya. Ha jichiri ya n'otu ntabianya, mana ọ gwara ha na ọ bụ enyi ya rịọrọ ya ka o nyeere ya aka nweta ibu ahụ.

Akụkọ kwuru na Mene kwara akwa ka e meere ya ebere, ma kwuo na ya dị njikere iduru ha gaa n'ụlọ onye dunyere ya.

Na-ekwughị ekwu, na-akaghị aka, ndịisi ọdọụgbọala ahụ kechiri ya aka na ụkwụ ma mechie ọnụụzọ ọdọụgbọala ahụ iji gbochie ndị otu Mene ịbata. Ha kpọkwara onyeisi ndị uweojii na mpagahara Uvwie bụ Aliyu Shaba ka ọ bịa weghara okwu ahụ ma mee nnyocha miri emi.

A sị na Aliyu Shaba zigara Nuhu Usman a na-etu 'Ogbegbe' ka ọ gaa kpụta nwaokoroọbịa ahụ a na-enyo enyo n'ụlọọrụ ha.

Akụkọ kwuru na oge Nuhu garuru n'ọdọụgbọala ahụ wee hụ egbe ahụ, iwe juru ya obi, dịka isi bukwara ya maka ndị na-ajali ya n'ogige ahụ.

Ọ mịpụtara egbe ya ozugbo wee gbaa Mene n'aka, dịka ndị otu ya bubara Mene n'ime ụgbọala oge ọ ka na-eku ume.

E kwuru na oge ha ruru n'ụlọọrụ ndị uweojii, Usman gbakwara Mene egbe ugboro atọ ma gbagbuo ya.

Dịka akụkọ siri kọọ, Aliyu Shaba nụrụ ụda egbe ahụ ma gbapụta, nye iwu ka a napụ Usman egbe, tụọ ya ịga ma jichie ya na ndị uweojii niile ha na ya so.