Ụlọikpe ga-ekpebi ikpe ụkọchukwu Paul Mackenzie n'ebubo ịmanye ụmụaka ibu ọnụ ruo mgbe ha nwụrụ na mba Kenya

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọikpe mba Kenya ga-ekpebi ikpe banyere ọnwụ ọtụtụ mmadụ nke aka onye ozioma bụ Paul Mackenzie.
Mackenzie na ndị na-eso ụzọ ya mmadụ 29 ka e boro ebubo igbu ụmụaka dị 191.
Otu nzuzo ya ka e boro ebubo na ha manyere ụmụaka n'ike ka ha buo ọnụ nọọ agụ ruo mgbe ha nwụrụ ka nweeike "izute Jesus". Ozi ya kwuru agụmaakwụkwọ na ọgwụ ọgbara ọhụru bụ ihe "ọjọọ".
Mackenzie na mmadụ 29 ndị ọzọ gọrọ na aka ha adịghị n'ebubo igbo ndị mmadụ, ma kwuo ugboro ugboro na ha amanyeghi onye ọbụla ịnwụ n'ike.
Eno Amanya Ngala bụbu onyeisi nchekwa Mackenzie ka e boburu ebubo mana ọ rịọ ụlọikpe ka ọ bụrụ onye akaebe n'ikpe ahụ.
Mackenzie na ndị ndu ndị ọrọ ka e bokwara ebubo ọtụtụ ihe ọzọ gụnyere iyi ndụ egwu, ibute ọgbaghara nakwa igbochi ụmụaka ịgụ akwụkwọ.
Mana nke a ga-abụ nke mbụ ọ ga-ekpe ya ikpe banyere okwu ndị siri ike metụtara igbu mmadụ.
Ndị ọrụ gọọmenti kwuru na a hụrụ ozu mmadụ karịrị 400 n'ili ndị na-emighi emi n'ime ọhịa Shakahola na mba Kenya, ebe Mackenzie na-edu ndị na-eso ụzọ ya na mba ahụ niile.
E kpọtara ụmụnwoke iri na asaa si n'obodo dị nso ka ha gwupụta ozu n'ili ndị ahụ, ma kwụọ ụfọdụ n'ime ha naanị dọla asatọ (£6) n'ụbọchị.
James, otu n'ime ndị gwuru ili ahụ, gwara BBC sị: "Ili ọbụla anyị chọtara nwere opekata mpe ozu mmadụ atọ. Ụfọdụ n'ime ozu ndị ahụ bụ nke ụmụaka dị naanị izu ole na ole.
O kwuru sị: "Anyị chọtara ozu ụmụaka iri na abụọ n'usoro n'ime otu ili. Ili ahụ juru eju, a haziri ozu ndị ahụ dịka uwe a kpakọrọ akpakọ, otu n'elu ibe ya."
Ndị gwuru ili ahụ kọrọ na ụfọdụ ozu ụmụaka ahụ nwere "aka na ụkwụ e ji eriri kee, ma jiri akwa ndina fụchie ahụ ha".

Ebe foto si, Salim Karisa
Ọtụtụ ndị na-eso Mackenzie si mpaghara ndị ọzọ na Kenya, mana ndị obodo Shakahola maara ụfọdụ n'ime ndị nwụrụ anwụ. Nke a bụ n'ihi na ndị otu ahụ na-agakaarị n'ime obodo ahụ ịzụ ihe ndị dị ha mkpa na i nweta mmiri n'Osimiri Galana.
Salim Karisa, onye ọzọ gwuru ili, kwuru, sị: "Mgbe ụfọdụ, anyị na-eji ọgbatumtum ebu ndị mmadụ banye n'ime ọhịa. Ma ha na-eme ihe niile na nzuzo nke ukwuu, nke mere na ọdịghị onye nwere ike ịmata ihe na-eme n'ime ebe ahụ."
Stephen Mwiti, onye dị afọ 48, kọrọ etụ otu ahụ si gbuo ụmụ ya isii niile. O kwuru na mgbe ọ gara n'ụlọ Mackenzie ka ọ jụọ ya ajụjụ, ọ hụrụ ọtụtụ ụmụnwanyị a kpụrụ isi na ọtụtụ ụmụaka gbara pastọ ahụ gburugburu.
Mackenzie machiri ndị otu ya ịchọ mma ihu na imezi ntutu, ma nye ụmụnwanyị iwu ka ha kpụọ isi nkwọchị maọbụ hapụ ịhazi ntutu ha.
Onye bụbu nwunye Mwiti so na ndị otu Mackenzie a na-ebo ebubo.
Mwiti gwara BBC sị: "Ọ bụrụ na m zute Pastọ Mackenzie taa, otu n'ime anyị ga-anwụrịrị."

