Nwa m rahụrụ ụra teta, anyị ahụ na ọkpụkpụ azụ ya agbagọọla - Nne Dumebi
Nne Dumebi Ifeanyị akọwaala etu ọnọdụ ahụike nwa ya nwaanyị dị afọ iri na anọ si emetụta ezinaụlọ ya.
Jane Ilomuanya bụ onye Ihiala dị n'Anambra Steeti gwara BBC News Igbo na obi malitere iwute ezinaụlọ ya kemgbe ha chọpụtara na nwa ha nwaanyị nwere ọnọdụ ahụike ndịrụ bekee kpọrọ 'scoliosis' siri ike.
Ilomuanya kwupụtara nke a na mkparịtaụka pụrụ iche, kọwara 'Scoliosis' dịka ọnọdụ ahụike ndịrụ nke ọkpụkpụ azụ mmadụ bụ 'spine' n'asụsụ Bekee na-agbagọ agbagọ gaa n'otu akụkụ ahụ onye ahụ.
O kwuru na ọ chọpụtara na otu nwa ya nwaanyị si aga ịje malitere ịgbanwe mgbe ọ gbara afọ iri na abụọ.
O sịrị na ya chere na mbụ na ọ bụ obere ihe ga-agafe agafe mana ọ bụghị.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Tupu otu afọ eruo, Ilomuanya chọpụtara ọtụtụ ihe dị iche banyere etu nwa ya nwaanyị ahụ si aga ije.
N'ihi ọnọdụ ahụ, Oriaku Ilomuanya kpọtụrụ otu enyi ya bụ dọkịta bi n'Amerịka ma kọwaara ya maka ọnọdụ nwa ya nwaanyị ya.
"Mgbe ọ hụrụ nwa m nwaanyị, ọ sịrị na ọ bụ 'scoliosis' ka a na-akpọ ya. Amaghị m ihe ọ pụtara n'oge ahụ," ka o kwuru.
E zigara ezinụlọ ahụ ka ha gaa hụ ndị dọkịta ọkpụkpụ n'ụlọọgwụ Igbobi dị na Legọs, ebe e nyere nwa ha ihe nkwado ọkpụkpụ azụ siri ike a rụrụ iji gbochie ọkpụkpụ azụ ya ịgbagọ karịa otu ọ dị ugbua.
Ilomuanya kwuru, "Naanị mgbe ọ na-asa ahụ ka ọ na-ewepụ ihe nkwado ahụ. Ọ na-eyi ya agụ akwụkwọ, na-eyikwa ya arahụ ụra. Nwa anyi dịka e ji igwe kee ya agbụ."
Ọ gara n'ihu kwuo: "Ọ na-agba anyammiri n'ihi mgbu ihe ahụ na-egbu ya, mana o nweghị etu anyị ga-esi nyere ya aka. Ihe nkwado ahụ na-eme ka ọnya jupụta ya n'ahụ ya niile. Ego a na-emefu na ahụhụ nwa a na-ata na-agbawa anyị obi,"
Ndị ọkachamara gwara BBC News Igbo na ahụike kwuru na ịchọpụta ọnọdụ ahụike 'scoliosis' n'oge adịghị mfe, ọkachasị n'ebe ụmụaka nọ.
Ụfọdụ ihe njirimara ọnọdụ ahụike 'scoliosis' bụ ubu onye ahụ a naghi agha, iguzo n'ụdị gbagọrọ agbagọ, ma ọ bụ ọkpụkpụ azụ ịga n'otu akụkụ.



