Wike, Okorocha, Adeleke na ndị ọzọ ga-achụrụ Tinubu nta vootu na ntuliaka Onyeisiala 2027

Ndị nọ na foto bụ Gọvanọ Soludo, Gavanọ Adeleke, Okorocha na Wike.
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Nyesom Ezenwo Wike, Rochas Okorocha, Gọvanọ Ademola Adeleke, Gọvanọ Peter Mbah so na ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC) họpụtara dịka ndị ga-achụrụ ha nta vootu n'afọ 2027 na ntuliaka onyeisiala.

APC bipụtara aha ndị ahụ ma kwuo na ha bụ 'PRESIDENTIAL CAMPAIGN COUNCIL, (PCC)' n'olu bekee.

APC mere ka a mata nke a n'ozi ha wepụtara n'ụbọchị Tuzde bụ abalị iri na atọ nke ọnwa Ọktoba 2026.

APC kwuru na ha ga-edu ndị ahụ n'ihu ọrụ n'ụbọchị wenezde bụ abalị iri na anọ nke ọnwa Ọktoba, 2026.

Ndị aha ha dị n'akwụkwọ si na mpaghara Nigeria dị icheiche nakwa otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị ọzọ.

Cheta na Onyeisiala Nigeria bụ Bola Ahmed Tinubu nakwa Osote Onyeisiala bụ Kashim Shettima na-azọ ọkwa onyeisiala nakwa ọkwa osote onyeisiala n'afọ 2027.

Ndị na-anọghị n'APC so na PCC

Ndị nọ na APC Presidential campaign council:

N'ime aha ndị APC wepụtara gunyere Nyesom Ezenwo Nwike bụ Mịnịsta na-ahụ maka Abuja ma bụrụkwa onye nọ n'otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị People Democratic Party.

Onye ọzọ aha ya nọ n'akwụkwọ ahụ gunyere Gọvanọ Osun State bụ Ademola Adeleke nọ n'otu ndọrọ ọchịchị Acord.

Onye ọzọ aha ya banyere n'akwụ ndị ga-achụrụ Onyeisiala Bola Tinubu vootu bụkwa Gọvanọ Anambra state bụ Chukwuma Soludo nọ n'otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị All Progressives Grand Alliance, APGA.

Ndị a ma ama nọ na PCC nakwa ọrụ ha

Kamgbe APC wepụtere aha ndị nọ na Presidential Campaign Copuncil, PCC nke afọ 2027 ọtụtụ ndị mmadụ na-achọ ịma ndị e tinyere aha ha nakwa ọkwa ha na PCC.

Lee aha ndị ahụ nakwa ọkwa e nyere ha:

  • Gọvanọ Chukwuma Soludo – Onye nchikọta n'Anambra state '(state co-ordinator)'.
  • Gọvanọ Peter Ndubuisi Mbah – Onye nchikọta nta vootu na mpaghara ọwụwa anyanwụ (Zonal Campaign Coordinator South east).
  • Gọvanọ Ademola Adeleke - Ọnye nchịkọta n'Osun state '(State co-ordinator)'.
  • Gọvanọ Hope uzodimma _ Odeakwụkwọ ụlọọrụ PCC (Secretariat Secretary).
  • Nweze David Umahi – Osote Onye nchikọta ọrụ, mgbasa ozi na ikpokọta ndị mmadụ '(Deputy Director General Insfructure , Mobilization and Sensitization)'.
  • Nyesom Wike – Onye nchikọta n'Abuja (Coordinator Abuja).
Ụfọdụ ndị aha ha nọ na PCC nke APC

Lee ndị so na 'State campaign council' nke APC

  • Ndị nhazi na state '(state campaign cordinator)'.
  • Ndị ndun otu patị APC na state '(State APC Executive Committee)'
  • Ndị niile chiburu dị ndị omeiwu na state nakwa n'ụlọomeiwu Nigeria nke etiti.
  • Ndị niile rụrụ ọrụ ka mịnịsta na steeti niiile.
  • Ndị niile na-azọ ọkwa ndị nnọchịtaanya n'ụlọ omeiwu state nakwa nke gọọmenti etiti.
  • Ndị niile nọn'ọkwa ma na gọọmenti okpuru ọchcịchị
  • Dgz