A ga-ekpunye onye ntaakụkọ okpueze dịka Igwe obodo Tooro na mba Uganda

Prince Edward Kijanangoma, onye a họpụtara dịka Eze ọhụrụ nke obodo Tooro na ndị ọzọ
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

A ga-ekpunye Prince Edward Kijanangoma okpueze dịka Eze ndị obodo Tooro dị na mba Uganda.

Ọ bụ n'obieze obodo ahụ a maara dịka 'Karuziika Palace' dị na Portal City ka a ga-anọ hazie emume ahụ n'ụbọchị Tuzde 29 Septemba 2026.

Cheta na a họpụtara Prince Edward Kijanangoma dịka onye a ga-echi Eze obodo Tooro n'isochi ọnwụ onye bụbu Eze ha.

N'ụbọchị Mọnde 28 Septemba 2026 ka Prince Edward mere emume ọdịnaala nọrọla ọtụtụ senchuri, nke gụnyere ịta kọfị, dịka akụkụ emume nke echimechi Eze ọdịnaala.

N'abalị ka ọtụtụ ndị obodo duuru ya pụọ n'obieze 'Rwengoma Palace', ma zọọ njem site na Portal City gawa n'obieze Karuziika Palace.

Ọtụtụ n'ime ndị so ya ji oriọna ọdịnaala e ji achara kpọrọ akpọ mepụta, dịka ha ji ya mee ka ihe dị n'oge ha na-azọ njem.

Ọtụtụ n'ime ndị so ya ji oriọna ọdịnaala e ji achara kpọrọ akpọ mepụta, dịka ha ji ya mee ka ihe dị n'oge ha na-azọ njem.

A haziri agha egwuruegwu n'ọnụụzọ mbata nke obieze ahụ n'etiti ndịagha Prince Edward na ọkparaeze ọzọ mara ya aka.

Dịka ọdịnaala Tooro si dị, agha egwuruegwu ahụ, nke onye a ga-echi Eze meriri, gosipụtara nnyefe ikike n'aka Eze ọhụrụ.

Emume ahụ na-egosipụtakwa iji ụzọ ọdịnaala anabata Eze ọhụrụ.

A tụrụ anya na Eze ọhụrụ ahụ ga-aga ekpere n'ụlọụka n'ụbọchị Tuzde tupu ọ gwa ọhanaeze okwu.

Ọ ga-emecha laghachi n'obieze Karuziika Palace, ebe a ga-anọ chie ya Eze Edward Rukidi Kijanangoma Nyabongo I.

Emume a na-egosipụta iji ụzọ ọdịnaala anabata Eze ọhụrụ.

Cheta na ọnụmara ndị Eze obodo Tooro họpụtara Prince Edward Kijanangoma dịka Eze ọhụrụ ga-anọchi anya Eze Oyo Nyimba Kabamba Iguru bụ onye nwụrụ n'ọnwa Ọgọst 2026, site n'ọrịa kansa.

Prince Edward Kijanangoma bụ onye ntaakụkọ nakwa onye mgbasaozi a ma ama n'ụlọmgbasaozi nke mba Uganda.

Ọ dị afọ iri ise na isii (56) ma bụrụkwa onye ụlọmgbasaozi dị iche iche kpụ n'ọnụ ugbua, ọkachasị dịka nhọpụta ya ka Eze obodo Tooro koro achịcha ma kpalitekwa echiche dị iche iche na mba Uganda niile nakwa na mba ndị ọzọ.

Prince Edward Kijanangoma bụ onye ntaakụkọ nakwa onye mgbasaozi a ma ama n'ụlọmgbasaozi nke mba Uganda.