A nwụchiela onye chọrọ ịkpọkasi ụgbọelu si Dubai na-aga Israel

Ebe foto si, AP
A nwụchiela otu ọkwọụgbọelu chọrọ ịsụgbu ọkwọụgbọelu ibe ya ma kpọkasịa ụgbọelu si Dubai na-efega mba Israel.
Praịm Minista mba Israel bụ Benjamin Netanyahu mere ka a mata nke a dịka ọ kọwara ihe mere n'ime ugboelu ahụ.
Ihe ahụ mere n'ụgbọelu 'FlyDubai' si Dubai na-aga Tel Aviv.
Ọ bụ oge ụgbọelu ahụ feniri elu nkeji ole ma ole ka ha were nsogbu ahụ mere e ji tinye ya isi na mba Saudi-Arabia bụ ebe ọ dara.
Otu onye nọ n'ụgbọelu ahụ kwuru na "oke mkpu na-ada tupu ụmụaka nwoke atọ tiba n'ebe ndị ọkwọụgbọelu na-anọ ma jichie onye mwakpo ahụ".
Onye ọzọ nọ n'ụgbọelu ahụ kwuru sị, "Anyị weghara ụgbọelu ahụ n'aka onye ahụ ji mma, dịka ndị ọkwọụgbọelu abụọ fọrọ n'azụ bịara weghara oche ma fetuo ụgbọelu ahụ".
Netanyahu kwuru si na ọkwọụgboelu ahụ aghọọla onye e ji eji dịka ndị ọrụ Saudi Arabia na-agba ya ajụjụ ọnụ.
Ọ gara n'ihu kelee ndị 'odogwu' nyere aka zọpụta ụgbọelu ahụ n'ọnụ ọnwụ; zọọ ọtụtụ ndị mmadụ ndụ ma gbochie nnukwu ọdachi."
Onye nnochiteanya mba Israel kwuru na ọkwọụgbọelu ahụ bụ onye Uinited Arab Emirate."





























