University of Nigeria Nsukka: Ihe anyị ma maka akụkọ mwakpo a sị ndị "bandit" mere n’Enugwu

Egwu na ịchị aka n'obi ejidela ụmụakwụkwọ mahadum 'University of Lagos' na ndị nne na nna ha dịka UNN a nọrọ na nnukwu egwu dịka akụkọ na-efegharị na soshal midia ugbua kwuru na ndị ntọrị abatala na mahadum ahụ ịbịa tọrọ ụmụ akwụkwọ.
Ọnụ n’ekwuchitere Ụlọ Akwụkwọ UNN bụ Mazi Inya Agha Egwu wepụtara ozi kwuo na akụkọ na ndị Bandit na ndị ntọrị abatala UNN abụghị eziokwu.
Agha kwuru na ha enyochaala mana ha ahụghị ihe iyi egwu ọbụla gosiri na ndụ ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi nọ na nsogbu.
Na agbanyeghi, ha gara n’ihu dobe ndị uweojii na ndị agha na gburu gburu mahadum UNN.
Kọmishọna Uweojii Enugwu bụ Mammam Bitrus Giwa gbarụrụ ihu kwuo na-akụkọ na ndị ntọrị abatala UNN bụ okpotokpo asị.
Giwa boro ebubo na-ọ bụ ndị ahụ amaghị ndị ha bụ na soshal midia, akpọrọ Anọnymous n’ebugharị akụkọ ụgha ahụ iji tinye egwu n’ime ndị mmadụ.
Giwa kwere nkwa na ha ga-achọpụtarịrị ndị ahụ na-efesa akụkọ ahụ.
Ọzọ dịkwa ka ibe ya mere na Nsukka, ebe ndị a n’enyo enyo na ha bụ ndị otu nzuzo gburu ụmụ okorobịa abụọ na Obodo Nsụka.
Mkpa mkpa ahụ kpara na ụbọchị 7th June 2026 oge ndị omekome wakporo onye nke mbụ oge ọ lọtara n’ụlọ ya n'elekere iri na otu nke abali. Ha wakporo ya gbagbuo ya pii.
Ọzọkwa mere n’akụkụ Timber shed Nsukka ebe onye amakekwu ama ama ji mma sugbuo Nnaemeka Ishiwu, ọ bụrụ onye nke abụọ n’otu ụbọchi ahụ.
Ka ọ dị ugbua, ndị Uweojii ewepụtabeghi ozi gbasara nwoke ama ama na Nsukka asiri na ọ bụ ya mara mma ahụ.
Anyị si na Nsukka town gaa Obukpa bụ obodo dị nso n'Ụlọ akwụkwọ UNN na 10th June 2026 ebe kepu kepu pụtara na ndị Ọchiehi abatala ịtọrọ ụmụakwụkwọ. Nkea butere ọgba aghara, ụmụ akwụkwọ na-ebe akwa na- agbala ụlọ ha ebe ndị nne na nna ji ọsọ akpọrọ ụmụ ha.
Site na Nsukka gaa ụlọ akwụkwọ praimari n'Iwollo, okpruru ọchịchị Ezeagu ọsọ bidoro gbawa na 10th June na ndị Bandit abatala ịtọrọ ụmụaka, ndị nne na nna biara kpọrọ ụmụ ha.
N’ihi otu nchekwa si dị ọjọọ na Nsukka ugbua, onye isioche okpruru ọchịchị ahụ bụ Mazi Jude Asogwa amachiela ndị ọgba tumtum na Keke ịgba n’abalị ma ọ bụ n’isi ụtụtụ. O nyekwara ntuziaka ka keke ọbụla wepụ akwa ojii ma ghara iti egwu ọbụla.
Kọmishọna Uweojii Enugwu bụ Mamman Bitrus Giwa kwuru na enweghị ndị ọchị ehi, Bandit ma ọ bụ ndị ntọrị biara itọrọ ụmụakwụkwọ n' Obukpa ma ọ bụ n'Ezeagu. Okwuru na ha niile bụ asị. Kọmishọna wepụtara ekwentị ka ọhaneze kpọọ ma ha hụ ihe edoghị ha anya.
Kọmishona mgbasaozi nke Enugwu bụ Dọkita Malachy Agba kwuru na-akụkọ ndịa niile bụ asi.
O boro ebubo na ọ bụ ndị ihe ọma na-asa afọ chọrọ ibute ọgba aghara na egwu n’ime ndị mmadụ na gburu gburu Enugwu.
O kwere ndị UNN nakwa ndị Enugwu niile nkwa na gọmenti Peter Mba ji akatamkpo atụmatụ akụrụngwa n’echekwa ndụ na-akụ na ụba n’Enugwu Steeti.
Ndị agha nakwa ndị uweojii nọ ugbua na gburu gburu UNN nakwa Nsukka n’eme nyocha nke “akpọrọ aerial and land surveillance”



