Etu ọnọdụ dị kemgbe agha tiwapụrụ na Tigray
Otu onye bi na Mekelle dị na Tigray, agwala BBC etu ọnọdụ dị n'ebe ahụ kemgbe agha tiwapụrụ na Tigray n'afọ 2020.
Pitsum kwuru na agha ahụ enweela mmetụta nye ndị obodo ma onye ukwu ma onye nta.
N'okwu ya 'naanị etu anyị si agbasa ozi na Tigray bụ site n'ekwentị. Ndị mmadụ nọ n'ọnọdụ ihe mgbu maka na ihe adịghịrị ha mfe, ọnwa asaa maobụ ọnwa asatọ gara aga adịghị mfe.
Ụlọakụ niile enweghịzi ego. Ihe ndị mmadụ tụkwasịrị obi ha na ya bụ ụzọ mgbasaozi.
Onye ọbụla na-eji ekwentị ha akwụ ụgwọ ihe ọbụla ha zụrụ. Ọ bụrụ na a machie nke a, ọ ga-etinye ndị mmadụ n'oke ihe mgbu maka na enweghị ego n'ekesa. Ọ bụ naanị ụzọ ndị mmadụ ji eme ihe.
Ọ gara n'ihu kwuo ihe dị iche n'ebe ahụ kemgbe agha ahụ tiwapụrụ.
'Ihe dị iche ugbua na oge agha ahụ malitere n'afọ 2020 bụ na ego na-ekesa, ndị mmadụ na-enwetakwa ụgwọ ọnwa oge o kwesiri tupu agha ahụ etiwapụ', ka o kwuru.
Mana ugbua, ọ karịala ọnwa anọ kemgbe ndị ọrụ gọọmenti nwetara ụgwọ ọnwa ha. Mekelle dere juu, ọ bụ n'isiobodo ka ọgụ ahụ na-ada. Enweghị ọgụ maọbụ ụda egbe ọbụla na-ada ebe a. Ọ bụ naanị nsogbu akụnaụba ka anyị na-enwe ebe a.
Mekelle adịghị etu a n'oge gara aga ma ọ kụọ elekere asaa maọbụ elekere asatọ nke mgbede. Ọ na-adị ka e tinyere ọnọdụ onye apụla ezi.



