Ndị gọvanọ ha ga-eji ndị uweojii steeti mee ihe masịrị ha?

Aha onyonyo, Ndị gọvanọ ha ga-eji ndị uweojii steeti mee ihe masịrị ha?
Ndị gọvanọ ha ga-eji ndị uweojii steeti mee ihe masịrị ha?
Mgbe e biputara ya

Ọ bụ na ndị gọvanọ agaghị eji ndị uweojii steeti mee ihe masịrị ha? Nke a bụ ajụjụ ọtụtụ mmadụ kpụ n'ọnụ kemgbe Ụlọomeiwu Naịjirịa kwadoro ka e hiwe ndị uweojii steeti. Mana otu onye omeiwu enyela ọsịsa maka ajụjụ a.

Oge ya na ndị ntaakụkọ na-enwe mkparịtaụka, Osote onye na-ahụ maka ime ihe n'ụzọ ziri ezi n'Ụlọomeiwu Sịnetị bụ Onyekachi Nwaebonyi kọwara na ndị uweojii steeti ga-ahụ maka itinye iwu ndị e mere n'Ụlọomeiwu Steeti n'ọrụ ebe ndị uweojii etiti ga-elekwasa anya n'iwu ndị e mere n'Ụlọomeiwu Etiti.

O kwuru na ọ bụ eziokwu na ndị gọvanọ ka ọ dị n'aka ịhọpụta Kọmịshọna ndị uweojii na steeti ha dị iche iche, mana ha ga-ebu ụzọ nata nkwado nke otu kansul na-ahụ maka ndị uweojii bụ National Police Council n'asụsụ Bekee. Ọ sịrị na nke a bụ iji gbochie mmetọ na nrụrụaka n'ụdị ọbụla.

Ugbua lee ụfọdụ ihe ndị i kwesịrị ịma gbasara iwu nakwa usoro ọrụ ndị uweojii steeti

  • Kọmịshọna ndị uweojii steeti enweghị ikike ịrụ ọrụ akpụobi sitere na ntuziaka gọvanọ na-ebughị ụzọ mee ka otu kansul na-ahụ maka ndị uweojii mara maka ya.
  • Iwu machiri ndị uweojii steeti iji ikike ha gwuo ndọrọndọrọ ọchịchị maọbụ mee ihe masịrị ha.
  • Ọ bụ Ụlọomeiwu Etiti nwere ikike iwepụta ogogo e ji ewere ndị mmadụ n'ọrụ.
  • Ndị uweojii etiti nwereike zọbata ụkwụ ma ọ bụrụ na e metọọ ikike nke mmadụ n'ụzọ dị ezigbo njọ site na nkwado onyeisiala.

Kedụkwanụ ihe bụ ọrụ ndị uweojii steeti?

  • Itinye iwu steeti ha nọ na ya n'ọrụ.
  • Ịhụ na e nwere nchekwa na ime ihe n'ezi usoro.
  • Igbochi na ịchọpụta mpụ na steeti ha dị iche iche.
  • Ichekwa ndụ na ngwongwo ndị mmadụ.
  • Ọrụ nchekwa ndị ọzọ n'ime obodo dị iche iche.