Etu ndị ọchịchị Nigeria si zuo ego ma zụọ ọtụtụ ụlọ ruru nde dọla $271 n'America - Nnyocha

Aka mmadụ ji ọtụtụ ego dọla nke mba America

Ebe foto si, NurPhoto via Getty Images

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Nnyocha ọhụrụ ebola ebubo na ọtụtụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị Nigeria zuuru ọtụtụ narị nde dọla n'ego ọha n'ime afọ iri atọ gara aga ma jiri ya zụọ ụlọ na ihe onwunwe dị na mba America.

Nnoycha ahụ nke otu 'Platform to Protect Whistleblowers in Africa' (PPLAAF) na ụlọọrụ 'Anti-Corruption Data Collective' mere, chọpụtara ihe onwunwe ruru 284 dị na mba America —nke ọnụego ya ruru ihe dịka nde dọla 271 (maọbụ ijeri naịra 370) nke mmadụ 61 ndị nọ n'ọkwa ọchịchị gọọmentị Nigeria ugbua na ndị chịburu achị yana ndị ikwu ha, ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ, na ụlọọrụ ndị metụtara ha, nwe.

Nnyocha ahụ gara n'ihu kwuo na e bola mmadụ 39 n'ime ha ebubo n'ihu ọha, bo ha ebubo n'ụlọikpe, ma ọ bụ maa ha ikpe maka nrụrụaka n'oge gara aga.

Ihe ụlọọrụ ahụ kpọrọ nnyocha ahụ n'olu Bekee 'Dirty Deeds' — How Top Nigerian Officials Bought a Piece of America' nke pụtara (Omume rụrụ arụ — Otu ndị isi na-achị Nigeria si zụọ akụkụ America).

E kwuru na enyochara ịzụta ihe onwunwe malite n'afọ 1991ma chọpụta na e nwetara ihe onwunwe ruru 152, nke ruru ihe dịka nde dọla177, nke ndị ọchịchị gọọmenti Nigeria zụtara oge ha nọ n'ọkwa, "bụ kpọmkwem oge ha nwere ohere kachasị ukwuu imetụ akụnaụba nke nke mba aka".

Ka ọ dị ugbua, ụlọmgbasa ozi BBC achọpụtabeghị n'onwe ya ma ebubo ndị a bụ eziokwu dịka ụlọọrụ Nigeria na-alụso nrụrụaka ọgụ, bụ EFCC, azabeghị oku a kpọtụrụ ya maka okwu a.

Mana ụlọọrụ PPLAAF kwuru na ihe dịka pasentị 81nke ụlọ na ihe onwunwe ndị ahụ ka azụrụ n'enweghị ike ikwu ebe doro anya ego ahụ si pụta, dịka mbinye ego ụlọ; bụ nke a kọwara dịka otu n'ime ọtụtụ ihe nwere ike igosi na ọ bụ omume izupụ ego nke bekee kpọrọ 'money laundering'.

Nnyocha ahụ egosighi na e ji ego a zuru ohi zụta ihe onwunwe ndị ahụ niile, gara n'ihu kpọọ oku ka ndị ọchịchị Nigeria na ndị nke mba America nyochaa ebe ego ndị ahụ si bịa.

"N'ọkwa a na-ahụtụbeghị mbụ, nchọpụta ndị a kpughere mmejọ nke ndị ọchịchị gọọmenti n'otu n'otu na e nweghị ezi nhazi nke na-enye ohere ka akụnaụba ọha na eze e zuru ezu gafee okeala ma nọrọ mba ofesi n'enweghị nsogbu" ka Jimmy Kande, onyeisi nchịkwa nke PPLAAF kwuru.

Nnyocha ahụ kọwara na ndị ọchịchị nke ngalaba nchekwa nke Nigeria nwere ọnụọgụgụ kachasị elu ndị nwere ihe onwunwe ndị a.

Cheta na Nigeria na-enwe nsogbu nchekwa dịka e nwere mmụba n'ihe gbasara ntọrọ mmadụ, mwakpo ndị ohi na ndịagha nnupụisi 'jihadist' n'ime afọ iri gara aga.

"Ihe onwunwe ọ bụla e depụtara n'akụkọ a bụ ọrụ ọha na eze a na-arụghị ma ọlị gụnyere ụzọ a na-arụghị, ụlọọgwụ na-enweghị ndị ọrụ, na ụlọakwụkwọ na-enweghị akwụkwọ," ka Olanrewaju Suraju, bụụ onyeisioche nke ụlọọrụ Human and Environmental Development Agenda (HEDA), kwuru.