Mmanụ diesel bụ 1,900, ọ bụghị mmanụ ụgbọala – Festus Keyamo

Ebe foto si, Festus Keyamo/X
Minista na-ahụ maka njem ụgbọelu bu Festus Keyamo ekwuola na ọ bụghị mmanụ ụgbọala ka a na-ere n'ọnuego otu puku na narị itoolu (1,900).
Keyamo mere ka a mata nke a n'ozi o depụtara n'akara X ya n'ụbọchị Satọde 10 Ọktoba, 2026.
Dịka Keyamo siri kọwaa, ọ bụ mmanụ diesel ka a na-ere n'ọnụego otu puku na narị itoolu (1,900), ọ bụghị mmanụ ụgbọala.
N'ozi ahụ o depụtara n'akara X ya, Keyamo sịrị "ọ bụ ndejọ anyị, mmanụ ụgbọala abụghị 1,900, kama ọ bụ mmanụ diesel."
Cheta na akụkọ fesara n'abalị Fraịde 9 Ọktoba 2026 na a malitela ire mmanụ ụgbọala n'ọnụego 1,900 n'ụfọdụ ọdụmmanụ.
Mana mgbe BBC gara njem nnyocha n'ụfọdụ ọdụmmanụ dị n'Ikoyi na Lagos State, anyị chọpụtara na ha na-ere mmanụ ụgbọala n'ọnụego otu puku, narị atọ na iri asaa (1,370).
NNPC ka na-ere mmanụ ụgbọala n'onụego 1,360

Ọdụmmanụ NNPC ka na-ere mmanụ ụgbọala n'ọnụego otu puku, narị atọ na iri isii (1,360) n'agbanyeghị na gọọmenti etiti ekwuola na ha ewepụla ego n'ọnụahịa mmanụ ụgbọala n'ọdụmmanụ NNPC niile.
BBC chọpụtara nke a oge anyị gara n'ọdụmmanụ NNPC dị n'okporoụzọ Ikoyi na Lagos State n'ụbọchị Satọde 10 Ọktoba, 2026.
N'ụbọchị Tọzde 8 Ọktoba ka Minista na-ahụ maka ego na nchịkọta akụnaụba Naịjirịa bụ Taiwo Oyedele kwuru na gọọmenti etiti ga-ebepụ ego n'ọnụahịa mmanụ ụgbọala ruo ụbọchị iri atọ na-abịa abịa.

Dịka, Oyedele siri kwuo, mbepụ ego ahụ ga-abụ naanị n'ọdụmmanụ NNPC ndị e nwere gburugburu Nigeria, ma bụrụkwa nke ndị ọkwọụgbọala na-ebu ndị njem ga-erite uru na ya karịsịa.
Oyedele kwuru na site n'atụmatụ a, o nweghị ọdụmmanụ NNPC ọbụla ga-ere mmanụ ụgbọala karịa otu puku, narị atọ na iri ise (1,350), dịka ọ sịrị na nke a abụghị ihe omume mbelata ego mmanụ ụgbọala bụ 'subsidy'.
Oge BBC gara n'ọdụmmanụ ndị ọzọ dị na mpaghara Ikoyi, anyị chọpụtara na ụfọdụ n'ime ha na-ere mmanụ ụgbọala n'ọnụego otu puku, narị atọ na iri asaa (1,370).
NNPC petrol price discount: Ihe di n'ime 'onyinye' mmanụ ụgbọala gọọmenti Nigeria na-enye ụmụafọ ya

Ebe foto si, Bayo Onanuga / X
Gọọmenti Nigeria ekwuola na ha ga-ebudata ọnụahịa mmanụ ụgbọala na Nigeria n'ime ụbọchi iri atọ site n'ụlọọrụ ha na-ere mmanụ ụgbọala bụ Nigerian National Petroleum Company (NNPC).
Mịnịsta na-ahụ maka akụnaụba bụ Taiwo Oyedele kwupụtara nke a n'Abuja n'ụbọchị Tọzde 9 Ọktoba 2026 ma sị na ha anaghị eweghachite ego enyemaka mmanụ ụgbọala a kpọrọ 'subsidy' bụ nke ha wepụrụ n'afọ 2023.
Kama o kwuru na gọọmenti ga-enye NNPC ohere ka ha ree mmanụ ụgbọala n'ọnụego ha zụtara ya n'ime ụbọchị iri atọ site n'iwepu uru ha na-erite n'ire mmanụ ụgbọala.
Ha kwuru na ndị ga kachasị rite uru n'atụmatụ ahụ bụ ndị ọrụ njem ụgbọala, na nke a bụ mbọ ọhụrụ gọọmenti na-agba iji belata ahụhụ ndị Nigeria na-ata n'ihi oke ọnụahịa mmanụ ụgbọala nakwa ime njem.
'Ibelata ego mmanụ ụgbọala abụghị iweghachite subsidy'

