Gịnị bụ 'Rainbow Coalition' na-esere ndị gọvanọ APC na Nyesom Wike?

Aha onyonyo, Gịnị bụ 'Rainbow Coalition' na-esere Nyesom Wike na Hope Uzodimma?
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Esemokwu na-arị ugbua n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị bụ All Progressives Congress (APC) dịka ndị gọvanọ nọ n'otu ahụ na-apịasu Minista na-ahụ maka isi obodo Nigeria bụ Nyesom Wike n'ihi otu ọ na-achịkọta a kpọrọ 'Rainbow Coalition'.

Nke a mere ndị gọvanọ APC jiri nwee nzukọ ma wepụta ozi iji kwuo na aka ha adịghị n'otu 'Rainbow Coalition' maọbụ otu njikọ ọbụla nke pati ha na-amaghị maka ya.

Onyeisioche otu jikọtara ndị gọvanọ APC nakwa onye bụ gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodimma gụpụtara nkwekọrịta ha nwere na nzukọ ahụ n'ụbọchị 14 Septemba 2026.

Uzodimma kwuru na 'Rainbow Coalition' nwereike megherie ndị mmadụ anya n'oge ntuliaka ma kụsasịa ikike otu ha inwete mmeri na ntuliaka na-abịa n'afọ 2027.

Mana ọtụtụ ndị Nigeria na-achọ ịma ihe bụ 'Rainbow Coalition'. Ụfọdụ na-ajụ ma ọ bụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọhụrụ nakwa ihe bụ ebumnobi ha.

Rainbow Coalition bụ atụmatụ Nyesom Wike bụ Minista na-ahụ maka isi obodo Nigeria ugbua nakwa onye bụbu gọvanọ Riva steeti hiwere.

Wike bụ onye otu ndọrọndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP) mana ọ na-aga ozi n'okpuru ọchịchị All Progressives Congress (APC) nke Onyeisiala Bola Tinubu nọ n'isi ya.

Cheta na Wike kwadoro Tinubu megide pati nke ya n'oge ntuliaka afọ 2023, bụkwa oge Atiku Abubakar meriri Wike na ntuliaka imeụlọ maka ịzọ ọkwa onyeisiala.

Oge ahụ, Wike gbara isi akwara na ọ bụ oge ndị si mpaghara ndịda Nigeria ịhọpụta onyeisiala ọhụrụ, ya mere, kama ịkwado Atiku Abubakar, onye si mpaghara ugwu Nigeria, Wike kwadoro otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọzọ.

Site na nkwado Wike, Tinubu nwetara mmeri na River steeti, n'agbanyeghị na PDP meriri ntuliaka ndị ọzọ gụnyere sịnetị, ụlọomeiwu nnọchiteanya nakwa ụlọomeiwu nke steeti ahụ.

Oge e mechara ntuliaka, Tinubu kwụrụ Wike ụgwọ ọrụ site n'inye ya ọkwa minista, n'agbanyeghị na o kpebiri na ya ga-aga n'ihu nọrọ na pati PDP.

Dịka ntuliaka afọ 2027 na-abịa nso, ọ fọrọ ntakịrị ka PDP kụọ afọ n'ala n'ihi nsogbu dị iche iche ha na-enwe n'ime onwe ha, mana Wike ka na-akwado Tinubu maka ọchịchị nke ugboro abụọ.

Ka ọ dị, Wike kwuru na ebumnobi ya maka otu 'Rainbow Coalition' bụ iji kpọkọta ndị ndọrọndọrọ ọchịchị si na pati dị iche iche ka ha kwado Tinubu maka ọkwa onyeisiala, ma gakwaa n'ihu na-achọ ebumnobi ha na pati ha dị iche iche.

Wike kwuru na ebumnobi gbara ọkpụrụkpụ o jiri hiwe 'Rainbow Coalition' bụ iji hụ na Tinubu nwetara mmeri maka ọchịchị nke ugboro abụọ ya, mana ọ pụtaghị na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị agaghị echekwa mmasị ha na ntuliaka ndị nke ọzọ.

O gosiri ọmụmatụ site na steeti ndị dịka Anambra, Osun na Abịa, ebe ndị gọvanọ ha nọ na pati ọzọ, mana ha ekwupụtala n'ihu ọha na ha ga-akwado Tinubu maka ọkwa onyeisiala.

"Lee Soludo, Adeleke na Otti, ọ pụtara na pati ha agaghị ahọpụta ndị ga-azọrọ ha ọkwa onyeisiala? Ihe a ha (ndị gọvanọ APC) na-ekwu enweghị isi," ka Wike kwuru oge a na-agba ya ajụjụ n'ihe omume tivii.

