Mgbanwe ọhụrụ gọọmenti webatara na NYSC
Gịnị bụ ihe a na-akwụ ebe niile gbasara ihe omume ndị ntoroọbịa ji otu afọ efe ala nna ha bụ NYSC na mkpirisi Bekee?
Ihe anyị ma gbasara ya bụ na otu kansụl na-achị Naịjirịa nyere ntuziaka ka Nnukwu Ọkaiwu Naịjirịa na Mịnịstrị na-ahụ maka ndị ntoroọbịa megharịa iwu na usoro niile nke e jiri hiwe ihe omume ahụ ka o nweeike daba n'atụmatụ ndị ha kwadoro na nso nso a, iji nweeike tinye ya n'ọrụ na-egbughị oge.
Ha kwuru na ebumnobi mmegharị a bụ iji mee ka ihe omume NYSC bụrụ nke na-akwalite ọrụaka, mmepụta ihe na nkwalite ndị ntotọbịa.
Kedụkwanụ ihe bụ atụmatụ ọhụrụ ndị a gọọmenti kwadoro maka NYSC?
Nke mbụ na Onyeisi ihe omume NYSC agaghị abụzi onyeagha, kama ọ ga-abụ mmadụ nkịtị, mana ndịagha ga-anọkwa inye ndị ntoroọbịa na-efe ala nna ha ezi nchekwa.
Nke abụọ abụrụ na ihe ọzụzụ ndị ntoroọbịa ji otu afọ efe ala nna ha agaghị abụzi izuụka anọ, kama ọ ga-abụ izuụka isii ugbua.
- Izuụka nke mbụ na nke abụọ ga-abụ maka ịtọ ntọala gbasara okenaọrụ dịịrị ndị ntoroọbịa dịka ụmụamaala.
- Izuụka nke nke atọ na nke anọ ga-abụ maka ịhọrọ ọrụaka nke onye chọrọ, inweta amamihe gbasara usoro ngụkọ, ịhazi ọrụ na azụmaahịa nakwa usoro e si enweta nkwado ego.
- Izuụka nke ise na nke isii ga-abụzi maka inye ndị ntoroọbịa ọzụzụ dabere n'ọrụaka ha họọrọ nakwa ihe ha gụrụ na mahadum.
Nke atọ bụ na a ga-ekepụta otu ọrụ dị iche iche maka ọzụzụ ndị ntoroọbịa ahụ. Otu ọrụ ndị ahụ gụnyere: otu ọrụ ugbo, otu ọrụ ahụike, otu mmụta, otu nkanụụzụ na ihe ọgbara ọhụrụ, otu iwu, otu ọrụ obodo, otu akụrụngwa e ji enyere ndụ aka, otu ndị na-ekepụta ihe ọhụrụ, otu ndị na-emepụta ihe, otu ndị nchekwa na otu 'green corps'.
Nke anọ, a gaghị enwezi emume ịzọ njem ahịrị na ngwụcha NYSC a kpọrọ 'passing out parade', kama, a ga-eji emume 'graduation' dochie anya ya.
Cheta na e kepụtara ihe omume NYSC site na nkwupụta 'decree no. 24' Ọchịagha Yakubu Gowon mere n'ụbọchị 22 Mee 1973 na mbọ ya ịhazigharị, dozie esemokwu ma rụzigharịa Naịjirịa oge a lụchara agha ime.
Ebumnobi e jiri hiwe ihe omume a n'oge ahụ bụ iji weta mmekọrịta n'etiti ndị ntoroọbịa Naịjirịa iji kwalite ịdịnootu.



