Gịnị mere e ji kwụsịtụ njem ụgbọelu na mba America?

Ebe foto si, Getty Images
Odeakwụkwọ mịnịstrị na-ahụ maka njem na mba America bụ Sean Duffy ewkuola na gọọmenti ewepụla mmachi ha machiri njem ụgbọelu ọbụla n'ụbọchị Fraịde 13 Nọvemba 2026.
Mmachi a nke ruru awa anọ, metụtara njem ụgbọelu ọnụọgụgụ ruru 6,000 dịka ndị ọchịchị kwuru na mmetụta mmachi nwere n'ebe ndị njem bọ nwereike iru ọtụtụ ụbọchị.
Ngwangwa ha nyere iwu a, a machiri njem ụgbọelu ruru 11,000 kwesịrị ibu ndị njem ruru 1.5m n'ọnụọgụgụ.
Duffy kwuru na dịka e wepụrụ mmachi a, ọtụtụ ụlọọrụ ụgbọelu eyigharịala njem ha.
Mana ọ bụ gịnị mere?

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọọrụ na-ahụ maka njem ụgbọelu n'America bụ Federal Aviation Authority (FAA), nyere iwu machiri njem ụgbọelụ ọbụla n'America oge ọ fọdụrụ nkeji isii ka ọ kụọ elekere anọ n'ụbọchị Fraịde ma kwuo na nke bụ maka na igwe mgbasaozi ha ji ahazi njem ụgbọelu nwere nsogbu.
Maka ụgbọelu ndị fepụgoro tupu e nye iwu, e nyere ha ohere ka ha daa ma ziga 157 n'ime ha ebe ọzọ ebe ụgbọelu 670 laghachiri ebe ha si fepụ.
N'agbanyeghị Mmachi, e nyere ụfọdụ ụgbọelu na-eme njemmba ofesi ohere ka ha fepụ n'ihi oke mkpa ha dị.
Mmachi a metụtara ụgbọelu si mba UK dịka a kagburu maọbụ yigharịa ụfọdụ n'ime ha. Nke a na-abịa dịka ụlọọrụ British Airways kwuru na ọ ga-enwe ha ọtụtụ oge tupu njemụgbọelu ha niile amalite ọrụ.
Mmachi a bụ nke kachasị e mere n'America kemgbe mmachi a machiri njem ụgbọelu oge a wakporo ụlọọrụ World Trade Centre na 11 Septemba 2001.
Ndị ọrụ kwuru na ọ bụ maka na igwe mgbasaozi ahụ e ji ahazi njem ụgbọelu amalitela ịka nka kpatara nsogbu ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Foto si n'ọdọ ụgbọelu dị iche iche n'Ameria gosiri ndị na-eme njem a kagburu njem ha dịka ha na-eche iji mara ihe ọzọ ha ga-eme.
N'aka nke ọzọ, ụlọomeiwu mba America akatọọla mmachi a machiri njem ụgbọelu ma kpọọ oku ka e mee nnyocha zuruoke iji chọpụta ebe mmiri si banye opi ụgbọgọrọ.
Sinetọ na-anọchiteanya Nevada bụ Jacky Rosen katọrọ nke ma kwuo na nke a gosiri na ọchịchị Onyeisiala Trump akpụọla afọ n'ala na nke ikpeazụ a.
A kpọkwara oku ka a gbanwee igwe mgbasaozi e ji ahazi njem ụgbọelu ahụ nwere nsogbu. Ndị ọchịchị kwuru na ọ dị mkpa ka e tinye igwe mgbasaozi ọhụrụ ij gbochie ụdịrị ihe a ime ọzọ.
Dịka e wepụrụ mmachi a, ụlọọrụ FAA kwuru na ha mere nnyocha zuruoke n'igwe mgbasaozi ahụ iji hụ na ọ na-arụ ọrụ etu o kwesịrị tupu njem ụgbọelu ọbụla amalite.
Sean Duffy kwuru na ego a ga-eji gbanwee igwe mgbasaozi ahụ bụ $50b ma kpọọ oku ka ụlọomeiwu mba America nye ha ego ahụ ma kwuo na e nwereike inwe ụdịrị mmachi njem ụgbọelu ọzọ n'ọdịnihu ma ọ bụrụ na a gbanweghị igwe mgbasaozi a.




























