NDLEA ekposaala ogige na-arụpụta mkpụrụmmiri n'Enugu, nwuchie mmadụ abụọ
Ụlọọrụ na-ebu agha megide ịnụ na ire ọgwụike na Nigeria bụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) kwuru na ha ekposaala ebe ndị Mexico na Nigeria na-arụpụta mkpụrụmmiri n'Eziama Obeagu dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Awgu n'Enugu Steeti.
Ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ NDLEA bụ Femi Babafemi kpughere nke a n'ozi o wepụtara n'ụbọchị Tọzde 24 Septemba 2026.
Ozi ahụ kwuru na ndị ọrụ NDLEA nwuchiri nwoko dị afọ iri anọ na ise a na-etu 'Brown' na onye maara dịka George, bụ ndị a na-ebo ebubo na ọ bụ ha na-ahụ maka ogige ahụ.
NDLEA boro ebubo na ndị ahụ a na-enyo enyo rụrụ ọrụ n'ogige ahụ na njikọaka ha na, onye ha kọwara dịka onye a ma ama na-ebu ọgwụike na Mexico ma birikwa na Mexico City.
Ka ọ dị, a kpụpụrụ mmadụ abụọ ahụ n'ihu Ọkaikpe Mabel Taiye Segun-Bello nke Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Enugu, ma boo ha ebubo ise gbakwasịrị ụkwụ n'ịkpa nkata ọjọọ, ihiwe, ịlekọta na iji ego na-akwado otu na-atụ mgbere ọgwụike, nakwa iji ụzọ iwu na-akwadoghị nweta kemikal e ji arụpụta mkpụrụmmiri.
Ha kwuru na aka ha dị ọcha n'ebubo ndị ahụ, dịka Ọkaikpe Segun-Bello tinyere ikpe ha n'ụbọchị 21 Ọktoba 2026, n'isochi akwụkwọ NDLEA tinyere ka a gbapụ ikpe ahụ ọsọ.
NDLEA kwuru na mmadụ atọ ndị ọzọ a kpọrọ aha n'okwu ahụ ka bụ ndị a na-achọ achọ ugbua.
Ozi ahụ sịrị na nnyocha ngalaba NDLEA pụrụiche merela kpughere ihe ha kọwara dịka "ọrụ tara akpụ" dị n'etiti ndị a na-enyo enyo si mba Nigeria nakwa mba Mexico.
"Nnyocha anyị mere n'agbata Disemba 1 na 4, 2025 chọpụtara na Brown mere njem gaa Lagos, Enugu na Anambra Steeti tupu o duru ndị ọrụ ya gaa na mbaraezi ya dị n'Obeagu," ka ozi ahụ kwuru.

Ebe foto si, NDLEA
NDLEA kwuru na ha chọpụtara ogige nwereike ịrụpụta methamphetamine n'ogogo e nwereike ire ire.
Ha gbakwunyere na akụrụngwa dị n'ogige ahụ bụ ụdịrị nke ha kposara n'Ogun, Oyo nakwa Ebonyi Steeti na nso nso a.
Ozi ahụ sịrị: "nchọcha anyị mere na mbaraezi ahụ mere ka anyị chọpụta ọtụtụ kemikal gụnyere methylamine dị lita 690, isopropyl alcohol dị lita 1,000, hydrochloric acid dị lita 300, toluene na acetone dị lita 290, sodium hydroxide 400, N-phenylacetamide dị kilogram 125, lead acetate dị kilogram 414, tartaric acid dị kilogram 769.6 kilogram nakwa ọgwụike ndị ọzọ."
Ụlọorụ ahụ kwuru na mgbe ha gara nchọcha n'ezinaụlọ George, ha chọtara nnukwu ite mmanụ ụgbọala asatọ, nnukwu usekwu gaasị anọ, dehydrator anọ na ephedrine dị kilogram 11.
Oge ọ na-ekwu okwu gbasara nke a, Onyeisi NDLEA bụ Buba Marwa kwughachiri na ndị ọrụ ya ga-achọtarịrị mmadụ niile a na-enyo enyo na aka ha dị n'ogige mkpụrụmmiri ahụ, ma hụkwa na ha natara ntaramaahụhụ dịịrị ha dịka ọ dị n'iwu Nigeria.

Ebe foto si, NDLEA





























