UNGA: Ihe ndị na-akpọtụ dịka Shettima nọ New York

Ebe foto si, Stanley Nkwocha/X
Dịka ọ gara ịnọchite Onyeisiala Bola Tinubu n'ọgbakọ mbaụwa United Nations General Assembly, Osote Onyeisiala Nigeria bụ Kashim Shetima ezutela ụmụafọ Nigeria bi n'America.
Ọ gwara ha maka ọrụ ọchịchị Onyeisiala Tinubu na-arụ ji hụ na Nigeria so n'ihe a na-eme ma nwee agba na mbaụwa.
O kwuru na ọrụ ahụ amịtawala mkpụrụ dịka o gosiri na ego ndokwa (foreign reserves) bụ nke ọ sịrị si ijeri dọla atọ na ụma itoolu (3.9 billion dollars) rịa ruo ijeri dọla iri ise na ise( 55 billion dollars), ọnwa atọ gara aga.

Ebe foto si, Stanley Nkwocha
"Anyị na-arụ ọrụ iiji hazigharịa Naijiria ka ndị na-etinye ego na-akụnaụba nwee akamobi ịlaghachi na Naijiria, agamnihu ụlọọrụ nsika mmanụ 'Dangote Refinery bụ ngosipụta mbọ ahụ."
Akụkọ ka na-abịa...

Ebe foto si, Stanley Nkwocha/X

























