UNGA: Onyeisiala Tinubu ga-alọghachi Nigeria na ngwụcha izu a - Obi ọchịchị

Onyeisiala Nigeria bụ Bola Tinubu

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Onyeisiala Bola Tinubu agbatịkwola ezumike ọrụ ya na mba ofesi dịka e kwuru na ọ ga-alọghachite Nigeria na ngwụcha izu a.

Cheta na Osote onyeisiala bụ Kashim Shettima na-anọchi anya Onyeisiala Tinubu n'ọgbakọ 81st 'United Nations General Assembly' (UNGA) bụ nke na-aga n'ihu ugbu a na New York na mba America.

N'ozi onye ndụmọdụ pụrụiche nke Onyeisiala Tinubu bụ Bayo Onanuga wepụtara n'ụbọchi Mọnde 21 Septemba 2026 ka ọ kọwara na Onyeisiala Tinubu si Nigeria pụọ n'ụbọchị 30 nke onwa Ọgọst ma gaa London na mba United Kingdom, ebe ọ malitere ezumike ọrụ ya.

O kwuru na Onyeisiala nọrọ otu izu na London, tupu ọ gaa Paris na mba France, ebe ya na Onyeisiala Emmanuel Macron na onye ọchụnta ego Vincent Bollore nwere nzukọ.

Onanuga kwuru na n'agbanyeghị na Tinubu nọ na mba ofesi, mana ọ ka na-ahụ maka ihe na-eme na Nigeria ọ na-enye ntụziaka n'ihe gbasara ọchịchị.

O kwuru n'otu n'ime ntụziaka ndị ahụ bụ iwu Tinubu nyere ka e mee nnyocha banyere ọnwụ mmadụ 37 n'aka ndị ọrụ Nigeria Security and Civil Defence Corps (NSCDC) na Minna, Niger Steeti bụ ndị ha jidere maka ebubo igwupụta akụ n'ụzọ iwu na-akwadoghị.

Onanuga katọrọ okwu onye bụbu osote onyeisiala bụ Atiku Abubakar, nakwa nke otu ụlọọrụ nkwado dị na mba United States kwuru banyere Onyeisiala Tinubu agaghị nzukọ UNGA.

Gịnị mere na Tinubu agabeghị ọgbakọ a ugboro atọ?

Bola Tinubu

Ebe foto si, Bola Tinubu/X

Osote Onyeisiala Naịijiria bụ Kassim Shettima edurula ndị ọchịchị gọọmentị Naịjirịa gaa ịnọchite Onyeisiala Bola Tinubu n'ọgbakọ ukwu otu 'United Nations General Assembly'(UNGA) n'a-eme na New York dị n'Amerịka n'izu a.

Afọ a ga-abụ nke atọ ya, anya ahụghị Onyeisiala Tinubu n'ọgbakọ UNGA nke bụ ọgbakọ ndịisiala mba 193 dị n'otu 'United Nations' na-enwe kwa afọ na New York dị n'Amerịka bụ ebe ha na-akpa okwu metụtara mba na mba dịka udo, ikike dịịrị onye nakwa mgbanwe ihu igwe( climate change).

Nke afọ a, Tinubu zigara bụ Shettima bụ onye du ndị nwere agba nagọọmentị gụnyere Gọvanọ Rivas State bụ Simi Fubara na ogbo ya nke Zamfara bụ Dauda Lawal, ụfọdụ ndị Minista na ndị ọzọ gaa.

Kassim Shettima

Ebe foto si, Presidency

Dịka ụlọọrụ Onyeisiala mara ọkwa na Onyeisiala Bola Tinubu nyere Shettima ntuzaka ịnọchite ya n'ọgbakọ, UNGA, ajụjụ ọtụtụ ụmụ Naijiria na-ajụ bụ gịnị mere na Onyeisiala agaghị ije ahụ n'onwe ya? Kedụ ihe mere na Onyeisiala agabeghị ọgbakọ ahụ ugboro atọ emerela ọgbakọ ahụ n'oge ọchịchị ya?

Osote Onyeisiala Kashim Shettima oge ọ wụchiri n'ọdọ ụgbọelu na New York maka ọgbakọ UNGA nke afọ 2026

Ebe foto si, Presidency

Nkọwa foto, Osote Onyeisiala Kashim Shettima oge ọ wụchiri n'ọdọ ụgbọelu na New York maka ọgbakọ UNGA nke afọ 2026

Gịnị mere anya ejighị hụ Tinubu ugboro atọ n'ọgbakọ UNGA?

Onyeisial Bola Tinubu n'ọgbakọ UNGA n'afọ 2023

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisial Bola Tinubu n'ọgbakọ UNGA nke afọ 2023
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Oge mbụ Tinubu gara ọgbakọ UNGA bụ n'ọnwa Septemba afọ 2023.

Ọ gaghị n'afọ 2024, 2025 nakwa 2026 nke mere ọtụtụ ụmụafọ Naijiria jiri kpụru ya n'ọnụ na soshal midia.

Ụfọdụ ha na-ebo ebubo na o metụtara 'egwu' na enweghị ikike ịba Amerịka ma na-arụtụ ka, sị na ọ bụ nwata yụọ ahụrụ, ala achụwa ya ọzọ.

Mana Ụlọọrụ Ọnyeisiala na-ekwu na ihe kpatara ya bụ na onye ụlọ ya na-agba ọkụ anaghị achụ oke.

Onye enyemaka pụrụ Iche nke Onyeisiala n'okwu ihe na-eme na mba ọzọ bụ Ademola Osodi kwuru na o nweghị ihe rijuru afọ ma onyeisiala hapụ ịga ọgbakọ ahụ dịka o nwegara ihe ndị ọzọ ọ na-eme n'ụlọ nakwa na mpaghara dị iche iche n'ụwa.

Osodi gwara ụlọ ntaakụkọ ChannelsTV na mkparịtaụka sị, "Anya Naịjiria dị n'ọtụtụ otu dị na mpaghara ụwa dịka BRICS. Otu 'United Nations' abụghị naanị otu anyị dị na ya."

"Onyeisiala Tinubu tinyere anya na nsogbu dị n'ụlọ dịka akụnaụba, nchekwa nakwa ọgbakọ mba ndị ọzọ dịkwa mkpa."

Kemgbe abalị 10 nke ọnwa Ọgọstụ, afọ 2026,Onyeisiala Tinubu hapụrụ Naịjịrịa gawa ihe Ụlọọrụ Onyeisiala kpọrọ,"ezumike ọrụ'.

N'abalị 13 nke ọnwa Sempeta, Onyeisiala Tinubu na Onyeisiala Emmanuel Macron zutere na Fransị.

Ihe Atiku na ndị mmadụ na-ekwu maka anya ahụghị Tinubu n'UNGA

Onye na-azọ ọkwa Onyeisiala nke afọ 2027 n'aha otu ADC bụ Atiku Abubakar so na ndị na-ajụ ajụjụ banyere ihe mere Tinubu agaghị ọgbakọ UNGA.

N'ozi o wepụtara n'akara ya n'ọbaozi X,Atiku rụtụrụ aka na ọgbakọ UNGA na abụkarị ohere ndịsiala mba ịkpa etu ha ga-esi adọtara ala ha ego na nnwekọrịta akụnaụba kwuru sị, "Tinubu agaghị eme oche Naijiria n'ọgbakọ kachasị n'ụwa agba na-abaghị uru o nwere ike iziga onye ọzọ gaa, mgbe abụla mgbe."