Ndị gọvanọ APC ajụla njikọ ọbụla

Minista na-ahụ isi obodo Abuja bụ Nyesom Wike na gọvanọ na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma

Ebe foto si, Nyesom Wike, Hope Uzodimma/X

Ndị gọvanọ APC nakwa ndị otu ha ọkwa ha dị elu ekwuola na ha achọghị otu njikọ ọbụla, ma kwuo na ọ bụ naanị ndị si n'otu ha ka ha ga-akwado maka ọkwa ọchịchị niile.

Ha nyere mkpesa sị na otu a bụ 'Rainbow Coalition' nwereike ibelata ọnụọgụ ndị otu ha n'ụlọomeiwu etiti, ebe o nwekwara ike metụta ọnụọgụ dị ukwuu ha nwere ugbua n'ụlọomeiwu.

Oge ndị gọvanọ APC nwechara nzukọ n'ụbọchị 14 Septemba, onyeisioche ha bụ Hope Uzodimma kwuru na ha anaghị akwado otu njikọ ọbụla nwereike "ịgbajisi APC ụkwụ na aka maọbụ metụta onye otu ha ọbụla na-azọ ọkwa n'ụzọ dị njọ n'ogogo niile".

Ọzọkwa, onye bụbu ọnụ na-ekwuchitere Tinubu na mpaghara ọwụwa anyanwụ bụ Denge Onoh gwara ndị ntaakụkọ n'Abụja sị: "Wike na-ehiwe alaeze ndọrọndọrọ ọchịchị nke onwe ya n'ihu APC, dịka ọ chọro iji ntuliaka afọ 2027 napụ APC ikike ha nwere n'ụlọomeiwu nakwa steeti dị iche iche."

Onoh gara n'ihu kwuuo na ọ bụrụ na ndị si n'otu 'Rainbow Coalition' a mee nke ọma na ntuliaka nke onwe ha ma nweta oche zuru oke n'ụlọomeiwu, ha nwereike hiwe otu nke onwe ha, dịkwa ka ha nwereike imetụta maọbụ nwee mkpebi gbasara okwu ndị dị oke mkpa, nke gụnyere ndị ga-eketa ọkwa dị elu, ịnabata atụmatụ mkpata na mmefu ego maọbụ inyocha ndị a ga-ahọpụta n'ọkwa.

Kedụ ihe na-eme n'etiti Wike na Uzodimma?

Ọ bụ eziokwu na Hope Uzodimma akpọghị aha Nyesom Wike maọbụ otu 'Rainbow Coalition' n'ozi ahụ ọ gụpụtara, Wike n'onwe ya gwara ndị ntaakụkọ na Uzodimma bụ onye kachasị na-agba ụkwụ megide atụmatụ njikọ ahụ.

Wike boro ebubo na Uzodimma na-achọ ọdịmma nke onwe ya, nke bụ ịzọ ọkwa Onyeisi Ụlọomeiwu Sịnetị n'afọ 2027.

Uzodimma ka bụ gọvanọ Imo steeti. Oge ọchịchị ya ga-akụrụ ọnụ n'ọnwa Jenụwarị 2028, mana o nwetala mmerị iji aha APC zọọ ọkwa sịnetọ maka mpaghara Imo West (Orlu).

O dobeghị anya etu ọ ga-esi mee ya maka na iwu Nigeria akwadoghị ka otu onye jide ọkwa ọchịchị abụo n'otu mgbe, mana ndị ọkachamara kwuru na Uzodimma nwereike gbaa arụkwaghịm ma nyefee ọchịchị n'aka osote ya ma ọ bụrụ na ya nweta mmeri maka ọkwa sịnetị.

Wike gwara ndị ntaakụkọ oge ha na-agba ya ajụjụ n'ụbọchị Mọnde sị, Uzodimma na-atụ ụjọ na ọ bụrụ na ndị otu 'Rainbow Coalition' zọọ ọkwa ma merie, ha agaghị akwado ya ịbụ Onyeisi Ụlọomeiwu Sịnetị.

"Oge ọchịchị nwoke a ga-agwụ n'ọnwa Jenụwarị 2028. Ugbua, ọ chọrọ ịhapụ ọkwa ya zọọ ọkwa onye sịnetọ. Enweghị m ike ịkwado omume dịka Hope Uzodimma ịbụ Onyeisi Ụlọomeiwu Sịnetị Naịjirịa," ka Wike kwuru.

Gọvanọ Uzodimma azaghachibeghị ihe a Wike kwuru.