E bu Mmuo Mmili Afulu Anya, ebu bata ụlọikpe

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Díka Gọọmentí Anambara steeti kpụpụrụ Ikechukwu Ezenagu bụ dịbịa a ma ama n'ụlọikpe mbụ ya ụbọchị Wenezde, e si n'ụlọọgwụ ebe a sị ọ na-enwe nleta were bute ya n'ụlọikpe.

Nwaamadi ahụ e ji akwa na-acha ọcha n'elu traụza na-eji oji bụ onye e ji ụgbọala a si ụlọọgwụ kwọta ụlọikpe.

Ndị mmadụ nyere dọnyere ya ukwu ma dubata ya n'ụlọikpe.

Eke-Hit, Onyeeze Jesus na ndị ọzọ awụchiela n'ụlọikpe

Ekene Igboekweze bụ dịbia a ma ama dịka 'Eke Hit', Onyebuchi Okocha a ma dịka 'Onyeeze Jesus' nakwa Igwe Lazarus awụchiela ụlọikpe Ukwu nke Anambara Steeti.

Gọọmentị Anambara steeti na-ekpe ha ikpe maka ebubo ọgwụ ego, ịgwọrọ ndị omekome ọgwụ, ịkpa nkata ntọrị ndị mmadụ nakwa igwu chandum...

Akụkọ ka na-abịa.