Naịjirịa akpụpụla mmadụ 400 ụlọikpe maka ebubo iyi ọhaegwu

Chetakwa na ọ bụ kemgbe ọtụtụ afọ, ka Naịjirịa na-enwe ọtụtụ mwakpo nakwa nsogbu nchekwa. Ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa anwụọla na mwakpo ndị a, ebe ọtụtụ ụlọ, ụgbọala lara n'iyi.

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

A ga-akpụpụ mmadụ narị anọ (400) a na-enyo enyo na ha bụ ndị na-eyi ọha egwu n'Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja, isiobodo Naịjirịa n'ụbọchị Mọnde 15 Juun, 2026.

Nke a bụ otu n'ime ọtụtụ mbọ gọọmenti Naịjirịa megide ajọ ọnọdụ nchekwa ma inweta udo, ezi nchekwa na igbochi ọgbaaghara dị n'ụdị ọbụla.

Cheta na a kpụpụkwara mmadụ narị ise (500) n'ụlọikpe n'ọnwa Eprel 2026 maka ebubo iyi ọha egwu na Naịjirịa. Ọ bụ mmadụ narị atọ na iri astọ na isii (386) ka a mara ikpe n'ime ndị ahụ.

Ndị a a na-akpụpụ ụlọikpe n'ụbọchị Mọnde bụ ndị e boro ebubo dị iche iche gụnyere nrụrụaka ego, ịkwado ndị na-eyi ọha egwu, inye ndị otu na-eyi ọha egwu Boko Haram nakwa otu ndị ọzọ nri nakwa ọtụtụ ebubo ndị ọzọ.

A na-ekwu na ikpe ha ga-enwe ọtụtụ ụbọchị ebe akụkọ kwuru na ụlọikpe pụrụiche kwụrụ chịm ilebanye anya n'ikpe e kwesịrị ịma ha.

Chetakwa na ọ bụ kemgbe ọtụtụ afọ, ka Naịjirịa na-enwe ọtụtụ mwakpo nakwa nsogbu nchekwa. Ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa anwụọla na mwakpo ndị a, ebe ọtụtụ ụlọ, ụgbọala lara n'iyi.

Mwakpo ndị a na-emekarị na mpaghara ugwu Naịjirịa, achụpụla ọtụtụ mmadụ n'ụlọ ha nakwa n'obodo ha.

Ndị a na-eyi ọha egwu amalitela iwere ọnọdụ na mpaghara ndịda Naịjirịa dịka ndị ojiegbe dị iche iche na-atọrọ ndị mmadụ iji napụ ezinaụlọ ha ego mgbapụta bekee kpọrọ 'ransom'.

Ọ bụ ụlọakwụkwọ nakwa ime obodo ka ndị ojiegbe a na-awakpokarị.