You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ dị mkpa - Eprel 21, 2026
Akụkọ dị mkpa - Eprel 21, 2026
Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:
- Gọọmenti Naịjirịa akpụpụla ndị a na-ebo ebubo na ha chọrọ ịkwatu ọchịchị Onyeisiala Bola Tinubu n'ụlọikpe, ma boo ha ebubo iri na atọ.
- N'ime ndị ahụ e boro ebubo gụnyere Ọchịagha Mohammed Gana lara ezumike nka, Kaptịn Erasmus Victor lara ezumike, Ahmed Ibrahim, Zekeri Umoru, Bukar Goni, Abdulkadir Sani nakwa Timipre Sylva bụbu obere Minista hụrụ maka mmanụ agbịdị.
- Ọkaikpe Darius Khobo nke Ụlọikpe Ukwu Kadụna Steeti ekwupụtala izuụka mbụ n'ọnwa Juun dịka mgbe a ga-anụrụ arịrịọ beelụ aka chịburu Kadụna steeti bụ Nasir El-Rufai n'ebubo mmetọ ọkwa ọchịchị ụlọọrụ ICPC boro ya.
- Dịka nkwekọrịta udo mba Amerịka na Ịran ga-akụrụ ọnụ n'ụbọchị Wenezde, Onyeisi Ụlọomeiwu mba Ịran ekwuola na ha na-akwado usoro ha ga-eji tụgharịa ụkwụ egwu n'ọgbọ agha, ma ọ bụrụ na agha ahụ malite ọzọ.
Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.