Uche Nnaji: Ihe asatọ merela ya n'okwu asambodo adịgboroja na ebumnobi ya ịchị Enugwu na oge o mere

Uche Nnaji yi akwa ọchana okpu ndị ichie

Ebe foto si, Bayo Onanuga

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abuja enyela Uche Nnaji bụbu Mịnịsta na-ahụ maka Sayesnsị Nka na Ụzụ bụ Uche Nnaji ikike ịga alabekee maka nlekọta ahụike.

Na ntuziaka nke Ọkaikpe nke ụlọikpe ukwu ahụ bụ Jọstịs Joyce Abdumalik nyere Ụbọchị Monde, o kwuru ka e nyeghachi Nnaji akwụkwọ njem ya ma higharịa ikpe ahụ gaa n'abalị 26 nke ọnwa Oktoba,afọ 2026.

Nka na-abịa dịka akụkọ na-ekwu na Nnaji nwere ebunuche ịzọ ọkwa Gọvanọ Enugu steeti.

Cheta na Ụlọọrụ ICPC kpụpụrụ Uche Nnaji ụlọikpe maka ebubo nrụrụaka nakwa ịrụ akwụkwọ asambodo adigboroja.

A na-enyocha Nnaji banyere asambodo mahadum na akwụkwọ NYSC Nnaji jiri nweta nweta ọkwa dịka minista n'afọ 2023.

Nnyocha gbasara akwụkwọ agụmakwụkwọ Nnaji malitere wube n'afọ 2025 mgbe akụkọ gbara na Nnaji ji asambodo adịgboroja nweta ọkwa minista.

Ebubo ọzọ e boro ya bụ na ọ natara ụgwọ ọnwa ruru nde naịra iri abụọ na itoolu na ụma (N29.5m) n'aha iji asambodo adịgboroja nakwa ịtụmgbere ego.

Ihe asatọ merela Nnaji na mgbe o jiri mee

Uche Nnaji

Ebe foto si, Ministry of Science and Technology

  • Ọgọstụ 26, 2026- Tinubu họpụtara Uche Nnaji dịka Minista na-ahụmaka Sayensị na Nka na Ụzụ
  • Juun 2024- E boro ya ebubo ịkpụ asambodo akwụkwọ ngosi na o ji otu afọ fee ala nna ya
  • Ọktoba 2025- E boro ya ebubo iji asambodo adigboroja nke mahadum 'University of nigeria Nsukka'(UNN) dịka ọ bara mahadum ahụ n'afọ 1981 mana ọ gụchaghị . Aha ya adịghị n'akwụkwọ ndị gụchara n'afọ 1985, dịka nnyocha akwụkwọakụkọ,'Premium Times' si gbaa n'ama
  • Ọktoba 7, 2025- Nnaji gbara arụkwaghịm dịka Mịnịsta ma sị na nke "apụghị ' nkwenta na ọ mejọrọ".
  • Novemba 2025: Nnaji gbara UNN nakwa onyeisi mahadum ahụ bụ Ọkammụta Simon Ortuanya akwụkwọ sị ka ha wepụta mpụtara agụmakwụkw ya n'ụlọakwụkwo ahụ(transcript.)
  • Eprel, 2026- Nnaji kwupụtara ebunobi ya ịzọ ọkwa gọvanọ Enugu steeti.
  • Nnaji nwetara ikike ife ọkọlọtọ otu NNPP na ntuliaka gọvanọ Enugwu maka ọkwa gọvanọ
  • Ọktoba 26,2026- Ụbọchi ehigharịrị ikpe ya