Popu Leo XIV ga-aka ụka 'Mass' n'Angola dịka njem ya n'Afrịka na-aga n'ihu

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Onyeisi ụka Katọlik n'ụwa niile bụ Popu Leo XIV ga-aka ụka 'mass' dị nsọ n'obodo Kilamba nke mba Angola n'ụbọchị Sọnde 19 Eprel 2026 dịka njem mbụ ya n'Afrịka na-aga n'ihu.

Dịka ụlọmgbasa ozi 'Vatican News' si kwuo, Popu Leo ga-agakwa njem nleta n'ebe a ma ama na mba ahụ dịka 'Shrine of Muxima, ebe ọ ga-edu ndị ụka Katọlik kwere ekwe n'ekpere 'Rosary'.

Na Mọnde, ọ ga-aga Saurimo, ebe ọ ga-eleta ndị agadi ma kaa ụka 'Mass', tupu ọ laghachi Luanda, iji mechie nleta ya n'Angola.

N'ụtụtụ Tuzde, a na-atụ anya na Popu ga-aga Equatorial Guinea bụ ebe ikpeazụ ọ ga-akwụsị njem ndịozi ya nke mbụ n'Afrịka.

Cheta na Popu Leo rutere Angola site n'ọdọụgbọelu mba ụwa nke Luanda tupu elekere atọ nke ehihie n'ụbọchị Satọde 18 Eprel 2026, dịka ọ nọrọ ụbọchị anọ na mba Kameruun.

Chetakwa na ọ bụ Onyeisiala João Manuel Gonçalves Lourenço, tinyere ụmụaka abụọ nyere ya okooko osisi nabatara Popu Leo n'ọdọụgbọelu mba ụwa nke Luanda mgbe o rutere na mba ahụ.

Popu Leo IV: Etu e si nabata ya na mba Kamerunu

Popu Leo XIV erutela Kamerunu maka ụkwụ nke abụọ na njem ya n'Africa, ka ọ gachara mba Ọljirịa.

Ndị nabatara ya n'ọdọụgbọelu Yaoundé Nsimalen International Airport gụnyere Praịm mịnịsta mba Kamerun bụ Josepgh Dion Ngute, Onye ji ọkwa Apostolic Nuncio na Kamerunu na Ekwitorịal, ndịisi ụka dị iche iche nakwa ọtụtụ ndị ụka katọlik ndị ọzọ.

Ka ọ dị ugbua, Popu Leo nọ na-enwe ọgbakọ udo n'ụlọụka Saint-Joseph Cathedrak dị na Bamenda ebe ọtụtụ mmadụ pụtara n'igwe ma nabata ya.

Arcbishọpụ Bamenda bụ Andrew Nkea kwuru na ọbịbịa Popu Leo ga-enye ndị obodo ahụ agha metụtara kemgbe ọtụtụ afọ olileanya.

Nkea kwuru na oge a bụ oge udo nye Bamenda.

Ngwa ngwa o mechara nke, Popu Leo ga-aka ka n'ọdọụgbọelu Bamenda ebe ọ ga-enye oziọma udo.

Popu Leo ga-aga obi ọchịchị mba Kamerun ebe ọ ga-anọ zute Onyeisiala Paul Biya nakwa ndịisi gọọmenti mba Kamerun.

Ọ ga-agakwa ụlọ ndị na-enweghị nne na nna dị n'isiobodo Kamerun, ma zute ndị Bishọpụ ụka Katọlik na mba ahụ.

Modestine Abomo bụ otu onye so n'otu ndị na-agba egwu bịara nabata, Popu Leo, kwuru na obi dị ya ụtọ na Popu Leo bịara njem na mba Kamerun.

O kwuru na ọ na-atụ anya na Popu ga-elebanye na mpaghara obodo ụfọdụ agha metụtara ma gbaa mbọ weta udo na kwụsị ogbugbu a na-egbe ndị mba Kamerun.

Ọ kọwara na ebubmobi ha bụ na ọbịbịa Popu Leo ga-eweta udo na mba Kamerun.

Popu Leo agwala ndịisi ọchịchị mba Kamerun ka ha gee ntị nye olu ụmụnwaanyị, ndị ntorobịa, nakwa na-ekweuchitere ndị ụwa na-atụ n'ọnụ n'ihi na ọ bụ ihe dị mkpa maka ọganihu obodo.

O kwuru na ndị ntorobịa dị oke mkpa n'obodo ma kwuo na akara aka Chukwu nyere ha bụ ihe dị mkpa.

Ọ kpọrọ oku ka gọọmenti tinye anya ma nye ndị ntorobịa iweta ezi agụmakwụkwọ, nye ha ọzụzụ iji hụ na ha etinyeghị aka na mpụ.

Popu Leo kwukwara na olu ụmụnwaanyị dị mkpa n'obodo ma kọwaa na ha nwere ọtụtụ uru ha na-aba nye mmepe obodo.

Cheta na dịka o meriri ntuliaka ọkwa onyeisiala nke ugboro asatọ ya, Onyeisiala Paul Biya kwere nkwa inye ụmụnwaanyị na ndị ntorobịa ohere iso n'ihe a na-eme n'ọchịchị ya.

Popu Leo kwuru okwu megide mpụ, nrụrụaka n'ụdị ọbụla ma kwuo mkpa ịkwanyere ikike ụmụafọ ugwu.