Ebubo asambodo adịgboroja bụ nkata ndị iro m kpara - Uche Nnaji

Onye jibu ọkwa minista na-ahụ maka Sayesị na Tekịnuzụ na Nigeria bụ Maazị Uche Nnaji ekwuola gbowam na onweghị asambodo adịgboroja ya rụrụ arụ maọbụ rụọ ọrụ kama na ọ bụ ndị iro ya kpara nkata n'ebo ya ebubo ahụ.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'Enugu na nso nso a, ka kọwara na ya gụchara akwụkwọ ya na mahadum University of Nigeria Nsukka (UNN) wee kwuo na ọtụtụ ndị ọkammụta na mahadum ahụ maara nke bụ eziokwu.
Ọ gara n'ihu gwa ndị chọrọ ịma ma ebubo ahụ abụ eziokwu ihe ha ga-eme.
Dịka o siri kwuo, "Ị chọọ ịma nke bụ eziokwu, banye n'ụlọakwụkwọ Mahadum Nsukka ka ị jụọ ndị ọkammụta, jụọ onye ọbụla"
Maazị Uche Nnaji onye e ji Nwakaibeya mara gara n'ihu kwuo na ọ bụ ndị iro ya na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nyụrụ ihe n'esi.
"Ị hụtụla ebe mahadum kesara ozi banyere mmadụ, nke iwu 'Freedom of Information' machiri ha ikesa".
Ọ kwuru na ya agaghị ekwu ọtụtụ ihe banyere ebubo iji asambodo adịgboroja rụọ ọrụ n'ihi na Ikpe ahụ nọ n'ụlọikpe ugbua.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Gịnị mere e ji kpụpụ Uche Nnaji ụlọikpe?
Cheta na ụlọọrụ ICPC kpụpụrụ Uche Nnaji ụlọikpe maka ebubo nrụrụaka nakwa ịrụ akwụkwọ asambodo adigboroja.
Ọzọkwa, a na-enyocha Nnaji banyere asambodo mahadum ya na asambodo 'National Youth Service Corps' (NYSC) Nnaji jiri nweta nweta ọkwa dịka minista n'afọ 2023.
N'okwu ya na ụlọọrụ n'achụ mpụ na aghụghọ nke a kpọrọ Independent Corrupt Practices and Other Related Offences Commission (ICPC), Uche Nnaji kwuru na odoola oke na ngwere anya na ụlọọrụ ahụ ahụla na ijichi akwụkwọ njem 'passport' ya enweghi isi bụ nke mere ha jiri nyeghachi ya akwụkwọ ikike ahụ.
Chetakwa n'Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abuja nyere iwu ka e nyeghachi Uche Nnaji akwụkwọ njirimara ya ma kwuo na onye bụbu minista na-ahụ maka Sayensị na Tekịnụzụ nwere ikike ịga alabeke iji nweta nlekọta ahụike.
Uche Nnaji na-azọ ọkwa gọvanọ na Pati PDP na ntuliaka 2027.





























