You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
A malitela ngagharịiwe na Saụt Afrịka dịka e gburu ndị Naịjirịa abụọ
Otu March and March Movement na-akpọ oku megide ndị si ụzọ megidere iwu abata mba, amalitela ime ngagharịiwe na Pretoria mba Saụt Afrịka.
Ngagharịiwe ahụ na-abịa dịka mwakpo 'xenophobia' e mere megide ndị isiojii mba Afrịka ndị ọzọ na mba Saụt Afrịka.
Ndị ngagharịiwe ahụ ji osisi ma burukwa ọtụtụ akwụkwọ e dere "March and March till we win. Ọ bụrụ na iweghara mba m bụ mwakpo xenophobia, ka m bụrụ onye na-eme mwakpo xenophobia".
Nke bụ eziokwu bụ na amabeghị ihe kpatara ngagharịiwe ahụ, video na-fegharị na soshal midia nke BBC na-amabeghị ebe o si, kwuru na ha na-akpọ oku ka ndị si mba ọzọ bịa Saụt Afrịka hapụrụ ha ala ha iji nye ndị Saụt Afrịka ohere inweta ọrụ.
Ngagharịiwe a na-abịa dịka ndị Naịjirịa abụọ nwụrụ site na mwakpo ndị ahụ.
Onyeisi ndị Naịjirịa bi na Saụt Afrịka bụ Olaniyi Abodedele, gwara BBC na ọ bụ eziokwu na ndị Naịjirịa abụọ ahụ nwụrụ na mwakpo ahụ a wakporo ndị isiojii mba Afrịka ọzọ bi na Saụt Afrịka.
Abodedele kwuru na aha mmadụ abụọ ahụ nwụrụ bụ Kelvin Chidiebere Amaramuiro na Ekpenyong Andrew.
Ọ gara n'ihu kwuo na Andrew nwụrụ n'ụbọchị Sọnde 19 Eprel, 2026 na mpaghara ọdịda anyanwụ Pretoria. Ọ gara n'ihu kwuo na a nwụchiri nwaamadi ahụ mana a gwaghị ya ihe o mere. O kwuru na e tiri ya ihe ruo oge ọ nwụrụ ma hapụ ozu ya n'ụlọọgwụ.
Ọzọkwa, Abodedele kwuru na ozi ya nwetara, kwuru na ndị uweojii na ndịagha wakporo ụlọ Chidiebere Kelvin n'ụbọchị Mọnde 20 Eprel, 2026 ma gwa ya ka o gosi ha akwụkwọ gosiri ụdịrị ọrụ ọ na-arụ.
Ọ gara n'ihu kwuo na ndị ọrụ nchekwa ahụ tiri ya ihe ma kpọchie ya n'ụlọmkpọrọ. Kelvin gara n'ụlọọgwụ n'ụbọchị Wenezde 22 Eprel dịka e nyere ya ntọhapụ beelu ụbọchị ahụ. Mana ọ laghachiri n'ụlọọgwụ n'ụbọchị Fraịde 24 Eprel, 2026 ebe a gwara ya na ọbara na-agba ya n'me ahụ. Nwaamadi ahụ nwụrụ n'ụbọchị Fraịde ahụ.
Ka ọ dị ugbua, Abodedele kwuru na ndị Naịjirịa bi na Saụt Afrịka chị uche n'aka maka mwakpo ndị Saụt Afrịka na-awakpo ndị isiojii si mba Afrịka ndị ọzọ bịa Saụt Afrịka tinyere ngagharịiwe amalitere ime n'ụbọchị Tuzde.
Cheta na Onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa akatọọla mwakpo 'xenophobic' ndị mba Saụt Afrịka na-awakpo ndịisi oji sị mba Afrịka ndị ọzọ nakwa mmebi ụlọazụmahịa na Saụt Afrịka.
Onyeisiala Ramaphosa kwuru nke a n'oge emume ncheta National Freedom Day 2026 nke e mere na Bloemfontein n'ụbọchị Mọnde 27 Eprel, 2026 ma dọọ ndị mba ahụ aka na ntị ka ha ghara iji maka oku ha na-akpọ megide ndị na-esi ụzọ iwu megidere abata Saụt Afrịka malite ịkpọ ndị Afrịka ibe ha asị.
O kwuru na ọ bụ eziokwu na ndị Saụt Afrịka kpọrọ ndị si ụzọ megidere iwu abata Saụt Afrịka asị ma kwuo ka ndị Saụt Afrịka ghara ịmalite ịwakpo ndị Afrịka ndị ọzọ.
Okwu Onyeisiala Ramaphosa na-abịa dịka ọtụtụ ihe onyonyo fesara na soshal midia gosiri ndị otu vijilante na-awakpo ndị ha kwuru na ha si ụzọ megidere iwu bata Saụt Afrịka. Otu ihe onyonyoo ahụ gosiri oge ha na-agba otu nwoke si mba Gana ajụjụ banyere usoro o ji bata Saụt Afrịka.
Cheta na izuụka gara aga, mba Gana kpọrọ onye nnọchiteanya mba Saụt Afrịka na Gana oku banyere ebubo mmegide na mmekpa ahụ ndị Saụt Afrịka na-emekpa ndị mba Gana na Saụt Afrịka.
Minista mba Gana na-ahụ maka mmekọ mba ofesi bụ Samuel Okudzeto Ablakwa na ogbo ya nke mba Saụt Afrịka bụ Ronald Lamola, ekwela nkwa na ha ga-eme nnyocha zuruoke banyere mwakpo ndị ahụ ma tie ezinaụlọ ndị mwakpo ahụ metụtara aka n'obi.
Gọọmenti Naịjirịa kwuru na mịnịstrị Naịjirịa na-ahụ maka mmekọ mba ofesi na mba Saụt Afrịka amalitela inwe mkparịtaụka banyere mwakpo ndị ahụ.
Onyeisioche ụlọọrụ NIDCOM bụ Abike Dabiri kwuru na otu jikọrọ mba dị Afrịka bụ African Union kwesiri itinye ọnụ n'okwu ajọ agwa ahụ a na-akpasa ndị Afrịka isiojii na mba Saụt Afrịka.
Mwakpo 'xenophobia' abụrụla ihe na-eme kemgbe ọtụtụ afọ ma bute ọtụtụ mwakpo dị iche iche n'oge gara aga.