Ihe mere ụlọikpe jiri kagbuo ndebanyeaha NDC dịka pati na Naịjirịa

Aha onyonyo, Ihe mere ụlọikpe jiri kagbuo ndebanyeaha NDC dịka pati na Naịjirịa
Ihe mere ụlọikpe jiri kagbuo ndebanyeaha NDC dịka pati na Naịjirịa
Mgbe e biputara ya

Ụlọikpe Ukwu Etiti dị na Kogi Steeti ekwuola na ya akagbuola ikike o nyere ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa bụ INEC iji debanye aha pati Nigeria Democratic Congress (NDC).

N'ụbọchị Fraịde 26 Juun 2026 ka ụlọikpe ahụ nabatara arịrịọ nke otu Peace Movement Party (PMP), dịka Ọkaikpe Isah Dashen kwuru na nchabi ikpe ụlọikpe nyere n'oge gara aga adabaghị n'iwu, n'ihi na e nyere ya na-ebughị ụzọ nụrụ ihe ndị ọzọ aka ha n'okwu ahụ nwere ikwu.

Ọ bụ n'ihi ya ka o jiri nye iwu ka okwu ahụ laghachi n'ọnọdụ ya tupu nchabi ikpe e nyere n'ọnwa Disemba 2025, ruo mgbe e lebaara ya anya nke ọma.

Mana ọ bụ gịnị na-ese?

Peace Movement Party (PMP) kwuru na INEC jụrụ idebanye aha ha dịka otu ndọrọndọrọ ọchịchị n'afọ 2015 n'ihi na njirimara ha bụ mkpịsịaka abụọ na-egosi mmeri, mana NDC gara were otu njirimara ahụ debanye aha nke ha n'ụlọọrụ INEC. Ọ bụ nke a mere ha jiri kpụpụ NDC n'ụlọikpe ma rịọ ka a kagbuo aha ha.

Na nzaghachi, NDC kwuru na ọ tụrụ ha n'anya na ụlọikpe nabatara arịrịọ otu Peace Movement Party, bụ ndị aha ha na-anọghị n'akwụkwọ INEC, naanị maka na ha kwuru na anabataghị ha mgbe ha chọburu iji njirimara "mkpịsịaka abụọ na-egosi mmeri" debanye aha ha dịka otu ndọrọndọrọ ọchịchị n'afọ 2015.

NDC kwuru na ha agwala ndị Ọkaiwu ha ka ha wegaa okwu a n'Ụlọikpe Mkpegharị na-egbughị oge, ma katọọ mbọ ha sị ụfọdụ mmadụ na-agba igwepịa ndị na-agba gọọmenti ụkwụ.

Cheta na ọ bụ n'ụbọchị 29 Mee 2026 ka pati NDC haziri nnukwu ọgbakọ ha, bụ ebe ha nọọrọ nabata aka chịburu Anambra Steeti bụ Peter Obi dịka onye ga-azọrọ ha ọkwa onyeisiala Naịjirịa.