Ọtụtụ mmadụ anaghị ahụta m dịka nwaanyị maka na agbara m ahụọnụ

- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Mgbe e biputara ya
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
Jennifer Ifedimma Okpala bụ nwaada gbara ahụọnụ ka nwoke, bụ nke a maara dịka 'hirsutism' n'asụsụ Bekee.
Oge ya na BBC nwere mkparịtaụka pụrụiche, ọ kọwara na ọnọdụ a malitere mgbe ọ dị afọ iri na asaa, bụ mgbe ọ nọ na klaazị nke ise n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị.
"Mgbe ahụ ọ pụtara, ọ bụrụ na m na-ele onwe m anya n'enyo, ihe m na-ahụ anaghị amasị m. M na-ajụ chi m ihe mere m jiri bute ihe niile a. O mekwara obi anaghị esi m ike igosipụta onwe m n'ọha. Na-agbanyeghị etu ọbụla m siri chee ya, ọ na-adị m ka onye e tinyere n'ime karama na-anaghị emegharị ahụ," ka nwaada Okpala kọwara.
End of Akụkọ ndị ọzọ gbasara ahụike ụmụnwaanyị
Jennifer Okpala kwuru na 'hirsutism' emeela ka ọtụtụ mmadụ ghara ịhụta ya dịka nwaanyị, n'ihi na ha echeghị na ọ dị etu nwaanyị kwesịrị ịdị.
Oge ọ na-akọwa nke a, nwaada Okpala sịrị: "Mgbe gị na ụmụnwaanyị ibe gị ga na-eme ihe, ndị ọzọ na-agafe n'ụzọ ga na-ahụta gị dịka onye dị iche n'ihe ha chere nwaanyị kwesịrị ịdị ka ya".
"Ọtụtụ oge, ọ bụrụ na m na-aga n'ụzọ, ndị mmadụ a na-ekwu ihe masịrị ha, na-achọ ihe ndị ha ga-eme ka obi jọọ m njọ. Ndị mmadụ na-akọcha m."
Jennifer Okpala kwuru na ya emeela ihe dị iche iche iji gbochie ọnọdụ a, mana o nweghị nke nwere isi.
"Kemgbe m malitere ịhụ ajị a n'ahụ m, o nwebeghị ihe ndị m na-emebeghị, ma nke a sị a ga-aṅụ aṅụ ma nke a asị a ga-agba agba. Emechaala m ha. Mana emechara m ha, ọ dịzie ka ajị ọ pụtara n'ike".
"Emechaala m ya hụzie na ajị na-amụbawanye, m sịzie na ọ baghị uru na m gara n'ihu na-eme ya ma na-ata ndụ m ahụhụ. M hapụzie ajị ndị a ka ha na-apụtara onwe ha, maka na dịka m na-ele ajị a, o nweghị ihe ọ nọchiri, kama ọ bụ na ndị mmadụ anaghị enwe mmasị ịhụ ya."
O nyere ụmụnwaanyị nwere ọnọdụ 'hirsutism' ndụmọdụ ka ha ghara iji maka na ha gbara ajị ọnụ nọrọ n'ime ụlọ maọbụ kpọchigide onwe ha ụzọ, n'ihi na ọ bụrụ na ha apụtaghị n'ọha, o nweghị onye ga-anabata ha.
Gịnị mere ụfọdụ ụmụnwaanyị ji agba ajị ọnụ ka ụmụnwoke, kedụ ka e si agwọ ya?

Ebe foto si, Copilot
Dịka ụlọahụike National Health Service (NHS) siri kọwaa, 'hirsutism' bụ ọnọdụ na-eme ka nwaanyị gbaa ajị ojii n'ihu, olu, obi, afọ, mpaghara ndịda azụ, ike nakwa mpata ya.
NHS kwuru na ihe na-ebutekaarị ọnọdụ a bụ nsogbu ahụike ndị e nwereike ịgwọ agwọ.
Gịnị na-ebute 'hirsutism'?
Otu ihe na-ebutekarị 'hirsutism' bụ mgbanwe n'ogogo 'androgen' (nke bụ homonụ ụmụnwoke). Nke a nwereike ime ma ọ bụrụ na ogogo homonu ndị a mụbawanye maọbụ ya bụrụ na ahụ nwaanyị dị etu a ejighị ike nabata ya.
Ihe ọzọ gbara ọkpụrụkpụ na-ebute 'hirsutism' bụ ọnọdụ 'polyendocrine metabolic ovarian syndrome (PMOS)'. Nke a bụ ọnọdụ na-emetụta akwa nwaanyị, nke nwekwara ike ibute nje 'acne' nakwa nsọ nwaanyị ịpụta aghara aghara.
Mana oge ụfọdụ, o nweghị ihe doro anya na-ebute ya. Ka ọ dị, ụfọdụ ọgwụ e ji agwọ akwụkwụ, ọnọdụ homonu dịka 'Cushing's syndrome' na 'acromegaly' nakwa akpụ ndị na-emetụta ogogo homonu na-ebukwa ọnọdụ a, kama ọ na-ara ahụ tupu o mee.
Etu e si agwọ 'hirsutism'
Dịka ụlọahụike NHS siri kwuo, ọ bụrụ na nwaanyị nwee ọnọdụ 'hirsutism', dọkịta nwereike ịtụ arọ ka:
- o belata ibu – nke a nwereike inye aka chịkwaa ogogo họmonu
- o mee ihe ụfọdụ n'ụlọ iji wepụ maọbụ belata ajị - dịka ịkpụchasị ajị, iji 'wax' wepụ ajị, ịtụpụ ajị maọbụ ite mmanụ ndị e ji ewepụ ajị.
- ọ zụta ụfọdụ mmanụ ndị na-ebelata ogogo ajị ji epupụta n'ihu, a maara dịka 'eflornithine cream'.
- ọ malite ịṅụ ọgwụ e ji egbochi afọ ime ma ọ bụrụ na ọ ka na-ahụ nsọ ya - nke a ga-enye aka ịchịkwa ogogo họmonu.
Mana ọ bụrụ na ihe ndị a enweghị nke rụrụ ọrụ, dọkịta ga-agwa nwaanyị dị etu ahụ mee nnyocha dị iche iche ma gbasokwaa usoro ọgwụgwọ ndị ọzọ. O nwekwara ike nyefee nwaanyị ahụ n'aka ndị ọkachamara.




























