You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ụlọikpe Kachasị etinyeghachila pati ADC n'aka David Mark
Ụlọikpe Kachasị dị n'Abuja akagbuola nchabi ikpe nke Ụlọikpe Mkpegharị nyere banyere onye bụ onyeisioche pati African Democratic Congress (ADC).
Nke a na-eso ikpe ụlọikpe mkpegharị nyere na mbido ọnwa Eprel nke kwuru ka ndị niile na-azọ ọkwa onyendu pati ahụ gbaa jụụ nke mere ụlọọrụ Inec jiri wepụ aha Mark n'ọbaozi ha.
Oge Ọkaiwu Maxwell Opara na nkọwa ihe mkpebi a pụtara, ọ sịrị na Ụlọikpe Kachasị ekwuola na dị ka ọ dị ugbua, na David Mark ka bụ onyeisioche pati ADC ruo mgbe a ga-achabi ikpe ha ka nọ n'ụlọikpe.
Cheta na otu onye pati ahụ bụ Nafiu Bala Gombe kpụgara otu ADC, David Mark na INEC n'ụlọikpe, ma kwuo na ọ bụ Onyeisioche nchereoge nke patị ahụ.
Bala gwara ụlọikpe na ya bụ naanị onyendu pati ADC na-agbaghị arụkwaghịm oge ndị ndu ibe ya nyefere David Mark ọchịchị nchereoge.
Cheta na ngalaba ADC nke David Mark nọ n'isi ya haziri nnukwu ọgbakọ ha izuụka abụọ gara aga dịka ha nọọrọ ebe ahụ chụpụ Nafiu Bala Gombe n'otu ahụ, tinyekwara ndị ha na ya na-arụkọ.
Ọ bụ eziokwu na ikpe a Ụlọikpe Kachasị nyere etighachila ọchịchị n'aka David Mark, mana okwu a ka na-aga n'ihu nỤlọikpe Ukwu.