Oge ịkpeazụ mụ na di m hụrụ - Nwunye Justice Chidiebere Mark

Oge ịkpeazụ mụ na di m hụrụ - Nwunye Justice Chidiebere Mark

Nwunye Justice Chidiebere Mark bụ Theresa Chidiebere Mark gwara BBC Igbo na oge ikpeazụ ya na dị ya hụrụ anya tupu a malite ịchọ ya achọ bụ n'ụbọchị Tuzde abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Eprel, 2026.

Theresa kwuru na di ya bugara ụmụaka ha abụọ n'ụlọakwụkwọ ma buga ya onwe ya n'ụlọụka n'ụbọchị Tuzde ahụ.

Ọ kọwara na di ya gwara ya na ọ na-aga n'ụlọ oriri na nkwarị Johnwood Hotel dị n'Abuja.

Theresa kwuru na ọ kpọrọ di ya n'elekere asatọ nke ụtụtụ iji gwa ya ka ọ zụtara ya ihe n'ụlọ oriri na nkwari ahụ.

Ọ gwara anyị na dị ya kpọrọ oge ọ kụrụ elekere iri na abụọ nke ehihe ụbọchị ahụ mana ọ zaghị oku ekwentị ahụ maka na ọ maghị na ekwentị ya na-akụ.

N'oge adịghị anya, enyi Justice Chidiebere kpọrọ Theresa ma gwa ya na dị ya gwara ya na ọ na-aga ọgbakọ nwereike inwe ọtụtụ oge.

O kwuru na enyi di ya bịara buru ya na ụmụaka ya laa n'ụlọ ha.

Theresa kọwara na ọ kpọrọ akara ekwentị dị ya ọtụtụ ugboro mana oku akara ekwentị ya anaghị aga.

Ọ bụ ka o ruru n'abalị ka Theresa kpọrọ Peter Randy ma jụọ ya ka ha agbasaala ọgbakọ ahụ ha gara mana Peter Randy gwara ya na enweghịkwa ọgbakọ ọbụla ha nwere ụbọchị ahụ.

Theresa Chidiebere Jack gwara anyị na kemgbe Tuzde ahụ, ọ hụbeghi dị ya anya ruo taa.

BBC News Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abuja bụ Josephine Adeh mana ọ gwara anyị ka anyị kpọtụrụ ụlọọrụ ndịagha mana ụlọọrụ ndịagha azaghị oku ekwentị anyị kpọrọ ha.

Justice Chidiebere Mark onye e ji JusticeCrack mara na soshal midia, bụ onye a ma ama na-akpọ oku megide ajọ ọchịchị nakwa mkpagbu ndị Naịjirịa.

Na nso nso a, o wepụtara ọtụtụ vidio ebe ọ nọ na-akatọ ogbugbu ndịagha gburu otu onye kọpa n'Abuja nakwa ụgwọọnwa na nleta gọọmenti na-enye ndịagha Naịjirịa.