Ebe foto si, Mohamed Madi / BBC
O kwuru sị: "Ụmụ m isii niile nwụrụ n'ime ọhịa Shakahola. Naanị ozu nwa m nwoke Samuel ka m chọtara ma lie."
Mwiti tụrụ aka na igwe onyonyo ochie dị n'ụlọ ya n'obodo Malindi, nke dị kilomita 70 site na Shakahola, wee kwuo, sị: "Obere ihe a bụ mmalite nhụjuanya m niile."
Ọ bụ site n'igwe onyonyo ahụ ka ozizi Mackenzie si bata n'ụlọ ya.
Pastọ ahụ hiwere Good News International Ministries n'afọ 2003, bụ nke dọtara ọtụtụ puku ndị na-eso ya na mpaghara dị iche iche na Kenya.
Ụlọ ụka ya nwekwara ụlọ ọrụ onyonyo a na-akpọ Times TV, nke na-agbasa ozi ọma ya si na Malindi.
N'ozizi ọgwụgwụ oge ya, ọ kọwara agụmakwụkwọ dịka ihe 'ọjọọ', nlekọta ahụike dịka ihe 'megidere okwukwe', na kaadị njirimara dijitalụ dị ka 'akara ekwensu'.

Ebe foto si, Ken Mungai / BBC
Dan Paul Mackenzie, onye bụ nwa pastọ ahụ, kwuru na ọ na-arụ ọrụ ịse onyonyo n'ụlọ ụka nna ya.
O kwuru, sị: "Ụmụaka na-anọdụ n'azụ, ndị okenye anọdụ n'etiti, onye ọbụla ana-abụ abụ otuto nye Chineke n'ụtụtụ niile."
Pastọ ahụ na-amalite ikwusa ozi ya n'ehihie. Ụfọdụ n'ime ozizi ya gụnyere 'ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ'.
E mechiri nnukwu ụlọ ụka ahụ n'afọ 2019, Mackenzie akwaga n'ime ọhịa Shakahola, ebe ọ manyere ndị otu ya ka ha soro ya.
Peter Shukrani, onye dị afọ 23, kwuru na nne ya kpọọrọ ya gaa biri na Shakahola n'oge ahụ. Ọ malitere ịga n'ụlọ ụka Mackenzie mgbe ọ dị afọ asatọ, ma kọwaa pastọ ahụ dịka "nna ya n'ime mmụọ", na-agbakwụnye na ọ gaghị ekwu okwu ọjọọ banyere ya.
Shukrani kwuru na mgbe ọ nọ n'ime ọhịa, ọ dara ọrịa, ọnọdụ ahụike ya akawanye njọ n'ihi na a machiri ha ịṅụ ọgwụ.
O kwuru sị: "Nne m na-atụfu ọgwụ niile m kwesịrị ịṅụ n'ihi na o kwenyere na naanị Chineke ga-agwọ m."

Ebe foto si, Ken Mungai / BBC
A kọwara ebe obibi ndị otu ahụ dịka ụlọ akịrika gbasasịrị gburugburu n'ime nnukwu ọhịa ahụ.
Shukrani kwuru, sị: "Anyị na-ebi ndụ dị jụụ dịka ndị nkịtị, na-ebu ọnụ ruo ụbọchị ole na ole tupu anyị erie obere nri."
Ka ọ na-eru Maachị 2023, mgbe ndị na-azụ anụ chọtara ozu mbụ, ọtụtụ narị mmadụ anwụọlarị.
Salim Karisa, otu n'ime ndị gwuru ili, kwuru sị: "Anyị na-ebupụ mmadụ n'ọhịa ahụ, mana ike agwụla ha kpamkpam nke na ụfọdụ n'ime ha nwụrụ n'aka anyị."
N'ime ibe akwụkwọ 298 kọwara ebubo e boro Mackenzie n'ikpe a, mmadụ 191 n'ime ndị a na-ebo ya na ndị na-eso ya ebubo igbu bụ ụmụaka.
A matabeghị ọtụtụ n'ime ozu ndị ahụ n'ihi na ha rerekasịrị nke ukwuu.
N'agbanyeghị ahụhụ ndị nwoke, ụmụnwanyị, na ụmụaka ndị na-eso Mackenzie tara tupu ha anwụọ n'ihi agụụ, nakwa ahụhụ ya onwe ya tara, Shukrani ka kwenyere na Mackenzie bụ ezigbo mmadụ nke na-eche banyere ya.
Shukrani kwuru, sị: "Mackenzie amanyeghị onye ọbụla ibu ọnụ. Ndị mmadụ ji aka ha họrọ ime ya n'ihi nkwenkwe ha."
O kwukwara, sị: "A ka m hụrụ ya n'anya, ọ ka bụkwa pastọ m."
N'aka nke ọzọ, Dan Mackenzie kwenyere na a ga-ama nna ya ikpe igbu ọchụ.
Ọ sịrị: "Ọ bụ ya bụ onyeisi. Ọ bụ onye ndị mmadụ na-ele anya ka o duzie ha. Ya mere, ọ bụ onye gburu ọtụtụ mmadụ."


