Ebe foto si, Taiwo Ayodele
- Ministri na-ahụ maka akụnaụba kwuru na kamgbe ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktoba 2026 ka ndị mmadụ malitere izụ mmanụ ụgbọala n'ọnụ ala n'ọdụmmanụ ụlọọrụ NNPC dị iche iche.
- 'Ibelata ego a bụghị iweghachite 'subsidy' - O kwuru na ha kpebiri ka NNPC wepụ ego n'uru o kwesịrị inwete site n'ire mmanụ ụgbọala ma were ego ahụ nye ndị mmadụ ka ha zụọ mmanụ ụgbọala n'ọnụego dị ala.
- 'Ọ bụghị ego ọha ka e ji agwụ ụgwọ mbelata ọnụahịa' – Minista kwuru na ego ha ji akwụ ụgwọ mbelata ọnụego mmanụ ụgbọala esighi n'akpa ego gọọmenti. O kwuru na NNPC na-azụta mmanụ n'aka ụlọọrụ Dangote ma belata ego dị n'uru ha kwesịrị inwete site n'ire mmanụ ụgbọala ahụ.
- O kwuru na NNPC na-arụ ọrụ dịịrị ha nke bụ ime ka mmanụ ụgbọala gazuo ebe niile na Nigeria na-abụghị ilekwasị anya n'inwe nnukwu uru ahịa.
- Ọ gara n'ihu kwuo na mbelata ego ahụ agaghị emetụta uru NNPC na-enwete site n'ire mmanụ ụgbọala maọbụ ego na-abata n'akpaego gọọmenti.
'Gọọmenti chọrọ iji nwayọọ weghachite subsidy'

Ebe foto si, Atiku Abubakar
Ụfọdụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-ama gọọmentị aka katọrọ mbelata ego ahụ, kọwaa ya dịka ihe na-enweghị isi. Ha kwuru na ọ bụ ụzọ gọọmentị chọrọ iji weghachite subsidy.
Atiku Abubakar ji aha pati African Democratic Congress (ADC) azọ ọkwa onyeisiala, juru gọọmenti ihe ga-eme ma ụbọchị 30 ahụ gachaa.
O kwuru na enyemaka ga-adị naanị ụbọchị 30 agaghị edozi nsogbu oke ọnụahịa ihe ndị mmadụ ji ebi ndụ.
N'otu aka ahụ, otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Nigeria Democratic Congress' (NDC) kọwara ya dịka oge na-ezughị iji dozie nsogbu ndị Nigeria na-agabiga.
NDC dọrọ aka na ntị na atụmatụ ahụ nwere ike ime ka igwe mmadụ wujụọ n'ọdụmmanụ NNPC a ga-ahọpụta.
'Mbudata ọnụego mmanụ ụgbọala a agaghị eru n'ime ime obodo'

Ebe foto si, Nnaemeka Onyeka Obiaraeri / Facebook
Otu onye ọkachamara n'ihe gbasara akụnaụba bụ Nnaemeka Obiaraeri, kọwara atụmatụ ahụ dịka ihe na-agaghị amịta mkpụrụ n'ịkwalite ọdịmma na azụmaahịa ụmụafọ Nigeria.
O kwuru na NNPC nwere ihe dịka ụlọọrụ mmanụ ụgbọala 300 na Nigeria niile, nke ọtụtụ n'ime ha nọ na mpaghara obodo mepere emepe.
Nke a nwereike ime ka ndị bi n'ime ime obodo ghara irite uru dị n'atụmatụ ahụ.
N'otu aka ahụ, gọọmenti tụrụ arọ na ha chọrọ ka ọnụego a ga na-ere mmanụ ụgbọala bụrụ otu puku naịra na narị atọ na iri ise (₦1,350) kwa lita.
Ha kwuru na nke a bụ iji belata oke mbugharị ọnụahịa mmanụ ụgbọala ma e nwee gbanwe n'ọnụahịa nke mba ụwa.
Arọ a ha tụrụ kwuru na ndị na-esipụta mmanụ ụgbọala nakwa ndị na-ebubata ya ga-akwụ ego mara ya n'elu ma rie uru ya ma ọ bụrụ na ọnụahịa mbaụwa dị mma.




























