Gọvanọ Biodun Oyebanji emeriela ntuliaka ọkwa gọvanọ Ekiti Steeti

Foto Gọvanọ Oyebanji

Ebe foto si, Biodun Oyebanji/X

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) ekwuola na Gọvanọ Biodun Oyebanji eturula ugo na ntuliaka ọkwa gọvanọ Ekiti steeti e mere na steeti ahụ n'ụbọchị Satọde 20 Juun, 2026.

Onye rụrụ ọrụ dịka onye ndekọ mpụtara ntuliaka ahụ bụ Adenike Oladiji, kwuru na Gọvanọ Oyebanji nke pati All Progressives Congress (APC), ji vootu 319,224 merie na ntuliaka ahụ e mere n'okpuru ọchịchị iri na isii nke steeti ahụ.

Oluwole Oluyede nke pati Peoples Democratic Party (PDP), Oluwole Oluyede, ritere vootu 40,543 ebe Dare Bejide nke pati African Democratic Congress (ADC) nwetere naanị vootu 12,872.

Ntuliaka gọvanọ Ekiti Steeti amalitela n'etiti nchekwa siri ike

Ndị kwụ n'ahịrị ịtụ vootu n'Ekiti Steeti

Ntuliaka ịhọpụta gọvanọ Ekiti Steeti amalitela n'ụtụtụ Satọde 20 Juun 2026 dịka ndị ọrụ INEC bidoro ọrụ n'oge a tụrụ anya ya.

Ndị bi na steeti ahụ sooro iwu gọọmenti nyere gbasara igbochi njem, dịka ọtụtụ okporoụzọ dara jụụ.

INEC kwuru na mmadụ ruru otu nde na ụma (1.05m) debanyere aha ịtụ vootu n'Ekiti Steeti, nke karịrị ọnụọgụ ndị debanyere aha n'oge ntuliaka afọ 2022.

Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị iri na anọ na-asọmpi na ntuliaka a, gụnyere gọvanọ nọ n'oche bụ Biodun Oyebanji.

BBC hụrụ na ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ jupụtara n'okporoụzọ nakwa n'ebe a na-atụ vootu, iji hụ na e nwere udo dịka ntuliaka ahụ na-aga n'ihu. Ndị ọrụ EFCC nọkwa n'ebe ahụ iji gbochie ndị chọrọ iji ego zụọ vootu.

Ndị ọrụ nchekwa gụnyere ndị uweojii na EFCC na-elegharị anya dịka a na-atụ vootu n'Ekiti Steeti

Mgbe ọ tụchara vootu ya, onye ndọrọndọrọ ọchịchị na-azọ gọvanọ n'okpuru pati PDP bụ Wole Oluyede, kwuru na ụfọdụ ndị uweojii na-enye ndị otu ya nsogbu, ma na-egbochi ndị mmadụ ịbata n'ebe ha kwesịrị ịtụ vootu. Ọ sịrị na ọnụọgụ ndị uweojii e zigara na mpaghara ya karịrị akarị.

N'aka nke ọzọ, gọvanọ steeti ahụ bụ Biodun Oyebanji, onye tụkwara vootu ya, kpọrọ ndị bi na steeti ahụ ọkụ ka ha nwee ndidi ma soro usoro ntuliaka ahụ etu INEC si hazie ya.

Oyebanji, onye na-azọ ọkwa n'okpuru otu All Progressives Congress (APC), kwuru na ntuliaka ahụ na-aga nke ọma.

O kwupụtara afọ ojuju ya n'ọnụọgụ ndị na-apụta ịtụ vootu.